Romans 12
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.
Aja dị ndụ
1Ya mere, ụmụnna m, eji m obi ebere Chineke na-arịọ ka unu chee anụ ahụ unu dịka aja dị ndụ, dịkwa nsọ, ma bụrụkwa nke na-atọ Chineke ụtọ, nke bụkwa ofufe nke ime mmụọ unu. 2Unu eyila ụwa nke a, kama bụrụnụ ndị enwoghara site nʼịgbanwe uche unu. Mgbe ahụ, unu ga-enwe ike nwapụta ihe bụ uche Chineke na ihe ọ na-achọ, nke bụ ezi ihe, nke na-atọ ya ụtọ na nke zukwara oke.
Ọrụ obi umeala
3Dịka onyinye amara e nyere m siri dị, ana m adọ onye ọbụla nʼime unu aka na ntị sị, Unu atụkwasịla uche nʼechiche banyere onwe unu karịa ka o si kwesi. Kama, jirinụ obi dị umeala lee onwe unu anya dịka okwukwe Chineke nyere unu ha. 4Dịka anyị niile nʼotu nʼotu si nwe anụ ahụ nke nwere akụkụ dị iche iche, bụ akụkụ ndị na-arụ ọrụ dị iche iche, 5nʼotu aka ahụ, nʼime Kraịst anyị bụ otu, nʼagbanyeghị na anyị bụ akụkụ dị iche iche nke otu anụ ahụ. E jikọtara anyị niile nʼotu nʼotu nye ibe anyị. 6Anyị nwere onyinye dị iche iche nke e sitere nʼamara nye anyị, ọ bụrụ na onye ọbụla nwere onyinye ibu amụma, ya buo ya dịka okwukwe o nwere ha. 7Ọ bụrụ ije ozi, ya jee ozi, ya bụrụkwanụ izi ihe, ya zie ihe. 8Ka onye nwere onyinye ịgbaume, gbaa ndị ọzọ ume, ya bụrụkwanụ inyeaka, ka onye nwere onyinye a site nʼafọ ofufu mee ya, ọ bụrụ ịbụ onyendu, ka onye ahụ duo site nʼikpachapụ anya, ya bụrụkwanụ ime ebere, ka onye ahụ jiri obi ụtọ na-eme ya.
Ịhụnanya
9Ka ịhụnanya bụrụ nke ihu abụọ nʼadịghị na ya, kpọọ ihe ọjọọ asị, jidesie ihe dị mma ike. 10Hụrịtanụ onwe unu nʼanya, dịka ụmụ nke otu nna. Ka ihe ibe unu na-eme na-atọ unu ụtọ. Na-asọpụkwaranụ ibe unu karịa otu ha si asọpụrụ unu. 11Unu abụla ndị umengwụ nʼọrụ unu. Kama werenụ mmụọ na obi na-anụ ọkụ na-ejere Onyenwe anyị ozi mgbe niile. 12Nweenụ obi aṅụrị nʼime olileanya, nweenụ ntachiobi nʼime nsogbu, na-ekpekwanụ ekpere mgbe niile. 13Na enyetụnụ ụfọdụ ndị nsọ ihe site nʼihe unu nwere iji gboo mkpa dịrị ha. Na-elekọtakwanụ ndị ọbịa anya nke ọma.
14Gọzienụ ndị na-akpagbu unu, gọzienụ ha, unu abụkwala ha ọnụ. 15Mgbe ndị ọzọ na-aṅụrị ọṅụ, soronụ ha ṅụrịa ọṅụ. Mgbe ha nọ nʼiru ụjụ, soronụ ha ruo ụjụ. 16Na-ebinụ nʼudo. A bụla onye mpako, unu na ndị ọnọdụ ha dị ala na-enwe mmekọrịta, echekwala na ị maara ihe niile.
17Ejikwala ihe ọjọọ akwụghachi ihe ọjọọ e mere gị. Kama, na-echenụ otu unu ga-esi mee ihe dị mma nʼanya mmadụ niile. 18Dịka ike gị niile ha, mee ka gị na onye ọbụla biri nʼudo. 19Ndị enyi m, unu abọla ọbọ, kama hapụrụnụ Chineke ọrụ ịbọtara unu ọbọ. Nʼihi na e dere ya, “Ịbọ ọbọ dịrị m, aga m akwụghachi,” ka Onyenwe anyị kwuru. 20Ma otu ọ dị,
“ọ bụrụ na agụụ na-agụ onye iro gị, were nri zụọ ya,
ọ bụrụkwa na akpịrị na-akpọ ya nkụ, nye ihe ọṅụṅụ ka ọ ṅụọ,
mgbe ị na-eme nke a, ị na-agụkwasị icheku ọkụ na-ere ere nʼisi ya.”
21Unu ekwela ka ihe ọjọọ merie unu, kama werenụ ezi ihe merie ihe ọjọọ.

Did you know?
Living Sacrifice and One Body
- Romans 12 urges the brothers, on account of God’s mercy, to offer their bodies as living sacrifices, holy and pleasing to God, and calls this their spiritual service of worship. That image of a sacrifice that remains alive stands beside the appeal not to be conformed to this world, but to be transformed by the renewing of the mind, so as to test and approve what is God’s good, pleasing, and perfect will.Sources: the Bible text itself
- The community is compared to one body with many members that do not all have the same function: in Christ the many are one body, and each member belongs to the others. Different gifts are traced to the grace given—prophecy in proportion to faith, serving, teaching, encouraging, generous giving, diligent leading, and cheerful mercy—while each person is told to think with sober judgment, according to the measure of faith God has given, and not more highly than he ought.Sources: the Bible text itself
- The chapter forbids repaying evil for evil and taking vengeance, telling the beloved to leave room for God’s wrath and, if possible on their part, to live at peace with everyone. It appeals to what is written—that vengeance belongs to the Lord, who will repay, and that a hungry enemy should be fed and a thirsty one given a drink, which will heap burning coals on his head—and it ends by urging them not to be overcome by evil, but to overcome evil with good.Sources: the Bible text itself
Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.
Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org