Nations Bible

Mateus 20

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.

Ilu banyere ndị ọrụ ubi

1“Ihe ọzọ a ga-eji tụnyere alaeze eluigwe bụ nwoke nwere ala ubi, onye pụrụ nʼisi ụtụtụ ịkpọta ndị ọrụ ga-arụ ọrụ nʼubi vaịnị ya. 2Ya na ndị ọrụ ahụ kwekọtara na ọ ga-akwụ ha otu denarị, nʼihi ọrụ ụbọchị ahụ. Emesịa o zigara ha nʼubi vaịnị ya.

3“Mgbe ọ pụrụ nʼihe dị ka elekere itoolu nke ụtụtụ, o sitere nʼebe a na-akpọta ndị ọrụ na-agafe hụ ndị ọzọ ka ha guzoro nʼọma ahịa na-enweghị ọrụ ha na-arụ. 4Ọ sịrị ha, ‘Unu onwe unu gaakwanụ rụọ ọrụ nʼubi vaịnị m, ihe ọbụla ziri ezi ka m ga-akwụ unu.’ 5Ya mere ha gara.

“Ọ pụkwara nʼelekere iri na abụọ na elekere atọ nke ehihie, ma meekwa otu ihe ahụ. 6Mgbe o ruru elekere ise nke anyasị, ọ pụrụ hụ ndị ọzọ ka ha guzoro. Ọ jụrụ ha ajụjụ sị, ‘Gịnị mere unu ji guzoro nʼebe a taa niile na-arụghị ọrụ?’

7“Ha zara sị ya, ‘Nʼihi na ọ dịghị onye kpọrọ anyị ọrụ.’

“Ọ gwara ha sị, ‘Unu onwe unu gaakwanụ rụọ ọrụ nʼubi vaịnị m. Aga m akwụkwa unu ihe dị mma.’

8“Mgbe o ruru oge anyasị, onye nwe ubi vaịnị ahụ gwara onye na-elekọtara ya ndị ahụ anya sị, ‘Kpọkọta ndị ọrụ ahụ kwụọ ha ụgwọ, site na ndị ikpeazụ bịara ọrụ ruo na ndị bu ụzọ.’

9“Mgbe ndị a kpọrọ ọrụ nʼelekere ise anyasị naara ego ha, a kwụrụ ha otu denarị, otu denarị. 10Ma mgbe ndị a kpọrọ ọrụ nʼisi ụtụtụ bịara ịnara ego ha, ha lere anya na a ga-akwụ ha karịa. Ma a kwụkwara ha niile otu denarị. 11Mgbe ha naara ego ahụ, ha tamuru ntamu megide nna nwe ụlọ, 12na-asị, ‘Ndị a bịara nʼikpeazụ rụrụ ọrụ naanị otu awa, ma i meela ka anyị na ha hara. Anyị bụ ndị buru ihe mgbu nke ọrụ ma okpomọkụ nke anwụ niile chara nʼụbọchị taa.’

13“Ma ọ zara otu nʼime ha sị, ‘Enyi m, emeghị m gị ihe ọjọọ ọbụla. Ọ bụ na mụ na gị ekwughị na m ga-akwụ gị otu denarị nʼụbọchị? 14Nara nke ruru gị laa. A chọrọ m ịkwụ ndị a bịara nʼikpeazụ ụgwọ dị ka m si kwụọ gị. 15Ọ bụ na m enweghị ike iji ihe m nwere mee otu ọ masịrị m? Ọ bụ anya ukwu ka ị na-enwe nʼihi afọ ofufu m?’

16“Ya mere, onye ikpeazụ ga-abụ onye bu ụzọ, ma onye bu ụzọ ga-abụkwa onye ikpeazụ.”

Jisọs ekwuokwa okwu banyere ọnwụ ya

17Mgbe Jisọs na-aga Jerusalem, ọ kpọpụrụ mmadụ iri na abụọ ahụ na-eso ụzọ ya nʼakụkụ sị ha, 18“Lee, anyị na-aga Jerusalem ebe a ga-arara Nwa nke Mmadụ nyefee nʼaka ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu. Ha ga-ama ya ikpe ọnwụ, 19nyefekwa ya nʼaka ndị mba ọzọ, ndị ga-eji ya mee ihe ọchị, pịa ya ihe, ma kpọgide ya nʼobe. Ma nʼụbọchị nke atọ, a ga-eme ka ọ site nʼọnwụ bilie.”

Arịrịọ nne Jemis na Jọn

20Mgbe ahụ, nne ụmụ Zebedi, duuru ụmụ ya ndị ikom abụọ bịakwute ya, o gburu ikpere nʼala nʼihu ya, rịọ ya ihe ọ chọrọ ka o meere ha.

21Ọ sịrị ya, “Gịnị ka ị chọrọ ka m meere gị?”

Ọ zara ya sị, “Kwee m nkwa na ụmụ abụọ ndị a ga-anọdụ otu nʼaka nri gị, nke ọzọ nʼaka ekpe gị nʼalaeze gị.”

22Ma Jisọs zara sị, “Unu amaghị ihe unu na-arịọ. Unu pụrụ ịṅụ iko ahụ nke mụ onwe m ga-aṅụ?”

Ha zara ya sị, “Ee, anyị nwere ike ịṅụ ya.”

23Jisọs sịrị ha, “Nʼezie unu ga-aṅụ iko m ga-aṅụ, ma ịnọdụ nʼaka nri maọbụ nʼaka ekpe m, abụghị ihe dịrị m inye, kama ọ dịịrị ndị ahụ Nna m kwadooro ya.”

24Mgbe mmadụ iri ndị ọzọ nʼime ndị na-eso ụzọ ya nụrụ nke a, iwe were ha nke ukwuu megide ụmụnne abụọ a. 25Ma Jisọs kpọkọtara ha niile, sị ha, “Nʼetiti ndị na-ekweghị ekwe, ndịisi ha na-emeso ndị ha na-achị mmeso dị ka o si dị ha mma nʼuche. Ndị ukwu nʼetiti ha na-ejikwa aka ike na-achị ndị nọ nʼokpuru ha. 26Ma nʼetiti unu ọ gaghị adị otu a. Kama, onye ọbụla nʼetiti unu chọrọ ịbụ onyeisi, ga-ebu ụzọ bụrụ onye na-ejere unu niile ozi. 27Ma onye ọbụla nke chọrọ ịbụ onye mbụ nʼetiti unu ga-abụ ohu unu niile. 28Ọ bụladị dị ka Nwa nke Mmadụ na-abịaghị ka e jeere ya ozi, kama ka o jee ozi, ma nyekwa ndụ ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta nke ọtụtụ mmadụ.”

Ndị ìsì abụọ Jisọs gwọrọ

29Mgbe ha na-ahapụ Jeriko, ọtụtụ igwe mmadụ sooro ya nʼazụ. 30Ndị ìsì abụọ nọ nʼakụkụ ụzọ ahụ. Mgbe ha nụrụ na ọ bụ Jisọs na-abịa, ha malitere iti mkpu nʼoke olu na-asị, “Onyenwe anyị, Nwa Devid, meere anyị ebere!”

31Igwe mmadụ ahụ baara ha mba ka ha mechie ọnụ ha. Ma ndịisi ahụ nọgidesịrị ike na-eti mkpu nʼoke olu na-asị, “Onyenwe anyị, Nwa Devid, meere anyị ebere!”

32Mgbe Jisọs bịaruru nʼebe ha nọ, o guzoro kpọọ ha, jụọ ha sị, “Gịnị ka unu chọrọ ka m meere unu?”

33Ha zara sị ya, “Onyenwe anyị, biko, anyị chọrọ ka i mee ka anyị hụ ụzọ.”

34Jisọs nwere ọmịiko nʼahụ ha. O metụrụ ha aka nʼanya. Ngwangwa ha bidoro ịhụ ụzọ, ma sorokwa ya.

Ilustração artística — interpretação, não registro histórico.

Você sabia?

Os últimos e os primeiros no caminho de Jerusalém

  • Neste capítulo Jesus sobe para Jerusalém e, no final, o grupo sai de Jericó. O Easton's Bible Dictionary chama Jericó de “lugar de fragrância”, uma cidade fortificada entre palmeiras na planície do Jordão, cerca de cinco milhas a oeste do rio, e a chave para a Palestina ocidental. Chama também Jerusalém, conhecida ainda como cidade santa, de cidade de montanha, e liga seu nome dual a Sião e Moriá ou, como alguns supõem, à cidade alta e à cidade baixa.Fontes: Jericho · Jerusalem · o próprio texto bíblico
  • A mulher que se ajoelha para pedir que seus dois filhos se sentem à direita e à esquerda de Jesus é a mãe dos filhos de Zebedeu. Zebedeu, pescador galileu e pai de Tiago e João, parece, segundo o Easton's Bible Dictionary, ter tido alguma posição em Cafarnaum, com dois barcos e servos contratados. Ele não é mais mencionado depois que Jesus chamou seus filhos.Fontes: Zebedee · o próprio texto bíblico
  • Ao saírem de Jericó, dois cegos chamam Jesus de “Senhor, Filho de Davi”. Davi, nome que o Easton's Bible Dictionary dá como “Amado”, era o oitavo e o mais novo filho de Jessé, de Belém; na juventude cuidava das ovelhas do pai nas terras altas de Judá.Fontes: David · o próprio texto bíblico

Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.

Lugares deste capítulo

  • Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículos 17, 18
  • Jericho · Hoje: Tell el Alayiq · 31.852, 35.436 · versículo 29

Só aparecem lugares com identificação de alta confiança (90% ou mais segundo as fontes acadêmicas reunidas pelo OpenBible). Mapa da época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa atual: © colaboradores do OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Fale com a gente

Conte de onde você lê, como a Bíblia tem te ajudado ou o que podemos melhorar. Lemos todas as mensagens.