Romans 14
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.
Ndị dị ike na ndị dara mba
1Nabatanụ ndị okwukwe ha na-esighị ike nʼetiti unu. Ma ọ bụghị nʼihi ise okwu banyere ihe ntule nke obi. 2Otu onye nwere okwukwe iri ihe niile, ma onye na-adịghị ike nʼokwukwe, na-eri naanị ahịhịa nri. 3Onye ahụ na-eri ihe niile e kwesighị ileda onye jụrụ iri ya anya. Otu a kwa, onye ahụ nke nʼadịghị eri ihe niile ekwesighị ịma onye na-eri ihe ndị a ikpe. Nʼihi na Chineke anabatala onye ahụ. 4Onye ka ị bụ i ji na-ekpe odibo onye ọzọ ikpe? Onye ọ dịrị ikpebi ma odibo ya ọ na-emezi emezi ma ọ dịghị emezi bụ nna ya ukwu. Ma odibo ahụ aghaghị iguzosi ike nʼihi na Onyenwe anyị pụrụ ime ka o guzosie ike.
5Otu onye nwere ike na-eche na otu ụbọchị kacha ndị ọzọ na ịdị nsọ, onye nke ọzọ nwekwara ike na-eche na ụbọchị niile bụ otu ihe, ma o kwesiri ka onye ọbụla kpebiere onwe ya. 6Onye ọbụla na-eche nʼotu ụbọchị bụ nke pụrụ iche, na-eme nke a nye Onyenwe anyị. Onye ọbụla na-eri otu ihe na-eri ya nʼihi Onyenwe anyị. Ma onye na-adịghị eri otu ihe ahụ na-eme kwa nke a nye Onyenwe anyị. Ma na-enyekwa Chineke ekele. 7Nʼihi na o nweghị onye nʼime anyị na-adịrị naanị onwe ya ndụ, o nwekwaghị onye nʼime anyị na-anwụrụ naanị onwe ya ọnwụ. 8Ọ bụrụ na anyị adịrị ndụ, anyị dị ndụ nye Onyenwe anyị; ọ bụrụkwa na anyị anwụọ, anyị nwụrụ nye Onyenwe anyị; ya mere ma anyị dị ndụ ma anyị nwụrụ anwụ, anyị bụ nke Onyenwe anyị. 9Ọ bụ nʼihi nke a ka Kraịst ji nwụọ, ma biliekwa, ka ọ bụrụ Onyenwe nke ndị dị ndụ na nke ndị nwụrụ anwụ.
10Ma gị onwe gị, gịnị mere i ji ekpe nwanna gị ikpe? Gịnị mekwara i ji eleda ya anya? Nʼihi na anyị niile ga-eguzo nʼotu nʼotu nʼihu oche ikpe Chineke. 11E dere ya,
“ ‘Nʼezie, dịka m na-adị ndụ,’ ka Onyenwe anyị kwuru,
‘ikpere niile ga-egbu nʼihu m;
ire niile ga-ekwupụtakwa Chineke.’ ”
12E, anyị niile nʼotu nʼotu ga-aza ajụjụ banyere ndụ anyị nʼihu Chineke.
A kwadala nwa nna gị
13Ya mere, ka anyị kwụsị ikperịta onwe anyị ikpe, kama kpebie nʼime obi gị na i gaghị edochiri nwanna gị ihe ga-eme ka ọ sụọ ngọngọ maọbụ ihe mgbochi nʼụzọ. 14Dịka onye nọ nʼime Onyenwe anyị Jisọs, o doro m anya nke ọma na o nweghị ihe ọbụla na-adịghị ọcha na nke onwe ya. Ma ọ bụrụ na onye ọbụla na-ahụta ihe ọbụla dịka ihe na-adịghị ọcha, nye onye dị otu a, ihe ahụ adịghị ọcha. 15Ọ bụrụkwa na ihe ị na-eri na-ewute nwanna gị, ị naghị egosi na ị hụrụ ya nʼanya. Ekwela ka nri ị na-eri bụrụ ihe ga-ewetara nwanna gị ịla nʼiyi, nʼihi na cheta na ọ bụkwa nʼihi ya ka Kraịst jiri bịa nwụọ. 16Ekwela ka ihe ọma gị bụrụ nke a ga-akpọ ajọọ ihe. 17Nʼihi na alaeze Chineke abụghị oriri na ọṅụṅụ kama ọ bụ ezi omume, na udo na ọṅụ nʼime Mmụọ Nsọ. 18Nʼihi na onye ọbụla na-efe Kraịst nʼụzọ dị otu a, na-eme ihe na-atọ Chineke ụtọ, ụmụ mmadụ na-anabatakwa ya.
19Ka ihe na-agụsị gị agụụ ike bụrụ ime ihe ga-eweta udo, ya na ime ihe nʼụzọ a ga-esi mee ka e wulie ndị ọzọ elu. 20Emebikwala ọrụ Chineke nʼihi nri; nri niile dị ọcha, ma o kwesighị ka onye ọbụla rie ihe ga-eme ka onye ọzọ sụọ ngọngọ. 21Ọ ga-akara gị mma ka ị hapụ iri anụ maọbụ ịṅụ mmanya ma ọ bụkwanụ ime ihe ọbụla ga-eme ka nwanna gị sụọ ngọngọ.
22Ya mere, ka okwukwe i nwere banyere ihe ndị a bụrụ nke dị nʼetiti gị na Chineke. Ngọzị na-adịrị onye ọbụla nke na-adịghị ama onwe ya ikpe site nʼihe ọ nabatara. 23Ma onye ọbụla na-eri ihe ọbụla site nʼobi abụọ bụ onye ikpe mara, nʼihi na ọ jighị okwukwe rie ya, nʼihi na ihe ọbụla a na-esiteghị nʼokwukwe mee bụ mmehie.
Did you know?
Food, days, and not judging one another
- This chapter links a weak faith to concrete choices: one person has faith to eat all things, while another, who is weak, eats only vegetables, and one person regards a certain day above the others, while someone else considers every day alike. The one who eats everything must not belittle the one who does not, and the one who does not eat must not judge the one who does, for God has accepted him.Sources: the Bible text itself
- Whether someone eats or abstains, or observes a special day, the chapter says each does so to the Lord and gives thanks to God. No one lives or dies to himself alone: if we live, we live to the Lord, and if we die, we die to the Lord, for Christ died and returned to life to be Lord of both the dead and the living.Sources: the Bible text itself
- The chapter states a personal conviction that nothing is unclean in itself, but that if anyone regards something as unclean, then for that person it is unclean. It is better not to eat meat or drink wine than to cause a brother to stumble, since the kingdom of God is not a matter of eating and drinking, but of righteousness, peace, and joy in the Holy Spirit.Sources: the Bible text itself
Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.
Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org