Nations Bible

Ezequiel 13

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.

Okwu megide ndị amụma ụgha

1Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 2“Nwa nke mmadụ, buo amụma megide ndị amụma nke Izrel ndị na-ebu amụma ugbu a, gwa ndị amụma ahụ na-ekwu ihe sitere ha nʼuche: ‘Nụrụnụ okwu nke Onyenwe anyị. 3Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, Ahụhụ ga-adịrị ndị amụma nzuzu ndị na-agbaso mmụọ nke onwe ha, ndị ọ dịghị ihe ha na-ahụ. 4Gị Izrel, lee, ndị amụma gị niile dị ka nkịta ọhịa bi na mkpọmkpọ ebe. 5Unu arịgobeghị na oghere jupụtara na mgbidi maọbụ rụzie mgbidi aja ndị ahụ maka nchekwa ndị Izrel ka o nwee ike kwudosie ike nʼụbọchị agha nke Onyenwe anyị. 6Ọhụ ha bụ ụgha, otu a, ịjụ ase ha bụkwa ụgha, ha na-asị, “ Onyenwe anyị kwupụtara,” ebe Onyenwe anyị ezipụghị ha, ha na-agakwa nʼihu na-atụ anya ka o mezuo okwu ha. 7Ọ bụghị ọhụ ụgha ka unu hụrụ, ọ bụghịkwa okwu ịjụ ase ụgha ka unu kwuru, mgbe unu na-asị, “Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara,” nʼagbanyeghị na mụ onwe m ekwughị okwu?

8“ ‘Nʼihi ya, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, aga m ebibi unu nʼihi okwu ụgha na ọhụ ụgha unu niile. Edoola m onwe m imegide unu, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri. 9Aka m ga-emegide ndị amụma niile ahụ bụ ndị na-ahụ ọhụ ụgha, na-agbakwa afa ụgha. Ha a gaghị esonye na otu ọgbakọ ndị m maọbụ bụrụ ndị agụnyekọrọ nʼakwụkwọ ndekọta aha ụlọ nke Izrel, ha agaghị abakwa nʼala ndị Izrel. Mgbe ahụ unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị.

10“ ‘Nʼihi na ha eduhiela ndị m, mgbe ha na-asị, “Udo,” ebe udo na-adịghị, nʼihi na mgbe e wuru mgbidi na-esighị ike, ndị amụma ndị a jara ha mma, werekwa nzu techie ya. 11Ya mere, gwa ndị ahụ jiri nzu techie mgbidi ahụ na ọ ga-ada. Oke mmiri ozuzo nke ga-ezobiga oke ga-ezo, aga m ezitekwa mkpụrụ mmiri dị ukwuu nke ga-ada, na oke ifufe nke ga-akwada ya. 12Mgbe mgbidi ahụ dara, ndị mmadụ ọ gaghị ajụ, “Olee ebe mgba ọcha ahụ ị ji techie ya dị?”

13“ ‘Ya mere, Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, aga m eji oke ifufe nke ọnụma m, na oke mmiri ozuzo nke iwe m, ma oke akụmmiri nke oke iwe m mebie ya. 14Aga m akwada mgbidi ahụ unu tere nzu, aga m emekwa ka ọ daruo ala nke ga-eme ka ahụ ntọala ya anya; ọ ga-adakwasịkwa unu, gwepịa unu. Mgbe ọ dara ọ ga-egbuchapụ unu niile; unu ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị. 15Otu a ka m ga-esi gosipụta iwe m nʼebe mgbidi ahụ nọ, na nʼahụ ndị ahụ ji nzu techie ya. Aga m asị unu, “Mgbidi ahụ adịghịkwa, otu a ka ọ dịkwa ndị ahụ ji nzu techie ya, 16bụ ndị amụma Izrel ndị ahụ buru amụma nye Jerusalem, ndị hụkwara ya ọhụ udo mgbe udo na-adịghị, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.” ’

17“Ma ugbu a, gị nwa nke mmadụ, chee ihu nʼebe ụmụada ndị unu nọ, ndị nke na-ebu amụma dị ka o si si ha nʼobi pụta. Buo amụma megide ha 18sị, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, Ahụhụ dịrị ndị inyom na-adụnye ọgwụ mgbaasị na nkwoji aka ha na-emekwa akwa mgbokwasị nke ikpuchi isi maka ndị mmadụ dị iche iche, iji raata ha. Unu si aṅaa chee na unu ga-echebe ndụ unu mgbe unu buru ụzọ mee ka ndị m maa nʼọnya? 19Unu emeela ka m ghara ịdị nsọ nʼetiti ndị m, nʼihi mkpoju aka ọka balị na iberibe achịcha ole na ole. Nʼihi ya, unu emeela ka ha nwụọ bụ ndị na-ekwesighị ịnwụ anwụ. Unu edebekwala ha ndụ bụ ndị na-ekwesighị ịdị ndụ, site nʼokwu ụgha unu na-agwa ndị m, bụ ndị na-aṅa ntị nʼokwu ụgha.

20“ ‘Nʼihi nke a, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, ana m emegide ọgwụ mgbaasị niile nke unu ji achụ nta mkpụrụobi ndị m dịka nnụnụ. Aga m adọwapụ ha site nʼaka unu, napụtakwa ndị m, bụ ndị unu ji nʼọnya dị ka nnụnụ e tinyere nʼụlọ akpara akpa. 21Aga m adọwa akwa mgbokwasị ọgwụ unu, napụta ndị m site nʼaka unu. Ha agaghị amakwa nʼọnya nke ike unu ọzọ. Nʼụzọ dị otu a unu ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị. 22Nʼihi na ụgha unu emeela ka obi ndị ezi omume daa mba, mgbe ọ na-abụghị uche m na ihe dị otu a ga-eme. Ma unu emeela ka obi ndị ajọ omume sie ike site na nkwa ogologo ndụ unu kwere ha, mee ka ha ghara isite nʼụzọ ọjọọ ha chegharịa ma zọpụta ndụ ha. 23Nʼihi nke a, unu agaghị ahụkwa ọhụ ụgha ọzọ, maọbụ gbaa afa. M ga-anapụta ndị nke m site nʼaka unu. Mgbe ahụ unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’ ”

Você sabia?

Falsos profetas e amuletos mágicos

  • Ezequiel compara os profetas enganadores a construtores que erguem uma parede frágil e a cobrem com cal para disfarçar sua fraqueza. Suas falsas promessas de paz são retratadas como um reboco precário que desmoronará diante de tempestades violentas, chuvas torrenciais e granizo.Fontes: o próprio texto bíblico
  • O capítulo também denuncia mulheres que praticavam adivinhações, costurando amuletos mágicos nos pulsos e confeccionando véus para manipular as pessoas. Essas práticas eram realizadas em troca de pagamentos irrisórios, descritos pelo profeta como meros punhados de cevada e pedaços de pão.Fontes: o próprio texto bíblico
  • Como consequência de seus enganos, os falsos profetas foram advertidos de que seriam excluídos do conselho do povo, riscados dos registros genealógicos de Israel e impedidos de retornar à terra.Fontes: o próprio texto bíblico

Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.

Lugares deste capítulo

  • Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículo 16

Só aparecem lugares com identificação de alta confiança (90% ou mais segundo as fontes acadêmicas reunidas pelo OpenBible). Mapa da época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa atual: © colaboradores do OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Fale com a gente

Conte de onde você lê, como a Bíblia tem te ajudado ou o que podemos melhorar. Lemos todas as mensagens.