Nations Bible

Apocalipse 20

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.

Puku afọ ahụ

1Mgbe ahụ kwa, ahụrụ m otu mmụọ ozi ka o si nʼeluigwe na-arịdata, o ji mkpisi igodo e ji atụghe olulu Abis ahụ. O jikwa eriri igwe dị ukwuu nʼaka ya. 2O jidere agwọ ochie ahụ, bụ agwọ ochie ahụ, onye bụ Ekwensu na Setan, kee ya agbụ otu puku afọ. 3Emesịa, a tụnyere ya nʼime olulu Abis ahụ, tụchie ụzọ ya. Ọ kakwara akara nʼelu ya ka agwọ ochie ahụ hapụ inwekwa ike iduhie mba niile dị nʼụwa ọzọ tutu ruo mgbe puku afọ gasịrị. Mgbe afọ ndị a zuru, a ga-atọghepụ ya ka ọ gagharịa nwantịntị oge.

Mbilite nʼọnwụ nke mbụ

4Mgbe ahụ, ahụkwara m ocheeze, hụkwa ndị nọ nʼelu ya. Ha bụ ndị e nyere ike ikpe ikpe. Ahụkwara m mkpụrụobi ndị ahụ e bepụrụ isi nʼihi na ha gbaara Jisọs akaebe, kwusakwa okwu Chineke. Ha akpọbeghị isiala nye anụ ọhịa ahụ maọbụ ihe oyiyi ya. Ha enweghị akara anụ ọhịa ahụ nʼegedege ihu ha, maọbụ nʼaka ha. Ha dịkwa ndụ ọzọ, sorokwa Kraịst chịa otu puku afọ. 5Nke a bụ mbilite nʼọnwụ nke mbụ. Ndị fọdụrụ nʼetiti ndị nwụrụ anwụ esoghị bilite nʼọnwụ tutu ruo mgbe puku afọ gafesịrị. 6Ndị a gọziri agọzi na ndị dị nsọ bụ ndị ahụ ketara oke na mbilite nʼọnwụ nke mbụ ahụ. Ọnwụ nke abụọ enweghị ike nʼebe ha nọ, nʼihi na ha ga-abụ ndị nchụaja Chineke na nke Kraịst, sorokwa ya chịa ọchịchị puku afọ.

Ikpe e kpere Setan

7Mgbe puku afọ ahụ gafesịrị, a ga-emekwa ka ekwensu si nʼụlọ mkpọrọ ya pụta. 8Ọ ga-apụkwa jegharịa iduhie mba niile nọ nʼakụkụ anọ nke ụwa, ya bụ Gog na Magog, ọ ga-akpọkọta ha maka agha. Ọnụọgụgụ ha dịka aja dị nʼikpere osimiri. 9Ha biliri agha guzo nʼụwa niile, gbaa ụlọ ikwu nke ndị nsọ Chineke hụrụ nʼanya gburugburu. Ma ọkụ sitere nʼeluigwe gbadata repịa ha. 10Mgbe ahụ, ekwensu ahụ dufuru ha ka a ga-atụnye nʼọdọ ọkụ e ji nkume na-enwu ọkụ kwanye. Ebe ahụ ka ọ ga-anọ, ya na anụ ọhịa ọjọọ ahụ, na onye amụma ụgha ya. Ha ga-anọkwa nʼọnọdụ ahụ mgbu ehihie na abalị ruo mgbe ebighị ebi.

Ikpe Ikpeazụ

11Ahụkwara m otu ocheeze ọcha buru ibu, na onye nọkwasịrị nʼelu ya. Ụwa na mbara eluigwe si nʼihu ya gbapụ, ahụkwaghị ebe ọbụla nye ha. 12Ahụrụ m ndị niile nwụrụ anwụ, ndị ukwu na ndị nta, ka ha guzo nʼihu ocheeze ahụ. E meghere akwụkwọ dị iche iche, meghekwa akwụkwọ ọzọ, nke bụ akwụkwọ nke ndụ. E sitekwara nʼihe niile e dere nʼakwụkwọ ahụ kpee ndị a niile nwụrụ anwụ ikpe dịka ọrụ ha rụrụ si dị. 13Oke osimiri niile nyeghachiri ndị niile nwụrụ nọ nʼime ha. Otu a kwa, ọnwụ na ala mmụọ nyeghachikwara ndị nwụrụ anwụ dị nʼime ha. E kpekwara onye ọbụla ikpe dịka ọrụ ya si dị. 14Emesịa, a tụnyere ọnwụ na ọkụ ala mmụọ nʼime ọdọ ọkụ ahụ. Nke a bụ ọnwụ nke ugboro abụọ nke bụ ọdọ ọkụ. 15Onye ọbụla a na-achọtaghị ebe e dere aha ya nʼakwụkwọ nke ndụ ahụ, ka a tụnyere nʼime ọdọ ọkụ ahụ.

Você sabia?

Os mil anos e o grande trono branco

  • A figura amarrada por mil anos é chamada de dragão, antiga serpente, diabo e Satanás. Satanás significa adversário ou acusador, e no Novo Testamento o nome é usado como equivalente de Diabolos, ou o diabo; o Dicionário Bíblico de Easton (1897) observa que ele também é chamado de dragão e de antiga serpente em Apocalipse 12:9 e 20:2.Fontes: Satan · o próprio texto bíblico
  • Quando os mil anos se completam, as nações reunidas para a batalha recebem o nome de Gogue e Magogue. Em Gênesis, Magogue é o segundo dos filhos de Jafé; em Ezequiel, Gogue lidera um exército hostil vindo da terra do norte, e Magogue é uma nação que o Dicionário Bíblico de Easton (1897) descreve como provavelmente um povo cita ou tártaro, cavaleiros hábeis e peritos no arco.Fontes: Magog · Gog · o próprio texto bíblico
  • Jerônimo, citado pelo Dicionário Bíblico de Easton (1897), entendia Magogue como nações citas, ferozes e inumeráveis, que viviam além do Cáucaso e do lago Maeotis, perto do mar Cáspio e até a Índia. O mesmo verbete trata a visão de Gogue e Magogue em Apocalipse 20:8 como, em substância, um novo anúncio da profecia de Ezequiel, e considera insatisfatórias e inadequadas as ligações propostas com as guerras dos Macabeus contra Antíoco, com os caldeus ou com os turcos.Fontes: Magog · Magog · Gog

Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.

Lugares deste capítulo

  • Gog · Hoje: Lydia · 38.488, 28.040 · versículo 8

Só aparecem lugares com identificação de alta confiança (90% ou mais segundo as fontes acadêmicas reunidas pelo OpenBible). Mapa da época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa atual: © colaboradores do OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Fale com a gente

Conte de onde você lê, como a Bíblia tem te ajudado ou o que podemos melhorar. Lemos todas as mensagens.