Romans 13
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.
Irubere ndị na-achị achị isi
1Ka onye ọbụla doo onwe ya nʼokpuru ndị na-achị achị, nʼihi na ikike ọchịchị ọbụla agaghị adị ma ọ bụrụ na Chineke akwadoghị ya. Ọ bụkwa Chineke tọrọ ntọala ikike ọchịchị niile e nwere. 2Ya mere, onye ọbụla na-enupu isi nʼokpuru ọchịchị, na-emegide ihe Chineke hiwere, ndị na-eme nke a ga-ewetara onwe ha ikpe ọmụma. 3Ndị na-eme ezi ihe anaghị atụ egwu ndị nọ nʼọchịchị, kama ndị na-atụ ha egwu bụ ndị na-eme ihe ọjọọ, ya mere ọ bụrụ na ị chọghị ịtụ ndị na-achị achị egwu, mee ihe dị mma, ha ga-etokwa gị. 4Nʼihi na ọ bụ onyeozi Chineke maka ọdịmma nke gị, ma ọ bụrụ na unu mere ihe na-adịghị mma, tụọnụ egwu, nʼihi na onye na-achị achị nwere ezi nkwado ịta onye mere ihe ọjọọ ahụhụ. Ọ bụ onyeozi Chineke bụrụkwa onye na-eji ọnụma na-ata ndị mmebi iwu ahụhụ. 5Ya mere unu kwesiri irubere ndị na-achị achị isi, ọ bụghị naanị maka ahụhụ dịrị ndị nnupu isi, kama nʼihi akọnuche.
6Ọ bụkwa nke a kpatara unu ji na-atụ ụtụ isi nke taks, nʼihi na ndị na-achị achị na-ejere Chineke ozi mgbe ha na-aga nʼihu nʼezi ọchịchị. 7Kwụghachinụ onye ọbụla ihe unu ji ha nʼụgwọ, ọ bụrụ na unu ji ụgwọ ụtụ taks, kwụọnụ ya, ọ bụrụkwa ụgwọ ụtụ isi nke akụnụba unu, ka unu ji, kwụọnụ ya. Ọ bụrụ na onye ọbụla kwesiri ka a sọpụrụ ya, sọpụrụnụ onye dị otu a, ọ bụrụkwa na onye ọbụla kwesiri ka a kwanyere ya ugwu kwanyerenụ ya ugwu.
Ịhụnanya nʼihi na oge dị nso
8Kwụọnụ ụgwọ niile unu ji. Ka ụgwọ unu ga-ejide ndị mmadụ bụrụ ụgwọ ịhụ ha nʼanya. Nʼihi na mgbe ị na-ahụ ndị mmadụ nʼanya, ị na-emezu ihe niile iwu chọrọ. 9Iwu niile e nyere, “Gị akwala iko,” “Egbula mmadụ,” “Ezula ohi,” “Enwela anya ukwu nʼihe mmadụ ibe gị nwere,” nakwa iwu ndị ọzọ niile e nyere ka a chịkọtara nʼotu nke a sịrị: “Hụ mmadụ ibe gị nʼanya dịka onwe gị.” 10Ịhụnanya adịghị echere onye agbataobi ya echiche ọjọọ, ya mere ịhụnanya bụ idebezu iwu niile.
Oge ahụ dị nso
11Ihe ọzọ mere o ji dị mkpa ibi ezi ndụ bụ nke a. Unu maara na oge ahụ anyị na-ele anya ya abịala nso. Ya mere, sitenụ nʼụra bilie, nʼihi na nzọpụta anyị adịla nso ugbu a karịa mgbe ahụ anyị kweere na mbụ. 12Abalị ekeela abụọ, ọ fọdụrụ ntakịrị ugbu a, ọ bụrụ ụtụtụ. Ka anyị yipụ uwe ọrụ nke ọchịchịrị, ma yikwasị ngwa agha nke ìhè. 13Bụrụnụ ndị dị ọcha, dịka ndị na-akpagharị nʼehihie. Ọ bụghị nʼịgba egwu ruru unyi, maọbụ nʼịṅụbiga mmanya oke, ọ bụghị nʼịkwa iko, na imefe ihe ụwa oke. Ọ bụghị nʼesemokwu, na ekworo. 14Kama yirinụ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịka uwe. Unu enyekwala ahụ unu ohere inweta ihe niile nke na-agụ ya.
Did you know?
Authority, Taxes, and the Debt of Love
- This chapter states that there is no authority except that which is from God, and that the authorities which exist have been appointed by God. Whoever resists authority is described as opposing what God has set in place and as bringing judgment on themselves. Rulers, it says, are not a terror to good conduct, but to bad.Sources: the Bible text itself
- The ruler is called God’s servant for the good of those addressed, and an agent of retribution to the wrongdoer who does not carry the sword in vain. Submission is presented as necessary not only to avoid punishment but also as a matter of conscience, which is also why taxes are paid to authorities who devote themselves to their work. Each person is to give taxes, revenue, respect, and honor to those to whom they are due.Sources: the Bible text itself
- The only debt that is to remain is love for one another, for whoever loves his neighbor has fulfilled the law. The commandments against adultery, murder, theft, and coveting, and any other commandments, are summed up in the decree to love one’s neighbor as oneself, because love does no wrong to its neighbor. Readers are told to live this way awake to the hour, laying aside deeds of darkness and clothing themselves with the Lord Jesus Christ, since the night is nearly over and the day has drawn near.Sources: the Bible text itself
Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.
Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org