Rute 2
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.
Rut ezute Boaz
1Ma Naomi nwere otu nwanne di ya, onye bara ụba, bụrụkwa onye a maara nke ọma, onye si nʼagbụrụ Elimelek. Aha nwoke a bụ Boaz.
2Rut onye Moab, gwara Naomi okwu sị ya, “Kwere ka m gaa nʼubi ebe a na-aghọ ọka, ka m lee ma m ga-achọta ihuọma nʼihu ndị na-aghọ ọka, ndị ga-ekwere ka m tụtụkọta ọka ndị ha hapụrụ.”
Naomi zara sị ya, “Ọ dị mma nwa m, gaa.” 3Ya mere, Rut pụrụ gaa na-atụtụ ọka nʼazụ ndị na-ewe ihe ubi. Ma dịka ihe si dị, Rut chọpụtara na ubi ọ na-atụtụ ọka bụ ubi Boaz, onye si nʼagbụrụ Elimelek.
4Nʼoge ahụ, Boaz nʼonwe ya si na Betlehem bịarute nʼubi ahụ, kelee ndị ahụ na-aghọ mkpụrụ nʼubi sị ha, “ Onyenwe anyị nọnyere unu.”
Ha niile zakwara sị ya, “ Onyenwe anyị gọzie gị.”
5Mgbe Boaz hụrụ Rut, ọ jụrụ onyeisi ndị ọrụ ubi ya sị, “Onye ka nwanyị a bụ?”
6Onye nlekọta ọrụ ubi ahụ zaghachiri, “Ọ bụ onye Moab ahụ so Naomi lọta. 7Ọ sịrị, ‘Biko kwere ka m soro ndị ọrụ nʼazụ tụtụkọtaa ukwu ọka ha hapụrụ.’ Kemgbe ụtụtụ ọ bịara, ọ kwụsịbeghị ọrụ ya karịakwa naanị nwa mgbe nta o zuru ike nʼokpuru ndo.”
8Ya mere, Boaz gwara Rut okwu sị ya, “Nwa m nwanyị, gee m ntị. Agakwala ịtụtụ ọka nʼubi ọzọ, esitekwala nʼebe a pụọ. Soro ụmụ agbọghọ na-ejere m ozi nọdụ nʼebe a. 9Lezie anya nʼubi ebe ndị ikom na-ewe ihe ubi, ma soro ụmụ agbọghọ ndị a. Enyela m ndị ikom ndị a iwu ka ha ghara ịmetụ gị aka. Mgbe ọbụla agụụ mmiri gụrụ gị, gaa nʼite mmiri ndị ahụ ndị ikom gbanyere mmiri kuru mmiri ṅụọ.”
10Mgbe Boaz na-agwa ya okwu, Rut hulatara isi ya ala. Emesịa o kwuru sị, “Gịnị mere m ji chọta ụdị amara dị otu a nʼebe ị nọ, na ị hụtara m, ebe ị maara na m bụ naanị onye mba ọzọ?”
11Boaz zara sị ya, “Anụla m ihe niile i meere nne di gị site nʼoge di gị nwụrụ, na otu i si hapụ nne gị na nna gị, na ala ebe amụrụ gị, bịa nʼebe a ibi nʼetiti ndị ị na-amaghị na mbụ. 12Ka Onyenwe anyị kwụghachi gị ụgwọ ihe ọma ndị a i mere. Ka Onyenwe anyị onye bụ Chineke Izrel, onye ị gbabara nʼokpuru nku ya izere ndụ kwụghachi gị nkwụghachi dị ukwu nʼihi ezi ọrụ gị niile.”
13Rut zara sị ya, “Ka m gaa nʼihu na-achọta amara nʼebe ị nọ, onyenwe m. Nʼihi na ị kasịela m obi, gwakwa m, odibo nwanyị gị, okwu dị nro. Ọ bụ ezie na m abụghị otu nʼime ndị odibo nwanyị gị.”
14Mgbe oge iri nri ruru, Boaz sịrị ya, “Bịa nso nʼebe a, were ụfọdụ nri rie, sunyekwa achịcha gị nʼime mmanya viniga.”
Mgbe o soro ndị ahụ na-ewe ihe ubi nọdụ ala iri ihe, o nyere ya ụfọdụ ọka a hụrụ nʼọkụ. O riri, rijuo afọ ma nri e nyere ya fọdụrụ. 15Mgbe o biliri ịchịkọtakwa ọka, Boaz nyere ụmụ okorobịa ya iwu, “Hapụnụ ya ka ọ chịkọta ọka ọ bụladị nʼetiti ukwu ọka ndị guzo eguzo, unu agwala ya okwu ihere ọbụla. 16Unu sitekwa nʼukwu ọka mịpụtara ya ụfọdụ tụsara ya nʼala ka ọ tụtụrụ. Unu abarala ya mba.”
17Ya mere, Rut tụtụrụ ọka nʼubi ahụ ruo oge anyasị. Mgbe ọ fuchasịrị ọka balị niile ọ tụtụtara, o nwetara ihe nwere ike iru otu bushel. 18O buuru ya baa nʼime obodo, bunye ya nne di ya, nyekwa ya nri o rifọrọ mgbe o rijuchara afọ.
19Nne di ya jụrụ ya, “Ebee ka ị tụtụrụ ọka taa? Ebee ka ị rụrụ ọrụ? Ka nwoke ahụ hụtara gị bụrụ onye a gọziri agọzi.”
Rut kọọrọ nne di ya banyere onye ahụ ọ rụrụ ọrụ na nke ya. Ọ sịrị, “Aha nwoke mụ na ya rụrụ ọrụ bụ Boaz.”
20Mgbe ahụ Naomi zara nwunye nwa ya sị, “Onye Onyenwe anyị gọziri ka ọ bụ, onye na-ahapụbeghị igosi ebere ya nye ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ. Nwoke a bụ otu nʼime ndị agbụrụ anyị, otu onye nʼime ndị onye mgbapụta anyị.”
21Mgbe ahụ Rut, onye Moab sịrị, “Ihe ọ sịkwara m bụ, ‘Nọnyere ndị ọrụ m tutu ruo mgbe ha ghọchara ọka niile dị nʼubi m.’ ”
22Naomi sịrị Rut, nwunye nwa ya, “Nwa m nwanyị, ọ kaara gị mma ime dịka o kwuru. Soro ụmụ agbọghọ nọ nʼubi ya nʼazụ tụtụọ ọka ị na-atụtụ, nʼihi na nʼubi onye ọzọ, e nwere ike imerụ gị ahụ.”
23Ya mere, Rut sogidere ụmụ agbọghọ Boaz na-atụtụ ọka, tutu ruo ọgwụgwụ ịghọ ọka balị na wiiti. Ya na nne di ya bigidekwara.

Você sabia?
Rute colhe nos campos de Boaz
- Belém situava-se na região montanhosa de Judá, e os vales férteis a leste serviam como campos agrícolas onde Rute recolhia as espigas de cevada deixadas pelos ceifeiros.Fontes: Bethlehem · Ruth · o próprio texto bíblico
- Boaz era um proprietário próspero em Belém, pertencente ao clã do falecido marido de Noemi, Elimeleque, o que o tornava um parente chegado e resgatador da família.Fontes: Boaz · Elimelech · o próprio texto bíblico
- Apesar de Rute ser uma estrangeira de Moabe, Boaz concedeu-lhe hospitalidade e proteção especiais, oferecendo-lhe grãos tostados e água, e ordenando aos seus trabalhadores que não a maltratassem por causa de sua lealdade a Noemi.Fontes: Ruth · o próprio texto bíblico
Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.
Lugares deste capítulo
Só aparecem lugares com identificação de alta confiança (90% ou mais segundo as fontes acadêmicas reunidas pelo OpenBible). Mapa da época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa atual: © colaboradores do OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org