Ezequiel 12
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.
Ihe ngosi maka ndọta nʼagha
1Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 2“Nwa nke mmadụ, i bi nʼetiti ndị na-enupu isi, ndị nwere anya ịhụ ụzọ ma ha adịghị ahụ; ndị nwere ntị ịnụ ihe ma ha adịghị anụ ihe, nʼihi na ha bụ ndị nnupu isi.
3“Ya mere, nwa nke mmadụ, kwakọtaa ngwongwo ụlọ gị maka ị ga biri nʼala ọzọ, mee nke a nʼehihie dịka ha na-ele gị anya, hapụ ụlọ gị gaa nʼebe ọzọ. Ma eleghị anya ha ga-aghọta, ọ bụ ezie na ha bụ ndị nnupu isi. 4Kwapụta ngwongwo gị nʼezi nʼehihie ka ha hụ ya. Ma hapụ ụlọ gị nʼabalị dịka ndị na-agba ọsọ ndụ si eme, mgbe ha na-amalite ije ha, nke ịga ibi nʼala ọzọ. 5Mgbe ha na-ele gị anya, gwupuo mgbidi, site na ya kwara ngwongwo gị pụọ. 6Mgbe ha nọ na-ele gị anya, bulie ibu gị, tụkwasị ya nʼubu gị, pụọ gawa nʼime ọchịchịrị, kpuchie ihu gị, ka ị ghara ihu ala ahụ anya. Nʼihi na emela m gị ihe ịrịbama nye ụlọ Izrel niile.”
7Emere m ihe e nyere m nʼiwu. Ebupụtara m ngwongwo m nʼehihie, jikọta ha maka ịgba ọsọ ndụ. Nʼanyasị, eji m aka m gwuo ọnụ na mgbidi ahụ. Ebukwasịrị m ngwongwo m nʼubu, bulie ije nʼime ọchịchịrị mgbe ha nọ na-ele m anya.
8Nʼụtụtụ echi ya, okwu Onyenwe anyị bịakwutere m, 9“Nwa nke mmadụ, ọ bụ na ụlọ Izrel ndị nnupu isi ahụ ajụbeghị gị, ‘o lee ihe ị na-eme?’
10“Gwa ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Amụma a bụ maka onyeisi nọ na Jerusalem, nʼụlọ Izrel niile nọkwa ebe ahụ.’ 11Sị ha, ‘Mụ onwe m bụ ihe ama nye unu.’
“Dịka m mere, otu a kwa ka a ga-eme nye ha. Ha ga-aga na mba ọzọ biri ka ndị a dọtara nʼagha.
12“Nwa eze nke nọ nʼetiti ha ga-amaburu ibu ya nʼubu pụọ nʼọchịchịrị, ọ ga-egwupụ mgbidi aja nke obodo site nʼebe ahụ pụọ. Ọ ga-ekpuchikwa ihu ya ka ọ ghara iji anya ya hụ obodo ahụ. 13Ma aga m eji ụgbụ m jide ya, meekwa ka ọ bịaruo Babilọn bụ ala ndị Kaldịa. Ebe ahụ ka ọ ga-anọ nwụọ, ma ọ gaghị ahụ ya anya. 14Ndị niile gbara ya gburugburu na ndị agha ya niile ka m ga-achụsa nʼala niile, ọ bụkwa mma agha ka m ga-amịpụta jiri chụọ ha ọsọ.
15“Ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, mgbe m chụsachara ha nʼetiti mba niile dị iche iche, fesaakwa ha nʼala niile. 16Ma ọ bụ mmadụ ole na ole nʼime ha ka m ga-edebe ndụ site na mma agha, na ụnwụ na ọrịa na-efe efe. Ka ha nwee ike kọọ akụkọ ihe arụ niile ha nʼetiti mba dị iche iche ebe ha gbagara ọsọ. Ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.”
17Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 18“Nwa nke mmadụ, tụọ egwu mgbe ị na-eri nri gị. Jirikwa ihe ọtụtụ tụpụta mmiri ọṅụṅụ gị, dịka a ga-asị na ọ bụ ihe ikpeazụ i nwere. 19Ị ga-asịkwa ndị bi nʼala ahụ, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu banyere ndị bi na Jerusalem, nʼala nke Izrel, sị, Ha ga-eji ụjọ rie achịcha ha, jirikwa obi ịlọ mmiri ṅụọ mmiri ha, nʼihi na a ga-ekpochapụ ihe niile dị nʼala ha, nʼihi ihe ike nke ndị bi nʼime ya. 20Obodo niile nke ndị mmadụ bi nʼime ya ga-ala nʼiyi, otu aka ahụ, ala unu niile ga-abụ ebe tọgbọrọ na nkịtị. Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe bụ Onyenwe anyị.’ ”
Ọ gaghị adị anya mmezu
21Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 22“Nwa nke mmadụ, kedụ ihe ilu a na-atụ nʼIzrel pụtara, nke na-asị ‘Ụbọchị adịla oke anya, ọhụ niile abụrụkwala ihe na-enweghị isi?’ 23Gwa ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, Aga m eme ka ilu a kwụsị, ha agaghị atụkwa ya dịka ilu nʼIzrel ọzọ.’ Kama gwa ha, ‘Nʼụbọchị ahụ adịla nso mgbe ọhụ niile ga-emezu. 24Nʼihi na agaghị enwekwa ọhụ ụgha ọzọ, maọbụ ịjụ ase ire ụtọ nʼetiti ụlọ Izrel. 25Ma mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ga-ekwu ihe m zubere. Ihe ọbụla m kwuru ga-emezu na-atụfughị oge. Nʼihi na ọ bụ nʼoge unu dị ndụ, unu ndị nnupu isi, ka m ga-emezu ihe ọbụla bụ nke m kwuru. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.’ ”
26Okwu nke Onyenwe anyị bịakwutere m, 27“Nwa nke mmadụ, lee, ụlọ nke Izrel na-asị, ‘Ọhụ niile ọ na-ahụ bụ maka ọtụtụ afọ dị nʼihu, amụma ya bụkwa maka oge na-abịa nʼihu.’
28“Nʼihi ya, gwa ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, ọ dịghịkwa okwu m nke a ga-atụfu oge ọzọ nʼime ya, ihe ọbụla m kwuru ka a ga-emezu. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.’ ”

Você sabia?
Sinais do Exílio e a Certeza do Juízo
- Ezequiel recebeu a ordem de encenar o exílio iminente como um sinal vivo para a sua comunidade. À vista do povo, ele preparou uma bagagem de exilado, abriu uma passagem na parede com as mãos ao anoitecer e carregou sua carga com o rosto coberto.Fontes: o próprio texto bíblico
- A encenação representava o destino do príncipe em Jerusalém. A profecia anunciava que ele tentaria fugir por uma brecha no muro, seria apanhado em um laço e levado cativo para a Babilônia, onde morreria sem chegar a ver a terra.Fontes: o próprio texto bíblico · Babylon · Jerusalem
- O capítulo confronta um provérbio popular entre os israelitas que afirmava que as visões falhavam e que as profecias se referiam apenas a um futuro distante. Em resposta, Ezequiel declarou que o cumprimento desses juízos era iminente e ocorreria na própria geração deles.Fontes: o próprio texto bíblico
Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.
Lugares deste capítulo
- Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículos 10, 12, 19
- Babylon · 32.543, 44.422 · versículo 13
- Chaldea · 30.962, 46.104 · versículo 13
Só aparecem lugares com identificação de alta confiança (90% ou mais segundo as fontes acadêmicas reunidas pelo OpenBible). Mapa da época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa atual: © colaboradores do OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org