Nations Bible

Números 6

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.

Onye Nazirait

1Onyenwe anyị gwara Mosis sị, 2Gwa ndị Izrel sị ha, “Mgbe nwoke maọbụ nwanyị ṅụrụ iyi o ji kpebie ikwe nkwa pụrụ iche nke ikewapụ onwe ya nye Onyenwe anyị dịka onye Nazirait, 3ha ga-ekewapụ onwe ha site na ịṅụ mmanya, maọbụ detụ ihe ọṅụṅụ ọbụla na-aba nʼanya ire. Ha agaghị aṅụ mmiri mkpụrụ vaịnị, ọ gaghị ata mkpụrụ vaịnị ọhụrụ maọbụ nke a mịkpọrọ amịkpọ. 4Oge ahụ niile ọ bụ onye Nazirait, ọ gaghị eri ihe ọbụla sitere na mkpụrụ osisi vaịnị maọbụ mkpụrụ ya maọbụ okpokoro azụ ya.

5“ ‘Nʼime oge niile nke imezu nkwa ikewapụ onwe ya nye Onyenwe anyị, agụba agaghị agabiga ya nʼisi. Ọ ga-anọgide bụrụ onye dị nsọ tutu ruo oge nkwa ikewapụ onwe ya nye Onyenwe anyị zuru. Nʼihi nke a, ọ ga-ahapụ agịrị isi ya ka o too.

6“ ‘Nʼime oge niile nke imezu nkwa ikewapụ onwe ya nye Onyenwe anyị, ọ gaghị aga nso mmadụ ọbụla nwụrụ anwụ, 7ọ bụladị na nna ya, maọbụ nne ya, maọbụ nwanne ya nwoke, maọbụ nwanne ya nwanyị anwụọ. Ọ gaghị emerụ onwe ya nʼihi ha, nʼihi na akara ikewapụ onwe ya iche nye Chineke dị ya nʼisi. 8Nʼoge niile nke ikewapụ onwe ya, onye e doro nsọ nye Onyenwe anyị ka ọ bụ.

9“ ‘Ọ bụrụ na mmadụ anwụọ na mberede nʼakụkụ onye nazirait, si otu a merụọ agịrị isi ya nke na-egosi ido nsọ ya, ọ ghaghị ịkpacha isi ya nʼụbọchị nke asaa bụ ụbọchị ime ka ọ dị ọcha. 10Nʼụbọchị nke ọzọ ya, bụ nʼụbọchị nke asatọ. Ọ ghaghị iwetara onye nchụaja nduru abụọ maọbụ ụmụ kpalakwukwu abụọ, nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ. 11Onye nchụaja ahụ ga-ewere otu nʼime ha chụọrọ ya aja mmehie. Ọ ga-ewerekwa nnụnụ nke ọzọ chụọrọ ya aja nsure ọkụ maka ikpuchiri onye ahụ nwere akara ido nsọ mmehie ya, bụ nke o mere site nʼịnọ onye nwụrụ anwụ nso. Ọ ga-edokwa isi ya nsọ ọzọ nʼụbọchị ahụ. 12Ọ ga-ekewapụ onwe ya nye Onyenwe anyị dịka o mere na mmalite ụbọchị niile nke ido nsọ ya. Wetakwa otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja ikpe ọmụma. A gaghị agụnyere ya ụbọchị ndị ahụ niile gafere tupu o merụọ onwe ya, nʼihi na o merụrụ onwe ya mgbe ọ nọ ọnọdụ imezu nkwa nkewapụ.

13“ ‘Nke a bụ iwu dịrị onye Nazirait mgbe oge ido onwe ya nsọ nye Onyenwe anyị zuru. A ga-eduru ya bịa nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ. 14Nʼebe ahụ ka ọ ga-anọ chee onyinye ya ndị a nʼihu Onyenwe anyị: nwa ebule na-enweghị ntụpọ, gbara otu afọ, maka aja nsure ọkụ na otu nwa nne atụrụ na-enweghị ntụpọ gbara otu afọ maka aja mmehie, na otu ebule ahụ zuruoke maka aja udo, 15tinyere aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ na otu nkata achịcha a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee, na achịcha e ji ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ oliv mee, na achịcha mbadamba na-ekoghị eko nke e tere mmanụ oliv.

16“ ‘Onye nchụaja ahụ ga-eche ihe aja ndị a niile nʼihu Onyenwe anyị, chụọ aja mmehie na aja nsure ọkụ. 17Ọ ga-eji nwa ebule ahụ chụọ aja udo nye Onyenwe anyị, ya na nkata achịcha na-ekoghị eko ahụ. Ọ ga-achụkwa aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ.

18“ ‘Mgbe ahụ, onye ahụ doro onwe ya nsọ nye Onyenwe anyị ga-akpụchapụ agịrị isi ya nke bụ ihe na-egosi ido nsọ ya. Ọ ga-eme nke a na mbata ọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ. Emesịa, ọ ga-etinye agịrị isi ahụ ọ kpụchapụtara nʼọkụ ahụ dị nʼokpuru aja udo ahụ.

19“ ‘Mgbe a kpụchasịrị onye ahụ agịrị isi ya, nke na-egosi ido nsọ ya, onye nchụaja ga-ewere ubu aka ebule ahụ e sịrị esi, otu ogbe achịcha na-ekoghị eko na otu mbadamba achịcha na-ekoghị eko site na nkata ahụ, tinye ha niile nʼaka onye ahụ. 20Onye nchụaja ahụ nʼoge a, ga-ewere aja ndị a fufee ha nʼihu Onyenwe anyị dịka aja mfufe. Ha niile ga-abụ ihe nsọ nye onye nchụaja ahụ, tinyere obi anụ ahụ e fufere efufe, na apata anụ ahụ e chere nʼihu Onyenwe anyị. Mgbe nke a gasịrị, onye ahụ doro onwe ya nsọ nwere onwe ya ịṅụ mmanya.

21“ ‘Nke a bụ iwu dịrị onye ọ bụla kpebiri ikewapụ onwe ya nye Onyenwe anyị dịka onye Nazirait. Onyinye onye ahụ ga-enye ga-abụ dịka nkwa ido nsọ ya si dị, tinyere ihe ndị ọzọ ha nwere ike inye. Onye dị otu a aghaghị imezu nkwa ọbụla o kwere dịka iwu metụtara onye Nazirait si dị.’ ”

Ngọzị nke ndị nchụaja

22Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, 23“Gwa Erọn na ụmụ ya ndị ikom sị, ‘Otu a ka unu ga-esi gọzie ndị Izrel. Unu ga-asị ha,

24“ ‘ “ Onyenwe anyị gọzie unu

ma chebe unu,

25Onyenwe anyị mee ka ihu ya mụkwasị unu,

ma meere unu amara,

26Onyenwe anyị chee ihu ya nʼebe unu nọ,

nyekwa unu udo.” ’

27“Otu a ka ha ga-esi kwupụta aha m nye ụmụ Izrel. Mụ onwe m ga-agọzikwa ha.”

Ilustração artística — interpretação, não registro histórico.

Você sabia?

O Voto de Nazireu e a Bênção Sacerdotal

  • O voto de nazireu era um período voluntário de consagração especial a Deus, acessível tanto a homens quanto a mulheres. Durante esse tempo, a pessoa devia abster-se totalmente de produtos derivados da videira e de bebidas fermentadas, deixar o cabelo crescer sem cortar e evitar a contaminação ritual por qualquer cadáver, mesmo de familiares próximos.Fontes: o próprio texto bíblico
  • Ao término do período de separação, o nazireu levava sacrifícios à entrada da Tenda do Encontro, rapava o cabelo e o queimava no fogo sob o sacrifício de comunhão. Depois que o sacerdote apresentava as porções prescritas diante de Deus, o voto se encerrava e a pessoa podia voltar a beber vinho.Fontes: o próprio texto bíblico
  • O capítulo se encerra com a bênção sacerdotal que Deus ordenou a Moisés transmitir a Arão e a seus filhos. Ao invocar a proteção, o rosto resplandecente, a graça e a paz de Deus, os sacerdotes colocavam o nome divino sobre o povo de Israel.Fontes: o próprio texto bíblico · Moses · Aaron

Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.

Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Fale com a gente

Conte de onde você lê, como a Bíblia tem te ajudado ou o que podemos melhorar. Lemos todas as mensagens.