Nations Bible

Apocalipse 19

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.

Otuto dịrị Onyenwe anyị

1Mgbe ihe ndị a gasịrị, anụrụ m ụzụ nke ọtụtụ igwe mmadụ nʼeluigwe. Ha niile na-eti mkpu na-asị,

“Haleluya!

Nzọpụta, na ebube na ike niile dịrị Chineke anyị.

2Nʼihi na ikpe ikpe ya niile ziri ezi, bụrụkwa eziokwu.

Ọ kpeela nwanyị ahụ na-akwa iko ikpe,

onye ji ịkwa iko ya merụọ ụwa.

Ọ bọọlara ọbọ ọbara ndị ohu ya nʼisi ya.”

3Ọzọkwa, ha tiri mkpu,

“Haleluya!

Anwụrụ ọkụ si nʼime ya na-arịgo elu ruo mgbe ebighị ebi.”

4Mgbe ahụ, iri ndị okenye abụọ na anọ ahụ, ha na anụ anọ ahụ dị ndụ dara nʼala nʼihu Chineke onye nọkwasịrị nʼelu ocheeze ukwu ahụ, fee ya ofufe na-asị,

“Amen, Haleluya!”

5Otu olu sitekwara nʼocheeze ahụ na-asị,

“Toonu Chineke anyị,

unu ndị ohu ya niile,

ndị ukwu na ndị nta,

unu ndị na-atụ egwu ya.”

6Mgbe ahụ, anụkwara m olu dara ka olu igwe mmadụ dịkwa ka ụzụ mmiri na-ekwo ekwo, dịkwa ka ụda egbe eluigwe dasiri ike na-asị,

“Haleluya!

Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile na-achị.

7Ka anyị ṅụrịanụ ọṅụ, ka obi tọkwaa anyị ụtọ.

Ka anyị nye ya otuto.

Nʼihi na ọlụlụ di na nwunye nke Nwa Atụrụ ahụ eruola,

nwunye ya edoziekwala onwe ya.

8E nyela ya ezi akwa ọcha nke na-enweghị ntụpọ ọbụla,

na nke dị nnọọ ezi ọcha ka o yikwasị onwe ya.”

(Ezi akwa ọcha ahụ nọchiri anya ọrụ ezi omume nke ndị nsọ rụrụ.)

9Mmụọ ozi ahụ gwara m sị, “Dee nke a: Ngọzị dịrị ndị ahụ a kpọrọ ka ha bịa soro nʼoriri ọlụlụ nwunye Nwa Atụrụ ahụ.” Ọ gwakwara m sị, “Nʼeziokwu, ndị a bụ okwu nke Chineke.”

10Adara m nʼala nʼụkwụ ya ịkpọ isiala nye ya, ma ọ gwara m sị, “O kwesighị ka ị kpọọ isiala nye m nʼihi na abụ m naanị onyeozi ibe gị, na dịka ọtụtụ ụmụnna gị ndị na-agba ama banyere Jisọs. Ọ bụ naanị Chineke ka i kwesiri ịkpọ isiala nye. Nʼihi na ọ bụ Mmụọ nke amụma na-agba ama ihe banyere Jisọs.”

Onye nọkwasịrị nʼelu ịnyịnya ọcha

11Mgbe ahụ kwa, elere m anya hụ ka eluigwe meghere. Ahụkwara m otu ịnyịnya dị ọcha. Onye nọkwasịrị nʼelu ya bụ onye a na-akpọ Onye kwesiri ntụkwasị obi na Onye eziokwu. Ọ bụ onye na-ekpe ikpe nʼụzọ ziri ezi na-ebukwa agha. 12Anya ya na-acha dịka ire ọkụ. Ọtụtụ okpueze dịkwa ya nʼisi. Otu aha nke naanị ya maara omimi ya ka e dekwasịrị ya nʼegedege ihu. 13E gbokwasịrị ya uwe mwụda e denyere nʼọbara. Aha a na-akpọ ya bụ Okwu Chineke. 14Usuu ndị agha nke eluigwe, ndị yi uwe ezi akwa ọcha, na-enweghị ntụpọ, nọ nʼelu ịnyịnya ọcha na-eso ya. 15Ọ kpụ mma agha dị nkọ nʼọnụ ya, nke o ji egbutu mba niile. “Ọ ga-eji mkpara igwe achị ha.” Ọ na-azọchakwa mkpụrụ vaịnị nʼebe ịnara mmanya nke iwe ọkụ nke Chineke Onye pụrụ ime ihe niile. 16Otu aha ka e dere nʼelu uwe ya na nʼelu apata ya:

Eze kachasị ndị eze niile, na Onyenwe kachasị ndị nwenụ niile.

17Mgbe ahụ, ahụrụ m otu mmụọ ozi ka o guzo nʼime anyanwụ na-eti mkpu nʼoke olu, na-akpọku ụmụ nnụnụ niile na-efe nʼetiti mbara eluigwe, “Bịanụ! Zukọọnụ maka oke oriri nke Chineke. 18Bịanụ soro rie anụ ahụ ndị eze, na ndị ọchịagha, na ndịisi agha. Sorokwanụ rie anụ ahụ ịnyịnya na anụ ahụ ndị nọkwasịrị nʼelu ha. Riekwanụ anụ ahụ ndị mmadụ, ndị ukwu na ndị nta, ndị ohu na ndị nweere onwe ha.”

19Mgbe ahụ, ahụrụ m anụ ọhịa ọjọọ ahụ ya na ndị eze niile dị nʼụwa, na ndị agha ha, ka ha zukọtara ibu agha megide onye ahụ nọkwasịrị nʼelu ịnyịnya ahụ na ndị agha ya. 20Ma e jidere anụ ọhịa ahụ, ya na onye amụma ụgha ahụ onye nke nọọrọ nʼihu ya gosi ihe ịrịbama nke o jiri duhie ndị niile natara akara nke anụ ọhịa ahụ, ya na ndị kpọọrọ ihe oyiyi ya isiala. A tụnyere anụ ọhịa ahụ na onye amụma ụgha ya na ndụ nʼime ọdọ ọkụ e ji nkume na-enwu ọkụ kwanye. 21Ndị agha ha fọdụrụnụ ka e jikwa mma agha dị nkọ, nke dị nʼọnụ onye ahụ nọ nʼelu ịnyịnya ọcha ahụ gbuo. Ụmụ anụ ufe niile nke eluigwe rikwara ozu ha.

Você sabia?

O aleluia do céu e as bodas do Cordeiro

  • Este capítulo registra quatro vezes o grito “Aleluia”. Ouve-se um som como o de uma grande multidão no céu, que louva a Deus porque os seus juízos são verdadeiros e justos: ele julgou a grande prostituta que corrompeu a terra com a sua imoralidade e vingou o sangue dos seus servos, derramado pela mão dela. Os vinte e quatro anciãos e os quatro seres viventes se prostram e adoram a Deus, que está sentado no trono, dizendo “Amém, Aleluia”, e uma voz vinda do trono chama a louvá-lo todos os que o servem e o temem, pequenos e grandes.Fontes: o próprio texto bíblico
  • A multidão anuncia que chegaram as bodas do Cordeiro e que a sua noiva já se preparou. Ela recebe vestes de linho fino, resplandecente e puro, e o próprio texto explica que esse linho fino são os atos justos dos santos. Um anjo manda que João escreva que são bem-aventurados os convidados à ceia das bodas do Cordeiro e declara que essas são as verdadeiras palavras de Deus.Fontes: o próprio texto bíblico
  • João cai aos pés do anjo para adorá-lo, mas o anjo não permite. Diz que é conservo de João e dos irmãos de João que se apoiam no testemunho de Jesus, e ordena que adore a Deus, pois o testemunho de Jesus é o espírito da profecia. Em seguida o céu se abre, e João vê um cavaleiro num cavalo branco, chamado Fiel e Verdadeiro, cujo nome é a Palavra de Deus; da sua boca sai uma espada afiada, e no manto e na coxa está escrito Rei dos reis e Senhor dos senhores.Fontes: o próprio texto bíblico

Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.

Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Fale com a gente

Conte de onde você lê, como a Bíblia tem te ajudado ou o que podemos melhorar. Lemos todas as mensagens.