Nations Bible

Mateus 21

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.

Mbata ikpeazụ Jisọs batara Jerusalem

1Mgbe ha na-abịaru Jerusalem nso, ha rutere Betfeji dị nʼUgwu Oliv. Jisọs zipụrụ mmadụ abụọ nʼime ndị na-eso ụzọ ya. 2Ọ gwara ha sị, “Baanụ nʼime obodo nta ahụ dị unu nʼihu, ngwangwa unu ga-ahụ otu ịnyịnya ibu elibere nʼosisi nʼebe ahụ, nke ya na nwa ya nọ nʼotu ebe. Tọpụta ha ma kpụtaranụ m ha. 3Ọ bụrụkwa na onye ọbụla asị unu ihe ọbụla, unu ga-asị ha, ọ dị Onyenwe anyị mkpa, ọ ga-akpụghachitekwa ha ngwangwa.”

4E mere nke a ka okwu e kwuru site nʼọnụ onye amụma mezuo.

5“Gwanụ ada Zayọn sị,

‘lee, eze gị ka ọ na-abịakwute gị.

Ọ bụ onye dị nwayọọ. Ọ na-anọkwasịkwa nʼelu ịnyịnya ibu,

ee, nʼelu nwa ịnyịnya, nwa ịnyịnya na-ebu ibu.’ ”

6Ndị na-eso ụzọ ya gara mee ihe Jisọs sịrị ha mee. 7Ha kpụtara ịnyịnya ibu ahụ na nwa ịnyịnya ahụ, wụkwasịkwa uwe ha nʼelu ha ka Jisọs nọkwasị nʼelu ha. 8Ọtụtụ nʼime igwe mmadụ ahụ tụsara uwe ha nʼokporoụzọ. Ndị ọzọ gbuturu alaka osisi, tụsaa ha nʼụzọ nʼihu ya. 9Ụfọdụ nʼime igwe mmadụ ahụ nọ nʼihu, na ndị na-esokwa nʼazụ, nọ na-eti mkpu nʼoke olu na-asị:

“Hozanna dịrị Nwa Devid!”

“Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, nke na-abịa nʼaha Onyenwe anyị!”

“Hozanna nʼebe kachasị ihe niile elu!”

10Mgbe ọ batara nʼime Jerusalem, ụzụ tụrụ, obodo ahụ niile mere mkpọtụ. Ndị mmadụ bidoro na-ajụ ajụjụ na-asị, “Onye kwa bụ onye a?”

11Igwe mmadụ ahụ nọ na-asị, “Nwoke a bụ Jisọs, onye amụma ahụ sị Nazaret, obodo dị nʼime Galili.”

Jisọs nʼụlọnsọ ukwu

12Jisọs banyere nʼụlọnsọ ukwu dị na Jerusalem, malite ịchụpụ ndị niile na-ere ahịa na ndị na-azụ ahịa nʼime ụlọnsọ ahụ. O kpuru tebul ndị na-agbanwe ego ihu nʼala, kwatuokwa oche ndị na-ere nduru. 13Ọ sịrị ha, “E dere ya nʼakwụkwọ nsọ, ‘Ụlọ m ka a ga-akpọ ụlọ ekpere,’ ma unu emeela ya ‘ọgba ndị na-apụnarị mmadụ ihe nʼike.’ ”

14Ndị ìsì na ndị ngwụrọ bịakwutere ya nʼụlọnsọ ahụ. Ọ gwọkwara ha. 15Ma mgbe ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu hụrụ ihe ịrịbama ndị a, hụkwa ka ụmụnta na-eti mkpu nʼoke olu nʼogige ụlọnsọ ahụ, na-asị, “Hozanna dịrị Nwa Devid.” Iwe were ha nke ukwuu.

16Ha sịrị ya, “Ị na-anụkwa ihe ụmụnta ndị a na-ekwu?”

Jisọs zara sị ha, “E, ana m anụ ya. Ọ bụ na unu agụtabeghị ihe akwụkwọ nsọ kwuru sị,

“ ‘I sitere nʼọnụ ụmụntakịrị na ụmụ na-aṅụ ara

gị, Onyenwe anyị, kwadooro otuto gị’ ?”

17Ọ hapụrụ ha, si nʼobodo ahụ pụọ gaa Betani, ebe ọ nọrọ nʼabalị ahụ niile.

Jisọs abụọ osisi fiig ọnụ

18Nʼụtụtụ, mgbe ọ laghachiri nʼobodo ahụ, agụụ gụrụ ya nke ukwuu. 19Ọ hụrụ otu osisi fiig nke dị nʼakụkụ ụzọ. Mgbe o rutere nʼukwu ya, ọ hụghị ihe ọbụla nʼelu ya karịa naanị akwụkwọ ndụ. Ya mere, ọ sịrị ya, “Malite taa gaa nʼihu, ị gaghị amịkwa mkpụrụ ọzọ!” Otu mgbe ahụ kwa, osisi ahụ kpọnwụrụ.

20Mgbe ndị na-eso ụzọ ya hụrụ nke a, o juru ha anya, ha jụọ sị, “Gịnị mere osisi fiig a ji kpọnwụọ ngwangwa otu a?”

21Jisọs zara sị ha, “Nʼezie agwa m unu, ọ bụrụ na unu e nwee okwukwe, gharakwa inwe obi abụọ, ọ bụghị naanị na unu ga-eme ihe e mere osisi fiig ahụ. Unu pụrụ inye ugwu a iwu sị ya, ‘Si nʼebe a wezuga onwe gị, gaa danye nʼoke osimiri.’ Ọ ga-emezukwa. 22Ihe ọbụla unu ga-arịọ nʼekpere, ọ bụrụ na unu ekwere unu ga-anatakwa ya.”

Ajụjụ banyere ebe Jisọs si nweta ike ya

23Mgbe Jisọs batara nʼogige ụlọnsọ ukwu ahụ, ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu bịakwutere ya ka ọ nọ na-akụzi ihe jụọ ya sị, “Olee ikike i ji na-eme ihe ndị a niile? Ọ bụ onye nyekwara gị ikike a?”

24Jisọs zara sị ha, “Aga m ajụkwa unu otu ajụjụ. Ọ bụrụ na unu azaa ya, aga m agwakwa unu onye nyere m ikike m ji eme ihe ndị a niile. 25Baptizim nke Jọn o sitere nʼeluigwe, ka ọ si nʼaka mmadụ?”

Ha kparịtara ụka nʼetiti onwe ha na-asị, “Ọ bụrụ na anyị asị, ‘Na o si nʼeluigwe,’ ọ ga-asị anyị, ‘Ọ bụ gịnị mere unu na-ejighị kwenye na ya?’ 26Ma ọ bụrụ na anyị asị, ‘Na o sitere nʼaka mmadụ,’ anyị na-atụ igwe mmadụ ndị a egwu, nʼihi na mmadụ niile kwenyere na Jọn bụ onye amụma.”

27Ya mere ha zara Jisọs sị ya: “Anyị amaghị.”

Jisọs zakwara ha sị, “Mụ onwe m agaghị agwakwa unu ikike m ji na-eme ihe ndị a.

Ilu banyere ụmụnne abụọ

28“Gịnị ka unu chere banyere ihe a? Otu nwoke nwere ụmụ nwoke abụọ gwara nwa ya nke okenye sị ya, ‘Nwa m nwoke, gaa rụọ ọrụ nʼubi vaịnị m taa.’

29“Ọ zara ya sị, ‘Agaghị m aga.’ Ma o mesịrị gbanwee obi ya gaakwa rụọ ọrụ ahụ.

30“Nna ha bịakwutere nwa ya nke nta gwakwa ya otu ihe ahụ. Nwa ahụ zakwara sị, ‘Aga m aga, onyenwe anyị.’ Ma nʼikpeazụ ọ gaghị.

31“Onye nʼime ha abụọ mere ihe nna ya chọrọ?”

Ha zara sị ya, “Onye nke mbụ.”

Jisọs kọwaara ha sị, “Nʼezie agwa m unu, ndị ọna ụtụ na ụmụ nwanyị akwụna ga-ebu unu ụzọ banye nʼalaeze Chineke. 32Nʼihi na Jọn bịakwutere unu igosi unu ụzọ ezi omume, ma unu ekweghị. Ndị ọna ụtụ, na ụmụ nwanyị akwụna chegharịrị. Ọ bụladị mgbe unu hụrụ nke a, o mekwaghị ka unu chegharịa kwere na ya.

Ilu banyere ndị nlekọta ubi ọjọọ

33“Ugbu a geekwanụ ntị nʼilu ọzọ. Otu onye dị nke nwere ala ubi. Ọ kụrụ osisi vaịnị nʼubi a. Ọ gbakwara ubi ya ogige, gwuokwa ebe ịzọcha mkpụrụ vaịnị nʼime ya. O wukwara ụlọ elu nʼime ya. Mgbe o mesịrị ihe ndị a, o weere ubi ahụ tinye nʼaka ndị ga-elekọtara ya ubi ahụ, pụọ gaa nʼala ọzọ. 34Mgbe oge iwe ihe ubi ruru, o zipụrụ ndị odibo ya ka ha jekwuru ndị na-elekọta ubi ahụ, nata mkpụrụ nke ruuru ya site nʼubi ahụ.

35“Ma ndị na-elekọta ubi ahụ jidere ndị odibo ya ahụ tie otu onye nʼime ha ihe, gbukwaa onye ọzọ nʼime ha. Ha tụkwara otu nʼime ha nkume. 36Emesịa, o zigakwara ọtụtụ ndị odibo karịrị ndị nke mbụ nʼọnụọgụgụ. Ma ndị na-elekọta ubi ahụ mekwara ndị a ihe ha mere ndị nke mbụ. 37Nʼikpeazụ o zigara ọkpara ya, sị, ‘Ha ga-asọpụrụ nwa m.’

38“Ma mgbe ndị na-elekọta ubi ahụ hụrụ ọkpara ya, ha gbara izu nʼetiti onwe ha sị, ‘Lee! Onye a bụ onye nketa ihe niile. Bịanụ ka anyị gbuo ya, ma nwetakwa ihe nketa ya.’ 39Ya mere, ha jidere ya nʼike, kpụrụ ya gafee nʼazụ ubi vaịnị ahụ, gbuo ya nʼebe ahụ.

40“Mgbe onye nwe ubi vaịnị ahụ lọtara, gịnị ka unu chere na ọ ga-eme ndị ahụ o tinyere ilekọtara ya ubi ya?”

41Ha zara ya sị, “Ọ ga-egbu ndị ajọ omume ahụ, laa ha nʼiyi nʼụzọ dị njọ. Ọ ga-ewerekwa ubi vaịnị ya tinye nʼaka ndị nlekọta ọzọ, ndị ga-enyekwa ya mkpụrụ ubi ruuru ya nʼoge ya.”

42Jisọs sịrị ha, “Ọ ga-abụ na unu agụtabeghị ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ sị,

“ ‘Nkume ahụ ndị na-ewu ụlọ jụrụ,

abụrụla nkume isi ntọala ụlọ.

Nke a bụ ọrụ nke Onyenwe anyị rụrụ,

ọ bụkwa ọrụ ịtụnanya nʼanya anyị.’

43“Ya mere, ana m eme ka unu ghọta, na a ga-anapụ unu alaeze Chineke, were ya nye ndị mba ọzọ, ndị ga-amịpụta ezi mkpụrụ. 44Onye ọbụla nke dakwasịrị nʼelu nkume a ga-etiwasị, ma ọ ga-egwepịa onye ọbụla nke ọ dakwasịrị.”

45Mgbe ndịisi nchụaja na ndị Farisii nụrụ ilu ya ndị a, ha ghọtara na ọ na-ekwu banyere ha. 46Ha chọrọ ụzọ ha ga-esi jide ya, ma oke egwu igwe mmadụ ahụ tụrụ ha, nʼihi na ha gụrụ ya nʼonye amụma.

Ilustração artística — interpretação, não registro histórico.

Você sabia?

Jesus entra em Jerusalém

  • Ao se aproximarem de Jerusalém, Jesus e os discípulos chegaram a Betfagé, no Monte das Oliveiras, e dali ele enviou dois discípulos para trazer uma jumenta e seu jumentinho. Betfagé significa “casa do figo ainda não maduro”; ficava no caminho de Jerusalém a Jericó, bem perto de Betânia, onde ele passou a noite, e era o limite de uma jornada de sábado a partir da cidade, 2.000 côvados. O Monte das Oliveiras recebe o nome das oliveiras que cobrem suas encostas e é uma serra a leste de Jerusalém, separada da cidade pelo vale do Cedrom.Fontes: o próprio texto bíblico · Bethphage · Mount of Olives
  • O texto diz que a entrada cumpriu o que foi dito pelo profeta à Filha de Sião: o rei viria a ela manso, montado num jumento, num jumentinho, cria de jumenta. Sião era o monte sudeste de Jerusalém; quando Davi a tomou dos jebuseus, construiu ali uma cidadela e um palácio, e ela passou a ser conhecida como a cidade de Davi. As multidões que iam adiante e as que o seguiam gritavam: “Hosana ao Filho de Davi!”Fontes: o próprio texto bíblico · Zion
  • Quando Jesus entrou em Jerusalém, a cidade inteira se alvoroçou e perguntou quem ele era; as multidões responderam que era Jesus, o profeta de Nazaré da Galileia. Nazaré não é mencionada no Antigo Testamento e era o lar de José e Maria. O Dicionário Bíblico de Easton (1897) diz que o nome é em geral entendido como forma grega de uma palavra hebraica que significa “broto” ou “rebento”, embora alguns o liguem ao monte atrás da cidade e a uma palavra para quem guarda ou vigia; Galileia significa “circuito” e era chamada “Galileia dos gentios”, distinguindo-se a Alta Galileia da Baixa Galileia, mais ao sul.Fontes: o próprio texto bíblico · Nazareth · Galilee

Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.

Lugares deste capítulo

  • Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículos 1, 10, 18
  • Mount of Olives · 31.778, 35.246 · versículo 1
  • Zion · Hoje: Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículo 5
  • Galilee · 32.760, 35.527 · versículo 11
  • Nazareth · 32.702, 35.298 · versículo 11

Só aparecem lugares com identificação de alta confiança (90% ou mais segundo as fontes acadêmicas reunidas pelo OpenBible). Mapa da época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa atual: © colaboradores do OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Fale com a gente

Conte de onde você lê, como a Bíblia tem te ajudado ou o que podemos melhorar. Lemos todas as mensagens.