Números 5
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.
Idebe ọmụma ụlọ ikwu ọcha
1Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, 2“Nye ndị Izrel iwu ka ha site nʼọmụma ụlọ ikwu ha kpọpụ onye ekpenta ọbụla maọbụ onye ihe si nʼahụ na-asọpụta, na ndị merụrụ onwe ha site nʼimetụ onye nwụrụ anwụ aka. 3Iwu a metụtara onye ọbụla, nwoke na nwanyị. Kpọpụ ha ka ha gaa nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu, ka ha ghara imerụ ogige ụlọ ikwu ha bụ ebe ahụ m binyere unu.” 4Ndị Izrel mezuru iwu a, site nʼetiti ha kpọpụ ndị dị otu a, dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.
Ịkwụghachi ụgwọ
5Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, 6“Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Mgbe onye ọbụla, nwoke maọbụ nwanyị, mejọrọ mmadụ ibe ya nʼụzọ ọbụla, si otu a bụrụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị bụ onye ikpe mara. 7Onye dị otu a aghaghị ikwupụta mmehie ya, kwụghachi onye ahụ o mejọrọ ihe iwu kwuru na ọ ga-akwụ. Ọ ga-atụkwasị nʼelu ihe ọ na-akwụghachi onye ahụ o mejọrọ ego ọzọ ruru otu ụzọ nʼụzọ ise. 8Ma ọ bụrụ na onye ahụ enweghị onye ikwu ya bụ onye a ga-akwụghachi ụgwọ nʼihi mejọọ ahụ, ihe ịkwụghachi ụgwọ ahụ ga-abụ nke Onyenwe anyị, aghaghị inye onye nchụaja. A ga-atụkwasịkwa ya ebule a ga-eji chụọ aja mkpuchi mmehie nʼihi onye ahụ mehiere. 9Onyinye niile dị nsọ ndị Izrel wetaara onye nchụaja bụ nke onye nchụaja ahụ. 10Onyinye dị nsọ niile mmadụ na-eweta bụ nke onye na-eweta ya, ma onyinye e nyere onye nchụaja bụ nke onye nchụaja.’ ”
Iwu banyere ekwesighị ntụkwasị obi
11Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, 12“Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, Ọ bụrụ na nwunye mmadụ ejehie ụzọ bụrụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nʼebe di ya nọ 13site nʼidinakwuru nwoke ọzọ nʼụzọ zoro ezo nʼebe di ya nọ ruo na achọpụtaghị adịghị ọcha ya (ebe a na-enweghị onye ga-agba akaebe megide ya, maọbụ na e jidere ya mgbe ọ na-akwa iko ahụ), 14ọ bụrụ na mmụọ ekworo abịakwasị di ya, ọ bụrụkwa na di nwanyị ahụ na-enyo nwunye ya enyo, na-ele ya anya dịka onye merụrụ onwe ya, ma ọ bụkwanụ, ọ bụrụ na di ya esite nʼekworo nyoo nwunye ya, ọ bụ ezie na nwanyị ahụ bụ onye na-emerụghị onwe ya, 15nwoke a ga-akpọrọ nwunye ya bịakwute onye nchụaja. Ọ ga-eweta onyinye iji ịbịaru nso nʼihi nwunye ya, nke bụ iko ụtụ ọka balị abụọ a na-awụkwasịghị mmanụ, maọbụ ụda na-esi isi ụtọ a gwakọrọ agwakọ, nʼihi na ọ bụ onyinye mkpụrụ ọka e sitere nʼobi jupụtara nʼekworo nye, onyinye ịkpọtụ uche nʼikpe ọmụma.
16“ ‘Onye nchụaja ga-akpọbata nwanyị a mee ka o guzo nʼihu Onyenwe anyị. 17Ọ ga-ekunye mmiri nsọ nʼime ite aja, kporo aja nʼala site nʼụlọ nzute ahụ wụnye ya nʼime mmiri ahụ. 18Dịka nwanyị ahụ guzo nʼihu Onyenwe anyị, onye nchụaja ahụ ga-atọsa agịrị isi ya, tinye onyinye mkpụrụ ọka ncheta ahụ, nke bụ onyinye mkpụrụ ọka ekworo ahụ nʼọbụaka nwanyị a. Onye nchụaja nʼonwe ya ga-eguzo nʼihu nwanyị a jide ite mmiri ilu ahụ na-eweta ọbụbụ ọnụ. 19Mgbe ahụ, onye nchụaja ga-eme ka nwanyị a ṅụọ iyi, mgbe ọ na-agwa ya okwu sị, “Ọ bụrụ na o nweghị nwoke ọbụla gị na ya nwere mmekọ, ọ bụrụ na ị kpafughị ghọọ onye na-adịghị ọcha mgbe ị nọ nʼụlọ di gị, ka ihe ọjọọ ọbụla ghara izute gị site na mmiri ilu a na-eweta ọbụbụ ọnụ. 20Ma ọ bụrụ na ị kpafuola mgbe ị ka nọ nʼụlọ di gị, ọ bụrụ na i merụọla onwe gị site na idinakwuru nwoke ọzọ na-abụghị di gị,” 21(nʼoge a, onye nchụaja ga-eme ka nwanyị a ṅụọ iyi nke ya na ọbụbụ ọnụ a so, gwa nwanyị okwu sị ya) “ka Onyenwe anyị mee ka ndị ị nọ nʼetiti ha bụọ gị ọnụ ma kọchaa gị mgbe o mere ka apata gị ree ure, mgbe o mere ka afọ gị koo eko. 22Ka mmiri ilu a, nke na-eweta ọbụbụ ọnụ banye gị nʼahụ ime ka afọ gị koo eko, imekwa ka akpanwa gị daa ada.”
“ ‘Nwanyị ahụ ga-aza sị, “Amen, ya dịrị m otu a.”
23“ ‘Mgbe ahụ onye nchụaja ahụ ga-ede ọbụbụ ọnụ ndị a nʼakwụkwọ, sanye ha nʼime mmiri ilu ahụ. 24Mgbe ahụ, ọ ga-enye nwanyị a mmiri ilu ahụ na-eweta ọbụbụ ọnụ ka ọ ṅụọ, mmiri a ga-abanye ya nʼime ahụ, wetara ya ịta ahụhụ dị ilu. 25Emesịa, onye nchụaja ga-anara nwanyị ahụ onyinye mkpụrụ ọka ekworo ahụ o ji nʼọbụaka ya, fegharịa ya nʼihu Onyenwe anyị, buru ya gaa nʼebe ịchụ aja. 26Onye nchụaja ga-esite nʼonyinye mkpụrụ ahụ kporo nke ga-eju ya aka, nke na-anọchite anya ha niile, suo ha ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja. Emesịa, ọ ga-enye nwanyị ahụ mmiri ahụ ka ọ ṅụọ. 27Ọ bụrụ na nwanyị a emerụọla onwe ya, bụrụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nye di ya, mgbe ọ ṅụrụ mmiri na-eweta ọbụbụ ọnụ, ọ ga-abanye nʼime ya wetara ya ahụhụ dị ilu. Afọ ya ga-eko, buo ibu, akpanwa ya a gaghị anagide nwa. Ọ ga-aghọ onye a bụrụ ọnụ nʼetiti ndị ya. 28Ma ọ bụrụ na nwanyị emerụghị onwe ya, kama ọ bụ onye dị ọcha, ọ ga-abụ onye nwere onwe ya site nʼikpe ọmụma. Ọ ga-atụrụ ime mụta ụmụ.
29“ ‘Nke a bụ iwu metụtara ikwo ekworo mgbe nwanyị bi nʼụlọ di ya kpafuru merụọ onwe ya. 30Maọbụ mgbe ekworo jupụtara nwoke nʼobi nʼihi na ọ gụrụ nwunye ya dịka onye na-ekwesighị ntụkwasị obi. Onye nchụaja ga-eme ka nwanyị a guzo nʼihu Onyenwe anyị, mezuokwa ihe niile nʼusoro dịka e si depụta ha nʼebe a. 31A gaghị ama di nwanyị a ikpe dịka onye mere ihe ọjọọ, kama nwanyị a ga-ebu ahụhụ ya na mmehie ya naanị ya.’ ”
Você sabia?
A Pureza do Acampamento e a Lei dos Ciúmes
- Para manter a pureza ritual do acampamento onde Deus habitava no meio do povo, qualquer pessoa com doença de pele, fluxo corporal ou contaminação por contato com um cadáver era enviada para fora do acampamento.Fontes: o próprio texto bíblico
- Quando alguém cometia um pecado contra o próximo, exigia-se confissão e restituição total acrescida de um quinto do valor à pessoa prejudicada ou a um parente, ou ao sacerdote se não houvesse parente.Fontes: o próprio texto bíblico
- A oferta de cereal apresentada pela mulher sob suspeita de infidelidade era de farinha de cevada sem azeite nem incenso, caracterizando-a como uma oferta memorial para trazer à luz a suspeita de iniquidade.Fontes: o próprio texto bíblico
Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.
Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org