Nations Bible

Apocalipse 18

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.

Nkwatu obodo Babilọn

1Mgbe ihe ndị a niile gasịrị, ahụrụ m mmụọ ozi ọzọ ka o si nʼeluigwe na-arịdata. E nyere ya ikike dị ukwuu, ebube ya mekwara ka ihe jupụta nʼụwa. 2O ji olu dị ike tie mkpu,

“ ‘Ọ daala! Ọ daala! Babilọn Obodo Ukwu ahụ adaala!’

Ọ ghọọkwala ọgba obibi ndị mmụọ ọjọọ

nʼebe nzukọ mmụọ ndị ahụ na-adịghị ọcha,

nʼebe nzukọ ụmụ nnụnụ rụrụ arụ

nʼebe nzukọ ụmụ anụmanụ niile na-adịghị ọcha na ndị rụrụ arụ.

3Nʼihi na mba niile aṅụọla

site na mmanya ọnụma nke ịkwa iko ya.

Ndị eze nke ụwa sokwaara ya kwaa iko,

ndị na-azụ ahịa nʼụwa aghọkwaala ndị ọgaranya site nʼoke ịba ụba nke ya.”

Ịdọ aka na ntị

4Mgbe ahụ, anụkwara m olu ọzọ si nʼeluigwe na-akpọ oku na-asị,

“ ‘Ndị m, sinụ nʼime ya pụta,’

ka unu ghara iketa oke na mmehie ya,

ka unu gharakwa iketa oke ahụhụ ya.

5Nʼihi na mmehie ya amụbaala ruo eluigwe.

Chineke echetakwala ajọ omume ya niile.

6Mesonụ ya mmeso dịka o si meso unu.

Kwụghachinụ ya ụgwọ mmaji abụọ maka ihe o mere.

Gwakọọrọnụ ya mmaji abụọ nʼime iko mmanya ahụ nke ọ gwakọọrọ ndị ọzọ.

7Nye ya ọtụtụ mmekpa ahụ na obi ilu

dịka ndụ otuto, nʼime onwe ya obi ụtọ nke o nyere onwe ya.

Ọ na-ekwu nʼobi ya na-asị,

‘Abụ m eze nwanyị nọ nʼelu ocheeze m.

Abụghị m nwanyị di ya nwụrụ,

iru ụjụ ọbụla adịghị nye m.’

8Nʼihi nke a, ihe ntaramahụhụ ya ga-abịakwasị ya nʼotu ụbọchị,

ọnwụ na iru ụjụ nke ọnwụ na-eweta, na ụnwụ.

A ga-eji ọkụ rechapụ ya,

nʼihi na Onyenwe anyị Chineke onye na-ekpe ya ikpe, dị ike.

Ahụhụ atọ bịakwasịrị obodo Babilọn

9“Ndị eze nke ụwa, ndị soro ya kwaa iko, ma bie ndụ ọchịchọ ọjọọ ya, ga-akwa akwa, ruo ụjụ nʼihi ya, mgbe ha ga-ahụ anwụrụ ọkụ nke ịkpọ ọkụ ya. 10Ha ga-eji oke egwu guzo nʼebe dị anya, kwaa akwa nʼihi ntaramahụhụ ya sị,

“ ‘Ahụhụ, Ahụhụ dịrị gị, Babilọn, Obodo ukwu a maara aha ya

gị Babilọn, obodo e ji ịdị ike maara.

Nʼotu ntabi anya, ikpe nke gị na-abịa.’

11“Ndị ahịa nke ụwa ga-akwa akwa ruokwa ụjụ nʼihi ya, nʼihi na ọ dịkwaghị onye na-azụ ihe ahịa ha ọzọ. 12Ngwa ahịa ọlaedo gị, na ọlaọcha, na ọla e ji achọ mma na nkume oke ọnụahịa, ezi akwa ọcha, na akwa uhie uhie, na akwa lọrịlọrị, na akwa odo odo, osisi niile na-esi isi ọma, ihe niile e ji ọdụ enyi mee, ngwa ahịa niile e ji osisi niile dị oke ọnụahịa mee, bronz, igwe na nkume mabụl. 13Ha na ụda sinamọn na mmanụ otite nke ọkpụrụkpụ eso osisi na-esi isi ụtọ, máá na frankisens, mmanya na mmanụ oliv, ụtụ ọka na wiiti, ehi na atụrụ, ịnyịnya na ụgbọala agha, na ndị na-ere mmadụ ibe ha dịka ohu, na ahụ mmadụ na mkpụrụobi mmadụ.

14“Ha ga-asị, ‘Mkpụrụ ndị ahụ niile nke na-agụ mkpụrụobi agụ e sitela nʼebe ị nọ gabiga. Ihe ọma niile i ji ebi ndụ, na ihe oke ọnụahịa niile i ji azụ afọ gị, efunarịla gị. Apụghị ịchọtakwa ha ọzọ mgbe ọbụla.’ 15Ndị ahịa ahụ bara ọgaranya site nʼaka ya, ga-anọ nʼebe dị anya, nʼihi oke egwu nke ntaramahụhụ ya, na-eru ụjụ, na-ebesikwa akwa ike.

16“ ‘Ahụhụ, Ahụhụ dịrị gị, obodo ukwu ahụ,

nke e yikwasịrị ezi akwa ọcha, nke na-acha odo odo na ọbara ọbara

nke nya ihe ịchọ mma nke ọlaedo, nkume dị oke ọnụahịa dị iche iche na nkume pieal dị iche iche.

17Nʼotu awa a ka a lara oke akụ niile ndị a nʼiyi.’

“Ndị niile nwee ụgbọ na-aga nʼoke osimiri, na ndị na-akwọ ụgbọ ndị ahịa nʼoke osimiri, na ndị niile na-eso ụgbọ mmiri ga-anọ nʼebe tere anya, 18na-eti mkpu mgbe ha ga na-ele anya na-ahụ anwụrụ ọkụ na-ala elu site nʼire ọkụ ya na-asị, ‘Olee obodo ọzọ dịka obodo ukwuu a?’ 19Ha ga-ekpokwasị aja nʼisi igosi obi ọjọọ ha na-eti mkpu akwa na-asị,

“ ‘Ahụhụ, Ahụhụ dịrị gị, obodo ukwu a maara aha ya

ebe ndị niile nwere ụgbọ mmiri na-aga nʼosimiri

ghọrọ ndị ọgaranya site nʼakụ dị nʼime ya.

Ma ugbu a, nʼotu ntabi anya, ihe niile dị nʼime ya bụ ihe a laara nʼiyi.’

20“Ma gị eluigwe, ṅụrịa ọṅụ nʼihi ihe a dakwasịrị ya,

unu ndị nsọ, ṅụrịakwanụ ọnụ,

unu ndị amụma na ndị ozi, ṅụrịakwanụ ọnụ.

Nʼihi na Chineke ekpeela ya ikpe

nʼihi mmeso ya megide unu.”

Ụbọchị mkpebi ikpe Babilọn

21Mgbe ahụ, otu mmụọ ozi dị ukwuu tụtụlitere otu nkume nke dịka nkume igwe nri, tụba ya nʼime oke osimiri, na-asị,

“Otu a ka a ga-esi tufuo

Babilọn obodo ukwu ahụ,

agaghị ahụkwa ya ọzọ.

22Ọ dịghị mgbe ọzọ ụzụ egwu ga-adị nʼebe ahụ.

Agaghị anụkwa olu ọja na une na ụbọ akwara na nke ndị na-afụ opi ike nʼime gị ọzọ.

Aghaghị ahụ onye ọrụ ǹka ọbụla

nʼime gị ọzọ.

Agaghị anụkwa ụzụ nkume igwe nri

nʼime gị ọzọ.

23Ìhè nke sitere nʼoriọna

agaghị acha nʼime gị ọzọ.

Olu obi ụtọ nke nwoke na nwanyị

na-alụ di na nwunye agaghị adịkwa.

Ndị mgbereahịa gị bụ ndị a ma ama nʼelu ụwa,

ọ bụkwa mgbaasị gị ka e ji duhie mba niile nke ụwa.

24Nʼime ya ka a hụrụ ọbara ndị amụma niile, na nke ndị nsọ niile,

na nke ndị ọzọ ahụ niile e gburu nʼụwa.”

Ilustração artística — interpretação, não registro histórico.

Você sabia?

A queda da grande Babilônia

  • “Babilônia”, neste capítulo, é a forma grega do nome Babel. Um dicionário bíblico apresenta a forma semítica Babilu, que significa “a porta de Deus”, e observa que as tábuas assírias a chamam de “a cidade da dispersão das tribos”. A mesma entrada situa a cidade junto ao Eufrates, cerca de duzentas milhas acima da confluência desse rio com o Tigre.Fontes: Babylon · o próprio texto bíblico
  • O capítulo mostra a riqueza de Babilônia por meio de quem lucrava com ela. Os reis que viveram no luxo com ela, e os capitães de navio, marinheiros e outros que viviam do mar, ficam à distância e choram ao ver a fumaça do fogo que a consome. Os mercadores pranteiam porque já não há quem compre sua carga, que vai do ouro, da púrpura, da seda e das especiarias até o gado, os cavalos, os carros e escravos e almas de homens.Fontes: o próprio texto bíblico
  • A queda é apresentada como súbita e definitiva. No coração, a cidade diz que se assenta como rainha, que não é viúva e que jamais verá pesar; o capítulo, porém, diz que morte, pesar e fome chegam num só dia e que ela é consumida pelo fogo, enquanto os que observam de longe clamam que o desastre chegou numa só hora. Um anjo poderoso lança ao mar uma pedra do tamanho de uma grande mó e declara que Babilônia será derrubada com a mesma violência e nunca mais será vista; cessam a música, o trabalho dos artesãos, o som da mó, a luz das lâmpadas e as vozes da noiva e do noivo.Fontes: o próprio texto bíblico

Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.

Lugares deste capítulo

  • Babylon · Hoje: Rome · 41.892, 12.485 · versículos 2, 10, 21

Só aparecem lugares com identificação de alta confiança (90% ou mais segundo as fontes acadêmicas reunidas pelo OpenBible). Mapa da época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa atual: © colaboradores do OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Fale com a gente

Conte de onde você lê, como a Bíblia tem te ajudado ou o que podemos melhorar. Lemos todas as mensagens.