Nations Bible

Zechariah 11

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.

1Meghee ọnụ ụzọ gị niile, gị Lebanọn.

Ka ọkụ repịa osisi sida gị niile.

2Kwasie akwa ike, gị osisi junipa, nʼihi na osisi sida adaala,

nʼihi na e mebiela osisi ukwu ndị niile ahụ mabigara mma oke.

Kwasienụ akwa ike, unu osisi ook nke Bashan,

nʼihi na e gbudachala oke ọhịa ahụ!

3Gee ntị nʼụzụ akwa nke ndị ọzụzụ atụrụ,

e mebiela ebe ịta nri mara mma nke anụ ụlọ ha.

Gee ntị ka unu nụrụ olu mbigbọ nke ụmụ ọdụm,

nʼihi na e bibiela oke ọhịa nke Jọdan.

Ndị ọzụzụ atụrụ abụọ

4Ihe ndị a ka Onyenwe anyị Chineke m kwuru, “Zụọnụ igwe ewu na atụrụ ndị a ga-egbu egbu nri. 5Ndị na-azụrụ ha na-egbu ha ma ọ dịghị ahụhụ na-abịakwasị ha. Ndị na-erekwa ha na-asị, ‘Toonu Onyenwe anyị, nʼihi na abụ m ọgaranya.’ Ndị ọzụzụ ha adịghị enwe ọmịiko nʼahụ ha. 6Nʼihi na mụ onwe m agakwaghị egosi ndị ala a obi ebere.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. “Aga m ewere onye ọbụla nʼime ha nyefee nʼaka onye agbataobi ya, na nʼaka eze ha. Ha ga-ebibi ala a kpamkpam, ma mụ onwe m agaghị anapụta onye ọbụla site nʼaka ha.”

7Nʼihi ya, azụrụ m igwe ewu na atụrụ ndị ahụ a ga-egbu egbu, nke ka nke, ndị ahụ a na-emegbu emegbu. Eweere m mkpanaka abụọ, kpọọ otu nʼime ha Amara, kpọọ nke ọzọ Ịdị nʼotu. Azụkwara m igwe atụrụ ndị ahụ. 8Nʼime otu ọnwa, ewezugara m ndị ọzụzụ atụrụ atọ.

Igwe ewu na atụrụ ndị ahụ kpọkwazịrị m asị, enwezighị m ike nweere ha ndidi. 9Nʼihi ya, ekwuru m si, “Agaghị m abụkwa onye ọzụzụ atụrụ unu ọzọ. Nke ọbụla na-anwụ, ya nwụọ, ọzọ, nke na-ala nʼiyi, ya laa nʼiyi. Ka ndị fọdụrụ rie anụ ahụ ibe ha.”

10Mgbe ahụ, eweere m mkpanaka m, nke a kpọrọ Amara gbajie ya abụọ, igosi na emebiela m ọgbụgba ndụ nke mụ na ndị mmadụ gbara. 11Nʼụbọchị ahụ ka e mere ka ọgbụgba ndụ ahụ gharakwa ịdị. Mgbe ahụ, ndị ahụ a na-akpagbu nʼetiti igwe ewu na atụrụ ahụ, bụ ndị na-ele m anya matara na ọ bụ okwu Onyenwe anyị.

12Mgbe ahụ, agwara m ha, “Ọ bụrụ na ọ masịrị unu, unu kwụọ m ụgwọ ọrụ m, ọ bụrụkwa na ọ masịghị unu, deberenụ onwe unu ego unu.” Nʼihi nke a, ha gụpụtara mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ, jiri ya kwụọ m ụgwọ.

13Onyenwe anyị gwara m, “Tụpụrụ ya ọkpụ ite,” bụ ọnụahịa magburu onwe ya bụ nke ha rụrụ nʼisi m. Ya mere, eweere m iri ọlaọcha atọ ahụ tụpụrụ ya ọkpụ ite nʼụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị.

14Mgbe ahụ, agbajiri m mkpanaka m nke abụọ a na-akpọ Ịdị nʼotu, izipụta na njikọta maọbụ ịdị nʼotu dị nʼetiti Juda na Izrel adịghịkwa.

15Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara m, “Chịrịkwa ngwa ọrụ nke onye ọzụzụ atụrụ nzuzu ahụ, 16nʼihi na ana m aga ịkpọlite otu onye ọzụzụ atụrụ nke na-agaghị elekọta ụmụ atụrụ furu efu, maọbụ chọọ ndị na-etolite, maọbụ gwọọ ndị merụrụ ahụ, maọbụ nye ndị ahụ dị ike nri. Kama ọ ga-eri anụ atụrụ ndị ahụ ahụ ha dị mma, nyakapụkwa ụkwụ ha niile.

17“Ahụhụ dịrị onye ọzụzụ atụrụ ahụ na-abaghị uru,

nke na-adịghị elezi igwe ewu na atụrụ ya anya.

Ka mma agha gbupụ ya otu aka, ghụpụkwa ya anya aka nri ya.

Ka ogwe aka ya kpọnwụọkwa kpamkpam.

Otu a, anya aka nri ya ga-akpọkwa.”

Did you know?

The Two Staffs and the True Shepherd

  • The opening lament evokes celebrated regions across the region, mourning the destruction of the magnificent cedars of the Lebanon mountain range, the oak forests of Bashan, and the lush thickets along the Jordan River.Sources: the Bible text itself · Lebanon · Bashan · Jordan
  • Zechariah enacts a prophetic sign by shepherding a flock with two symbolic staffs, named Favor and Union. He eventually breaks both staffs to portray the annulment of a covenant with the nations and the fracture of brotherhood between Judah and Israel.Sources: the Bible text itself
  • When the prophet asks for his wages for pasturing the flock, he is weighed thirty pieces of silver. Following the Lord's instruction, he throws this payment to the potter in the house of the Lord.Sources: the Bible text itself

Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.

Places in this chapter

  • Lebanon · 33.540, 35.584 · verse 1
  • Bashan · 32.781, 35.935 · verse 2
  • Jordan · Today: Jordan River · 31.761, 35.558 · verse 3

Only places identified with high confidence are shown (90% or more according to the scholarly sources compiled by OpenBible). Period map: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; modern map: © OpenStreetMap contributors; places: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Talk to us

Tell us where you read from, how the Bible has helped you, or what we could improve. We read every message.