Apocalipse 17
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.
Nwanyị akwụna na anụ ọjọọ ahụ
1Otu nʼime ndị mmụọ ozi asaa ndị ahụ ji efere bịara sị m, “Bịa, aga m egosi gị ahụhụ ga-abịakwasị onye ahụ ụwa niile maara dịka akwụna, onye ahụ na-anọkwasị nʼelu ọtụtụ mmiri nke ụwa. 2Ndị eze ụwa esorola ya kwaa iko nʼotu ihe ndina, emeekwara ka ndị niile bi nʼụwa bụrụ ndị mmanya ịkwa iko ya na-egbu.”
3O duuru m nʼime mmụọ baa nʼọzara. Nʼebe ahụ ka m nọ hụ otu nwanyị nọkwasịrị nʼelu otu anụ ọhịa na-acha ọbara ọbara. Anụ ọhịa ahụ nwere isi asaa na mpi iri. Aha ndị e dere anụ ọhịa ahụ nʼahụ bụ naanị okwu ikwulu Chineke. 4Nwanyị ahụ yi akwa na-acha odo odo na nke na-achakwa ọbara ọbara, gbarakwa ihe ịchọ mma e ji ọlaedo, nkume dị oke ọnụahịa na pieal kpụọ. O jikwa iko ọlaedo nʼaka ya nke jupụtara nʼihe arụ na ihe ure niile o ji na-akwa iko ya. 5Aha e dekwasịrị ya nʼegedege ihu bụ ihe omimi:
Obodo ukwu ahụ bụ Babilọn,
nne ndị na-akwa iko
na nke ihe arụ niile nke ụwa.
6Ejikwa m anya m hụ na nwanyị ahụ aṅụjuola ọbara ndị nsọ afọ, ya na ọbara ndị ama Jisọs.
Mgbe m hụrụ ya, ọ gbagwojuru m anya. 7Ma mmụọ ozi ahụ sịrị m, “Gịnị mere ihe ị hụrụ ji ju gị anya? Aga m akọwara gị ihe omimi banyere nwanyị a na anụ ọhịa ahụ nke na-ebugharị ya, bụ nke nwere isi asaa na mpi iri. 8Anụ ọhịa ahụ ị hụrụ, nwere mgbe ọ dịịrị, ma ugbu a, ọ dịkwaghị. Ma ọ ga-esi nʼolulu Abis ahụ pụta banye na mbibi. Ma nlọghachi ya ga-eju ndị ahụ a na-edeghị aha ha nʼime akwụkwọ ndụ ahụ site nʼoge e kere ụwa anya. Nʼihi na e nwere mgbe ọ dịịrị, ma ugbu a, ọ dịkwaghị, ma ọ ga-emesi bịa.
9“Nke a chọrọ uche nke nwere amamihe. Isi asaa ahụ nọchiri anya ugwu asaa ahụ nke nwanyị ahụ na-anọdụ nʼelu ha. Ha na-anọchikwa anya ndị eze asaa. 10Ise nʼime ha adaala, otu ka nọ, nke ọzọ abịabeghị. Mgbe ọ bịara, ọ ga-anọ nwantakịrị oge. 11Anụ ọhịa ahụ nke dịrịị ma ọ dịkwaghị, bụ onye nke asatọ, ọ bụ onye otu ndị eze asaa ahụ ma a lakwara ya nʼiyi.
12“Mpi iri ahụ ị hụrụ nọchiri anya ndị eze iri na-anatabeghị alaeze. Ha na anụ ọhịa ahụ ga-anata ike ọchịchị dịka eze sọọsọ otu awa. 13Ha ji otu obi na-enye anụ ọhịa ahụ ike ha na ịchị isi ha. 14Ha ga-ebu agha megide Nwa Atụrụ ahụ, ma Nwa Atụrụ ahụ ga-emeri ha nʼihi na ọ bụ Onyenwe kachasị ndị nwenụ niile nakwa Eze kachasị ndị eze niile. Ndị so ya bụkwa ndị a kpọrọ, na ndị a họpụtara, ndị ya kwesikwara ntụkwasị obi.”
15Mgbe ahụ ọ sịrị m, “Mmiri ndị ahụ ị hụrụ, ebe nwanyị akwụna ahụ nọ, bụ ndị mmadụ dị iche iche, igwe mmadụ, na mba dị iche iche na nʼasụsụ dị iche iche. 16Anụ ọhịa ahụ na mpi iri ahụ ị hụrụ ga-akpọ nwanyị akwụna ahụ asị. Ha ga-agba ya ọtọ, laakwa ya nʼiyi, ha ga-eri anụ ya, werekwa ọkụ rechapụ ya. 17Chineke etinyela ya nʼobi ha imejupụta nzube ya site nʼinwe otu obi nakwa inyefe anụ ọhịa ahụ ikike ọchịchị alaeze ha, tutu ruo mgbe a ga-emezu okwu Chineke. 18Ma nwanyị a ị hụrụ bụ obodo ukwu ahụ na-achị ndị eze niile nke ụwa.”
Você sabia?
O mistério de Babilônia, a Grande
- Um nome misterioso está escrito na fronte da mulher: Babilônia, a Grande, mãe das prostitutas e das abominações da terra. O anjo explica que a mulher é a grande cidade que governa os reis da terra.Fontes: o próprio texto bíblico
- Um verbete sobre o lugar registra Babilônia como a forma grega de Babel, e a forma semítica Babilu como significando "A Porta de Deus". Diz também que, nas tábuas assírias, o nome significa "a cidade da dispersão das tribos". O mesmo verbete situa a cidade no Eufrates, cerca de duzentas milhas rio acima da confluência desse rio com o Tigre.Fontes: Babylon
- O anjo interpreta imagens da visão. As águas onde a prostituta está sentada são povos, multidões, nações e línguas. As sete cabeças são sete montes sobre os quais a mulher se assenta; o texto também fala de sete reis, e os dez chifres são dez reis que ainda não receberam um reino.Fontes: o próprio texto bíblico
Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.
Lugares deste capítulo
- Babylon · Hoje: Rome · 41.892, 12.485 · versículo 5
Só aparecem lugares com identificação de alta confiança (90% ou mais segundo as fontes acadêmicas reunidas pelo OpenBible). Mapa da época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa atual: © colaboradores do OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org