Nations Bible

Ezequiel 14

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.

Okwu megide ndị na-ekpere arụsị

1Ụfọdụ nʼime ndị okenye Izrel bịakwutere m, nọdụ ala nʼihu m. 2Mgbe ahụ okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, 3“Nwa nke mmadụ, ndị ikom ndị a na-efe arụsị nʼime obi ha, ma tinyekwa ihe ịsụ ngọngọ nke ajọ omume ya nʼihu ha. Aga m ekwenye ka ha jụta m ase ọbụla? 4Ya mere, gwa ha okwu sị ha ‘Nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Mgbe onye Izrel ọbụla na-agbaso arụsị nʼobi ya, nke na-ekwekwa ka arụsị ndị a na-eduba ya na mmehie, bịakwutere onye amụma ịjụta ya ase, mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ga-aza onye ahụ dịka o si dị, ya bụ dịka ịba ụba nke arụsị ya niile si dị. 5Nʼụzọ dị otu a ka m ga-esi nwetaghachikwa obi ndị Izrel niile bụ ndị si nʼebe m nọ wezuga onwe ha, ma malite ife arụsị.’

6“Nʼihi ya, gwa ụlọ Izrel, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, Chegharịanụ! Sitenụ nʼife arụsị unu niile chigharịa, jukwanụ omume unu niile rụrụ arụ.

7“ ‘Nʼihi na onye ọbụla nʼụlọ Izrel maọbụ onye ọbụla nʼime ndị ọbịa bi nʼala Izrel, nke kewapụrụ onwe ya site nʼiso m, si otu a mee ka arụsị ọ na-efe baa ya nʼobi, nke na-etinye ihe ịsọ ngọngọ ajọ omume nʼihu ha, mechaa, gakwuru onye amụma maka isite nʼaka ya ịjụta m ase, mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ga-azaghachi ha. 8Aga m edokwa onwe m imegide ha, mee ka ha bụrụ ihe ịmaatụ na ilu nye ndị ọzọ. Aga m esitekwa nʼetiti ndị m wezuga ha. Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.

9“ ‘Ọ bụrụ na arafuo onye amụma ahụ ka o buo amụma, ọ bụ mụ onwe m bụ Onyenwe anyị rafuru onye amụma ahụ. Aga m esetipụ aka m megide ya, bipụkwa ya site nʼetiti ndị m, bụ Izrel. 10Ha ga-ata ahụhụ nʼihi mmehie ikpe ọmụma ha, dịka ikpe ọmụma dịrị onye na-ajụ ase, otu a ka ọ ga-adịkwa nye onye amụma ụgha ahụ. 11Mgbe ahụ, ụmụ Izrel agaghị esitekwa nʼiso m kpafuo ọzọ. Ha agakwaghị eji mmehie merụọ onwe ha, kama ha ga-abụ ndị m, mụ onwe m ga-abụkwa Chineke ha. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara ya.’ ”

Ikpe ọmụma aghaghị ịbịa

12Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 13“Nwa nke mmadụ, ọ bụrụ na ndị bi nʼala emehie megide m, site nʼekwesighị ntụkwasị obi ha, ọ bụrụ na m esetipụ aka m mee ka oke ụnwụ bịakwasị ha, ọ bụrụkwa na m emee ka mmadụ na anụmanụ niile dị nʼala a nwụchasịa, 14a sịkwa na Noa, Daniel na Job bi nʼetiti ya, ha ga-azọpụta naanị onwe ha nʼezi omume ha. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.

15“Asị na m eziga anụ ọhịa ọjọọ ka ha bịa bibie ala ahụ, mee ka ọ ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu meekwa ka mmadụ ọbụla ghara ị site nʼime ya gafee nʼihi anụ ọhịa ndị ahụ, 16dịka m na-adị ndụ ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, ọ bụrụkwarị na ndị ikom atọ ndị a nọ nʼebe a, ha agaghị anapụta ọ bụladị ụmụ ha ndị nwoke maọbụ ụmụ ha ndị nwanyị site nʼịla nʼiyi. Naanị ha ka a ga-azọpụta, ma ala ahụ ga-abụ ihe tọgbọrọ nʼefu.

17“Ọ bụrụ na a sị na m mere ka mma agha bịakwasị ala ahụ, m sị, ‘Ka mma agha gabiga site nʼala ahụ niile gburugburu,’ ma gbuo mmadụ na anụmanụ niile dị nʼime ya, 18dịka m na-adị ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri, a sịkwarị na ndị ikom atọ ndị a nọ nʼala ahụ, ha agaghị anapụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ha ndị inyom site nʼịla nʼiyi. Kama, ọ bụ naanị ha onwe ha ka a ga-anapụta.

19“Ọzọkwa, ọ bụrụ na m eziga oke iwe m site nʼajọ ọrịa na-efe efe, ọ bụrụ na ọrịa ahụ egbuo mmadụ na anụmanụ ha niile, 20dịka m na-adị ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri, a sịkwa na Noa, Daniel na Job bi nʼime ya, ha agaghị anapụta ụmụ ha ndị ikom maọbụ ndị inyom site nʼịla nʼiyi. Ha ga-azọpụta naanị onwe ha nʼezi omume ha.

21“Nʼihi na otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, a ga-esi aṅaa napụta ya, mgbe m zipụrụ ụzọ ikpe m anọ dị oke egwu nke na-echere Jerusalem. Ikpe ndị a bụ: mma agha na ụnwụ, anụ ọhịa ọjọọ na-adọgbu adọgbu na ọrịa na-efe efe, ka ha gbuchapụ mmadụ na anụmanụ niile dị nʼime ya. 22Ma a ga-enweta ụfọdụ ndị ga-afọdụ ndụ, bụ ụmụ unu ndị nwoke na ndị nwanyị, ndị a ga-anapụta site nʼahụhụ ndị a. Ha ga-abịakwute unu. Mgbe unu hụrụ omume ha, na obibi ndụ ha, ha ga-abụrụ unu ihe nkasiobi nʼihi na unu ga-esite na ha mata ụdị mbibi nke m mere ka ọ bịakwasị Jerusalem. 23A ga-akasịkwa unu obi mgbe unu hụrụ omume ha na obibi ndụ ha, unu ga-amatakwa na ọ bụghị nʼefu ka m mere ka ihe ndị a niile dakwasị ha.” Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.

Ilustração artística — interpretação, não registro histórico.

Você sabia?

Idolatria no Coração e Responsabilidade Pessoal

  • Quando os anciãos de Israel procuraram Ezequiel para consultar o Senhor, o profeta foi informado de que eles haviam levantado ídolos em seus corações. O texto estabelece que tanto o consulente hipócrita quanto o profeta seduzido compartilham a mesma culpa, convocando a casa de Israel a um arrependimento interior genuíno.Fontes: o próprio texto bíblico
  • Ezequiel destaca Noé, Daniel e Jó como figuras exemplares de justiça e integridade. Diante do julgamento divino sobre uma terra infiel, a passagem enfatiza a responsabilidade individual: nem mesmo a retidão desses três homens ilustres poderia salvar seus próprios filhos ou filhas, mas apenas a si mesmos.Fontes: o próprio texto bíblico · Job · Noah · Daniel
  • O capítulo descreve quatro juízos severos advertidos contra uma terra infiel: fome, feras selvagens, espada e peste. Quando essas calamidades atingissem Jerusalém, a conduta dos sobreviventes levados ao exílio demonstraria publicamente que a punição da cidade não ocorreu sem causa.Fontes: o próprio texto bíblico · Jerusalem

Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.

Lugares deste capítulo

  • Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículos 21, 22
  • Babylon · 32.543, 44.422 · versículo 22

Só aparecem lugares com identificação de alta confiança (90% ou mais segundo as fontes acadêmicas reunidas pelo OpenBible). Mapa da época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa atual: © colaboradores do OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Fale com a gente

Conte de onde você lê, como a Bíblia tem te ajudado ou o que podemos melhorar. Lemos todas as mensagens.