Rute 3
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.
Rut ejekwuru Boaz
1Otu ụbọchị, Naomi, nne di Rut, gwara ya okwu sị, “Nwa m nwanyị, ọ bụ na o rubeghị mgbe m ga-achọtara gị ụlọ nke aka gị, ebe a ga-anọ lekọtazie gị anya nke ọma? 2Ọ bụ na Boaz, onye gị na ụmụ agbọghọ ya so rụọ ọrụ ịchịkọta ọka abụghị onye agbụrụ anyị? Lee, nʼabalị taa ka ọ ga-afụcha ọka balị nʼebe ịzọcha ọka. 3Ugbu a, gaa saa ahụ gị, teekwa mmanụ isi ụtọ, yirikwa uwe mara mma. I mesịa, gaa nʼebe ịzọcha ọka, ma ekwekwala ka ọ hụ gị, tutu ruo mgbe o risiri nri ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ. 4Leziekwa anya chọpụta ebe ọ ga-edina rahụ ụra. Mgbe ị maara na ọ rahụla ụra nke ọma, gaa kpughepụ akwa o ji kpuchie ụkwụ ya, dinaakwa ala nʼebe ahụ. Ọ ga-agwa gị ihe ị ga-eme.”
5Rut zara sị, “Aga m eme ihe ọbụla ị sị m mee.” 6Ya mere, Rut pụrụ nʼabalị ahụ gaa nʼebe ịzọcha ọka ahụ, meekwa dịka nne di ya gwara ya.
7Mgbe Boaz risiri nri ma ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ, mmụọ ya dịkwa mma, ọ gara ka ọ dinaa ala na nsọtụ ebe atụkọtara akpa ọka. Rut jiri nwayọọ gaa nʼebe ahụ, kpughepụ akwa o ji kpuchie ụkwụ ya abụọ, dina nʼakụkụ ụkwụ ya. 8Nʼetiti abalị Boaz kụjara teta na mberede, tụgharịa, ma lee o nwere nwanyị dina nʼala ala ụkwụ ya.
9Ọ jụrụ ya sị, “Ị bụ onye?”
Rut zara ya sị, “Abụ m Rut, ohu gị nwanyị, onyenwe m. Were ọnụ ọnụ akwa gị kpukwasị m, nʼihi na ị bụ onye agbụrụ mgbapụta m dị nso.”
10Boaz zara sị ya, “ Onyenwe anyị gọzie gị, nwa m nwanyị. Ịhụnanya i gosiri ugbu a akarịala nke i gosiri na mbụ, nʼihi na i gbasoghị ụmụ okorobịa, ma ha bụ ọgaranya maọbụ ogbenye. 11Ma ugbu a, nwa m nwanyị, atụla ụjọ. Aga m emezuru gị dịka i si rịọọ, nʼihi na mmadụ niile maara na ị bụ onye nwere ezi agwa. 12Ọ bụ ezie na m bụ onye mgbapụta dị nso nke ezinaụlọ anyị, ma o nwere onye ọzọ dị ezi nso karịa m. 13Nọdụ nʼebe a nʼabalị a. Nʼụtụtụ, ọ bụrụ na onye ahụ ekwere imezu ọrụ ya dịka onye mgbapụta, ya rụzuo ya. Ọ bụrụ na o kwere, ọ dị mma, ọ bụrụkwanụ na o kweghị, dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, aga m emezu ya. Ugbu a, dinara ala ruo ụtụtụ.”
14Ya mere, Rut dinara nʼụkwụ ya ruo ụtụtụ. Ma chi abọzibeghị nke ọma mgbe o si nʼebe ahụ bilie nʼihi na Boaz sịrị ya, “Ekwela ka onye ọbụla mata na nwanyị bịara nʼebe ịzọcha ọka.”
15O gwakwara Rut okwu sị ya, “Chịta akwa mgbokwasị gị, gbasaa ya.” Ya mere Rut gbasara akwa ya, Boaz manyere ya ọtụtụ ọka balị isii, bokwasị ya Rut, onye buuru ya banye nʼime obodo.
16Mgbe Rut bịakwutere nne di ya, Naomi jụrụ ya sị, “Nwa m nwanyị, olee otu ihe si gaa?”
Rut gwara ya ihe niile Boaz meere ya, sị, 17“Ọ manyeere m ọtụtụ ọka balị isii ndị a si m, ‘O kwesighị ka ị gbara aka lakwuru nne di gị.’ ”
18Naomi zara si ya, “Chere, nwa m nwanyị, ruo mgbe ị ga-ahụ otu okwu a ga-esi bie. Nwoke a agaghị ezu ike tutu ruo mgbe o kwubiri okwu a taa.”

Você sabia?
Rute na Eira
- A debulha e a limpeza da cevada costumavam ser feitas ao entardecer, quando os ventos ajudavam a separar o grão da palha. Proprietários como Boaz passavam a noite na eira para dormir perto dos montes de cereal colhido e proteger a colheita.Fontes: o próprio texto bíblico
- Rute pediu a Boaz que estendesse a ponta de sua capa sobre ela, um gesto que simbolizava proteção e casamento segundo o costume do resgatador familiar. Boaz elogiou seu caráter e lealdade por não procurar homens mais jovens.Fontes: o próprio texto bíblico · Boaz
- Embora Boaz fosse um parente rico de Noemi e de seu falecido filho Malom, ele explicou que havia outro familiar com parentesco mais próximo, o qual tinha a prioridade legal no dever de resgate.Fontes: o próprio texto bíblico · Boaz · Ruth
Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.
Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org