Números 7
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.
Onyinye ido ụlọ nzute nsọ
1Mgbe Mosis guzobesiri ụlọ nzute ahụ ọtọ, o tere ya mmanụ. Doo ya na ihe niile e ji chọọ ya mma nsọ. O tekwara ebe ịchụ aja mmanụ, doo ya nsọ, ya na ngwongwo ya niile. 2Mgbe ahụ, ndị ndu Izrel, ndịisi ezinaụlọ niile, ndị bụ ndị ndu ebo niile e tinyere ọrụ ịgụ ndị ahụ niile ọnụ wetara onyinye ha. 3Ha wetara dịka onyinye ha nye Onyenwe anyị ụgbọala isii ihe juputara nʼime ha, na ehi iri na abụọ. Ndị ndu abụọ ọbụla wetara otu ụgbọala, ma ha niile nʼotu na otu wetara otu ehi, otu ehi. Ha chere ihe ndị a niile nʼihu ụlọ nzute ahụ.
4Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, 5“Nabata onyinye ndị a niile, ka e jiri ha rụọ ọrụ ụlọ nzute, were ha nyefee ndị Livayị nʼaka, onye ọbụla dịka mkpa ọrụ ya si dị.”
6Ya mere, Mosis nabatara ụgbọala ndị ahụ na ehi ndị ahụ, nyefee ha ndị Livayị nʼaka. 7O nyere ụmụ Geshọn ụgbọala abụọ na ehi anọ, dịka ọrụ ha si dị. 8Nye ụmụ Merari, ụgbọala anọ na ehi asatọ, dịka ọrụ ha si dị. Ha niile nọ nʼokpuru nlekọta Itama nwa Erọn, onye nchụaja. 9Mosis enyeghị ụmụ Kohat ihe ọbụla nʼihi na ọ bụ nʼisi mbụ aka ha ka ha ji ebu ihe nsọ ndị ahụ ha ketara ibu.
10Ndị ndu ụmụ Izrel niile wetara onyinye ido nsọ nʼụbọchị e tere ebe ịchụ aja ahụ mmanụ ido ya nsọ. Ha wetara ha, debe ha nʼihu ebe ịchụ aja ahụ. 11Nʼihi na Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Ka onyendu ọbụla weta onyinye nʼụbọchị dị iche iche, otu onye, otu ụbọchị, maka ido nsọ nke ebe ịchụ aja ahụ.”
12Ya mere, Nashọn nwa Aminadab onye si nʼebo Juda wetara onyinye nke ya nʼụbọchị nke mbụ.
13Onyinye o wetara bụ:
efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị shekel na iri shekel atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ nke ịdị arọ ya bụ iri shekel asaa, dịka ihe ọtụtụ shekel ebe nsọ si dị. A wụjuru efere abụọ ndị a ụtụ ọka a gwara mmanụ maka onyinye mkpụrụ ọka.
14O wetara otu efere ọlaedo, nke ịdị arọ ya bụ shekel iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ.
15O wetakwara otu nwa oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule nke gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ.
16O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie,
17na ehi abụọ, na ebule ise, na mkpi ise, na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo.
18Nʼụbọchị nke abụọ, Netanel nwa Zua, onyendu ebo Isaka wetara onyinye nke ya.
19Onyinye o wetara bụ:
otu efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị shekel na iri shekel atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ, nke ịdị arọ ya bụ iri shekel asaa, efere abụọ ndị a bụ nʼusoro dịka shekel ebe nsọ si dị. A wụjuru efere ọbụla ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ dịka onyinye mkpụrụ ọka.
20O wetara otu efere ọlaedo, nke ịdị arọ ya bụ shekel iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ.
21O wetakwara otu oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ.
22O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie,
23na ehi abụọ, na ebule ise, mkpi ise, na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo.
24Nʼụbọchị nke atọ Eliab nwa Helọn onyendu ebo Zebụlọn wetakwara onyinye nke ya.
25Onyinye o wetara bụ:
otu efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị shekel na iri shekel atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ, nke ịdị arọ ya bụ iri shekel asaa, efere abụọ ndị a bụ nʼusoro dịka shekel ebe nsọ si dị. A wụjuru efere ọbụla ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ dịka onyinye mkpụrụ ọka.
26O wetara otu efere ọlaedo nke ịdị arọ ya bụ shekel iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ.
27O wetakwara otu nwa oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ.
28O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie,
29na ehi abụọ, na ebule ise, mkpi ise, na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo.
30Nʼụbọchị nke anọ, Elizọ nwa Shedeua onyendu ebo Ruben wetara onyinye nke ya.
31Onyinye o wetara bụ:
otu efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị shekel na iri shekel atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ, nke ịdị arọ ya bụ iri shekel asaa, efere abụọ ndị a bụ nʼusoro dịka shekel ebe nsọ si dị. A wụjuru efere ọbụla ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ dịka onyinye mkpụrụ ọka.
32O wetara otu efere ọlaedo, nke ịdị arọ ya bụ shekel iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ.
33O wetakwara otu oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ.
34O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie,
35na ehi abụọ, na ebule ise, mkpi ise, na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo.
36Nʼụbọchị nke ise Shelumiel nwa Zurishadai, onyendu ebo Simiọn butere onyinye nke ya.
37Onyinye o wetara bụ:
otu efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị shekel na iri shekel atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ, nke ịdị arọ ya bụ iri shekel asaa, efere abụọ ndị a bụ nʼusoro dịka shekel ebe nsọ si dị. A wụjuru efere ọbụla ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ dịka onyinye mkpụrụ ọka.
38O wetara otu efere ọlaedo nke ịdị arọ ya bụ shekel iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ.
39O wetakwara otu oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ.
40O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie,
41ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo.
42Nʼụbọchị nke isii, Eliasaf nwa Deuel onyendu ebo Gad butere onyinye nke ya.
43Onyinye o wetara bụ:
otu efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị shekel na iri shekel atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ, nke ịdị arọ ya bụ iri shekel asaa, efere abụọ ndị a bụ nʼusoro dịka shekel ebe nsọ si dị. A wụjuru efere ọbụla ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ dịka onyinye mkpụrụ ọka.
44O wetara otu efere ọlaedo, nke ịdị arọ ya bụ shekel iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ.
45O wetakwara otu oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ.
46O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie,
47na ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo.
48Nʼụbọchị nke asaa, Elishama, nwa Amihud, onyendu ebo Ifrem butere onyinye nke ya.
49Onyinye o wetara bụ:
otu efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị shekel na iri shekel atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ, nke ịdị arọ ya bụ iri shekel asaa, efere abụọ ndị a bụ nʼusoro dịka shekel ebe nsọ si dị. A wụjuru efere ọbụla ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ dịka onyinye mkpụrụ ọka.
50O wetara otu efere ọlaedo, nke ịdị arọ ya bụ shekel iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ.
51O wetakwara otu oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ.
52O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie,
53na ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo.
54Nʼụbọchị nke asatọ, Gamaliel nwa Pedazo onyendu ebo Manase nyere onyinye nke ya.
55Onyinye o wetara bụ:
otu efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị shekel na iri shekel atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ, nke ịdị arọ ya bụ iri shekel asaa, efere abụọ ndị a bụ nʼusoro dịka shekel ebe nsọ si dị. A wụjuru efere ọbụla ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ dịka onyinye mkpụrụ ọka.
56O wetara otu efere ọlaedo, nke ịdị arọ ya bụ shekel iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ.
57O wetakwara otu oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ.
58O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie,
59ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo.
60Nʼụbọchị nke itoolu, Abidan nwa Gidiọn onyendu ebo Benjamin nyere onyinye nke ya.
61Onyinye o wetara bụ:
otu efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị shekel na iri shekel atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ, nke ịdị arọ ya bụ iri shekel asaa, efere abụọ ndị a bụ nʼusoro dịka shekel ebe nsọ si dị. A wụjuru efere ọbụla ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ dịka onyinye mkpụrụ ọka.
62O wetara otu efere ọlaedo, nke ịdị arọ ya bụ shekel iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ.
63O wetakwara otu oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ.
64O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie,
65na ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo.
66Nʼụbọchị nke iri, Ahieza nwa Amishadai, onyendu ebo Dan butere onyinye nke ya.
67Onyinye o wetara bụ:
otu efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị shekel na iri shekel atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ, nke ịdị arọ ya bụ iri shekel asaa, efere abụọ ndị a bụ nʼusoro dịka shekel ebe nsọ si dị. A wụjuru efere ọbụla ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ dịka onyinye mkpụrụ ọka.
68O wetara otu efere ọlaedo, nke ịdị arọ ya bụ shekel iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ.
69O wetakwara otu oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ.
70O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie,
71ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo.
72Nʼụbọchị nke iri na otu, Pagịel nwa Okran, onyendu ebo Asha butere onyinye nke ya.
73Onyinye o wetara bụ:
otu efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị shekel na iri shekel atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ, nke ịdị arọ ya bụ iri shekel asaa, efere abụọ ndị a bụ nʼusoro dịka shekel ebe nsọ si dị. A wụjuru efere ọbụla ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ dịka onyinye mkpụrụ ọka.
74O wetara otu efere ọlaedo, nke ịdị arọ ya bụ shekel iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ.
75O wetakwara otu oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ.
76O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie,
77na ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo.
78Nʼụbọchị nke iri na abụọ, Ahira nwa Enan, onyendu ebo Naftalị nyere onyinye nke ya.
79Onyinye o wetara bụ:
otu efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị shekel na iri shekel atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ, nke ịdị arọ ya bụ iri shekel asaa, efere abụọ ndị a bụ nʼusoro dịka shekel ebe nsọ si dị. A wụjuru efere ọbụla ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ dịka onyinye mkpụrụ ọka.
80O wetara otu efere ọlaedo nke ịdị arọ ya bụ shekel iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ.
81O wetakwara otu oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ.
82O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie,
83na ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo.
84Ndị a bụ onyinye ndị ndu ụmụ Izrel wetara maka ido ebe ịchụ aja nsọ nʼoge e tere ya mmanụ:
efere ọlaọcha iri na abụọ, na efere ọlaọcha ịkwọsa mmiri iri na abụọ, na efere ọlaedo iri na abụọ. 85Ịdị arọ nke efere ọlaọcha ọbụla dị otu narị shekel na iri shekel atọ. Ịdị arọ nke efere ịkwọsa mmiri ọbụla dị iri shekel asaa. Ịdị arọ efere ọlaọcha niile ha wetara bụ puku shekel abụọ na narị shekel anọ, dịka ihe ọtụtụ shekel ebe nsọ si dị. 86Ịdị arọ nke otu nʼime efere ọlaedo iri na abụọ ndị ahụ ụda nsure ọkụ na-esi isi ụtọ juru nʼime ha bụ iri shekel, dịka ihe ọtụtụ shekel ebe nsọ si dị. Ịdị arọ nke efere ọlaedo ndị ahụ niile bụ otu narị shekel na iri shekel abụọ.
87Ọnụọgụgụ anụ ụlọ niile e wetara maka aja nsure ọkụ bụ: oke ehi iri na abụọ, na ebule iri na abụọ, na ụmụ ebule iri na abụọ gbara otu afọ, otu afọ, tinyere ihe niile ha wetara maka aja mkpụrụ ọka. E ji mkpi iri na abụọ chụọ aja mmehie.
88Anụ ụlọ niile e ji chụọ aja udo bụ, iri oke ehi abụọ na anọ, na iri ebule isii, na iri mkpi isii, na ụmụ ebule iri isii ndị gbara naanị otu afọ, otu afọ.
89Mgbe Mosis banyere nʼụlọ ikwu ahụ ka ya na Onyenwe anyị kparịa ụka, ọ nụrụ olu ahụ ka ọ na-agwa ya okwu site nʼetiti cherubim abụọ ndị ahụ nʼelu ebe mkpuchi mmehie dị nʼelu igbe iwu ọgbụgba ndụ gwa ya okwu. Nʼụzọ dị otu a ka Onyenwe anyị si gwa ya okwu.

Você sabia?
Ofertas de Dedicação dos Líderes Tribais
- Para transportar o tabernáculo, os líderes das doze tribos doaram seis carroças cobertas e doze bois. Moisés distribuiu duas carroças aos gersonitas e quatro aos meraritas de acordo com o serviço de cada grupo, mas não deu nenhuma aos coatitas, que deviam carregar os objetos sagrados diretamente sobre os ombros.Fontes: o próprio texto bíblico
- Para a dedicação do altar, cada líder tribal apresentou uma oferta idêntica ao longo de doze dias consecutivos, composta por vasilhas de prata e ouro, farinha, incenso e animais para sacrifício. A sequência das apresentações diárias começou com Naassom, filho de Aminadabe, líder da tribo de Judá.Fontes: o próprio texto bíblico · Nahshon · Amminadab
Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.
Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org