Zechariah 13
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.
Nsachapụ mmehie
1“Nʼụbọchị ahụ, a ga-emeghe isi iyi mmiri nye ụlọ Devid na ndị niile bi na Jerusalem. Ọ ga-abụ isi iyi a ga-eji sachapụ mmehie na adịghị ọcha ha niile.
2“Nʼụbọchị ahụ, otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, kwubiri, aga m ebipụ aha arụsị niile dị nʼala ahụ, a gaghị echetakwa ha ọzọ. Aga m esitekwa nʼala a wezuga ma ndị amụma ma mmụọ nke adịghị ọcha niile. 3Ọ bụrụkwa na onye ọbụla a ga nʼihu na-ebu amụma, nne na nna ndị mụrụ ya ga-asị ya, ‘Ị ghaghị ịnwụ nʼihi na i kwuola okwu ụgha nʼaha Onyenwe anyị.’ Mgbe onye dị otu a bukwara amụma, ọ bụ nne na nna ya ga-eji ùbe magbuo ya.
4“Nʼụbọchị ahụ, ihere ga-emekwa ndị amụma nʼihi ibu amụma banyere ọhụ nke ha hụrụ. Ha agaghị eyikwa uwe ajị anụ nke ndị amụma na-eyi nʼihi iduhie ndị mmadụ, 5Onye ọbụla nʼime ha ga-asịkwa, ‘Abụghị m onye amụma, onye ọrụ ubi ka m bụ, ọ bụ ihe si nʼala ka m ji azụ onwe m site na mgbe m bụ okorobịa.’ 6Ọ bụrụ na onye ọbụla ajụọ, ‘Gịnị bụ ọnya ndị a niile dị gị nʼahụ?’ Ha ga-azaghachi, ‘Ọnya ndị etipụtara m nʼụlọ ndị enyi m.’
Tigbuo onye ọzụzụ atụrụ, igwe atụrụ agbasasịa
7“Teta nʼụra, gị mma agha, imegide onye ọzụzụ atụrụ m,
na imegide nwoke ibe m, nke nọ m nso,”
otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri.
“Tigbuo onye ọzụzụ atụrụ,
igwe atụrụ ga-agbasasịkwa.
Aga m eweli aka m megide ndị dị nta.
8Nʼala ahụ niile,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya,
“Ụzọ mmadụ abụọ nʼime ụzọ atọ ka a ga-etida,
ma otu ụzọ nʼime ụzọ atọ ga-afọdụ nʼime ya.
9Otu ụzọ nʼime ụzọ atọ a fọdụrụ ka m ga-ewebata nʼime ọkụ.
Aga m eji ọkụ nụchaa ha dịka e si anụcha ọlaọcha,
jiri ọkụ nwaa ha dịka e si anwa ọlaedo.
Ha ga-akpọku aha m,
aga m azakwa ha.
Aga m asịkwa, ‘Ndị a bụ ndị m,’
Ha onwe ha ga-asịkwa, ‘ Onyenwe anyị bụ Chineke anyị.’ ”

Did you know?
Cleansing the Land and Refining the Remnant
- Zechariah foretells an opened fountain to cleanse the house of David and the inhabitants of Jerusalem from sin and impurity, alongside the complete removal of idols and deceptive spirits from the land.Sources: the Bible text itself · David · Jerusalem
- The passage describes false prophets becoming so disgraced that they will discard their traditional hairy mantles and claim to be ordinary field laborers to avoid being recognized.Sources: the Bible text itself
- The chapter depicts a shepherd being struck with a sword and the flock scattering, after which a remaining third of the people is refined through trial like silver and gold.Sources: the Bible text itself
Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.
Places in this chapter
- Jerusalem · 31.777, 35.234 · verse 1
Only places identified with high confidence are shown (90% or more according to the scholarly sources compiled by OpenBible). Period map: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; modern map: © OpenStreetMap contributors; places: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org