Nations Bible

Zechariah 12

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.

Mbibi dịrị ndị iro Jerusalem

1Nke a bụ okwu nke Onyenwe anyị banyere Izrel. Ọ bụ amụma.

Onyenwe anyị, onye gbasapụrụ eluigwe niile, onye tọrọ ntọala ụwa, na onye kpụrụ mmụọ nke dị nʼime mmadụ, ekwupụtala, sị, 2“Agaje m ime Jerusalem ka ọ bụrụ iko mmanya nke ga-aṅagharị ndị niile gbara ya gburugburu. Ha ga-agba Juda na Jerusalem gburugburu, nọbichie ụzọ ya niile. 3Nʼụbọchị ahụ, mgbe mba niile nke ụwa chịkọtara onwe ha ọnụ imegide ya, aga m eme Jerusalem ka ọ ghọọrọ mba ndị ahụ niile nkume dị ukwuu nke a na-apụghị inugharị enugharị. Ndị niile ga-agbalị inugharị ya ga-emerụ onwe ha ahụ. 4Nʼụbọchị ahụ, aga m etinye ụjọ nʼobi ịnyịnya niile, mee ka ndị na-agba ha ghọọ ndị ara,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. “Aga m asaghe anya m lekwasị ụlọ Juda nke ọma, ma aga m eme ka ịnyịnya niile nke mba niile kpuo ìsì. 5Mgbe ahụ, ndị ndu Juda ga-ekwu nʼobi ha sị, ‘Ndị Jerusalem achọtala ike nʼihi na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke ha.’

6“Nʼụbọchị ahụ, aga m eme ka ndị ndu Juda niile dịrị ka ite ọkụ, nke a dọnyere nʼebe a chịkọtara nkụ. Ha ga-adịkwa ka ọkụ na-enwu enwu, nke dị nʼetiti ukwu ọka. Ha ga-ere ọkụ nʼaka nri na nʼaka ekpe, rechapụ ndị niile bi gburugburu ha. Ma mmadụ ga-ejupụtakwa nʼime Jerusalem.

7“ Onyenwe anyị ga-ebu ụzọ zọpụta ebe obibi niile nke Juda, ime ka ugwu na nsọpụrụ nke ụlọ Devid, na nke ndị niile bi na Jerusalem ghara ịdị ukwuu karịa nke Juda. 8Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-echebe ndị bi na Jerusalem, mee ka ọ bụladị ndị na-asọ ngọngọ nʼetiti ha dịrị ike dịka Devid. Ụlọ Devid ga-adịkwa ka Chineke, dịka Mmụọ ozi Onyenwe anyị, onye na-eje nʼihu ha. 9Nʼụbọchị ahụ, aga m ebido ibibi mba ndị ahụ niile na-ebuso Jerusalem agha.

Iru ụjụ banyere onye ahụ a mapuru ahụ

10“Mgbe ahụ, aga m awụkwasị nʼụlọ Devid na ndị niile bi na Jerusalem, mmụọ nke amara na nke arịrịọ amara. Ha ga-elegidekwa m anya, bụ onye ahụ ha mapuru ahụ. Ha ga-eru ụjụ nʼihi ya, dịka mmadụ si eru ụjụ nʼihi ọnwụ nke nwa a mụrụ naanị ya. Ha ga-ebekwa akwa ilu nke ukwuu dịka mmadụ sị ebe akwa maka nwa mbụ ya. 11Nʼụbọchị ahụ, akwa a ga-akwa na Jerusalem ga-adị ukwuu, dịka akwa nke Hadad Rimọn nʼobosara ala Megido. 12Ndị ala ahụ niile ga-eru ụjụ. Ikwu ọbụla ga-eru ụjụ nke ha, ha na ndị nwunye ha. Ikwu Devid na ndị nwunye ha, na ikwu Netan na ndị nwunye ha, 13na ikwu Livayị, na ndị nwunye ha, na ikwu Shimei na ndị nwunye ha, 14na ikwu ndị ọzọ niile na ndị nwunye ha.

Artistic illustration — an interpretation, not a historical record.

Did you know?

Deliverance and Mourning in Jerusalem

  • The reference to mourning at Hadad-rimmon in the plain of Megiddo recalls the national grief over King Josiah, who was mortally wounded near that location. Megiddo's broad valley was a strategic corridor and a frequent battlefield in ancient times.Sources: Hadad-rimmon · Megiddo · the Bible text itself
  • The prophecy lists specific families in separate mourning, including the royal lineages of David and his son Nathan, as well as the priestly house of Levi. This emphasizes that profound grief and personal contemplation would encompass all strata of society, from leaders to individual households.Sources: David · Nathan · Levi (patriarch) · the Bible text itself
  • Jerusalem is described through vivid imagery, such as a heavy, immovable stone that injures anyone attempting to lift it, and a cup that intoxicates attacking armies. These metaphors underscore divine defense of the city against invading nations.Sources: Jerusalem · the Bible text itself

Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.

Places in this chapter

  • Jerusalem · 31.777, 35.234 · verses 2, 3, 5, 6, 7, 8, 9, 10, 11
  • Megiddo · Today: Tel Megiddo · 32.585, 35.184 · verse 11

Only places identified with high confidence are shown (90% or more according to the scholarly sources compiled by OpenBible). Period map: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; modern map: © OpenStreetMap contributors; places: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Talk to us

Tell us where you read from, how the Bible has helped you, or what we could improve. We read every message.