Nations Bible

João 5

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.

Ọgwụgwọ nʼọdọ mmiri Betsaida

1Mgbe nke a gasịrị, otu mmemme ndị Juu ruru, Jisọs agaa Jerusalem. 2Ma otu ọdọ mmiri nta dị nʼime Jerusalem nʼakụkụ Ọnụ ụzọ ama Atụrụ. Aha ọdọ mmiri ahụ nʼasụsụ Hibru bụ Betsaida, nke nwere mgbe ọnụ ụzọ ise. 3Nʼime ya ka igwe ndị ahụ na-esighị ike na-edina; ndị ìsì, ndị ngwụrọ, na ndị akụkụ ahụ ha kpọnwụrụ akpọnwụ, ha na-eche mgbe mmiri ahụ ga-enugharị. 4Nʼihi na mmụọ ozi Onyenwe anyị na-agbadata site na mgbe ruo na mgbe gbarụọ mmiri ahụ. Onye ọrịa ọbụla buru ụzọ daba nʼime mmiri ahụ ma a gbarụọ ya, ka a na-agwọ ihe ọbụla bụ ọrịa ya. 5Otu nwoke nọ nʼebe ahụ bụ onye nọrọla nʼọrịa iri afọ atọ na asatọ. 6Mgbe Jisọs hụrụ ya, matakwa na ọ nọọla nʼọnọdụ a ogologo oge, ọ jụrụ ya sị, “Ị chọrọ ka a gwọọ gị ọrịa?”

7Onye ọrịa ahụ zara, “Nna m ukwu, enweghị m onye ọbụla ga-enyere m aka kuba m nʼime ọdọ mmiri a ma a gbarụọ ya, mgbe o bụla m chọrọ ka m danye, onye ọzọ na-eburu m ụzọ danye.”

8Jisọs gwara ya, “Bilie, chilie ute gị jegharịa.” 9Nʼotu oge ahụ, ahụ dịrị nwoke ahụ mma, ọ chịlịri ute ya, malite ijegharị.

Ihe a mere nʼụbọchị izuike. 10Ma ndị Juu gwara nwoke ahụ a gwọrọ ọrịa, “Taa bụ ụbọchị izuike, o megidere iwu na ị ga-ebu ute gị.”

11Ma ọ zaghachiri ha, “Nwoke ahụ mere ka ahụ dị m mma sịrị m, ‘Chilie ute gị laa.’ ”

12Ha jụrụ ya, “Onye bụ onye ahụ gwara gị ka ị chilie ya laa?”

13Ma nwoke ahụ a gwọrọ amataghị onye ọ bụ nʼihi na Jisọs zoro onwe ya banye nʼetiti igwe mmadụ.

14Emesịa, Jisọs hụrụ ya nʼime ụlọnsọ ukwu sị ya, “Lee, e mela ka ahụ dị gị mma, emehiekwala ọzọ ka nke dị njọ karịa nke a hapụ ịbịakwasị gị.” 15Nwoke a siri nʼebe ahụ pụọ gaa gwa ndị Juu na ọ bụ Jisọs gwọrọ ya.

Ndụ site nʼọkpara ahụ

16Ya mere, nʼihi na Jisọs na-eme ihe ndị a nʼụbọchị izuike, ndị Juu malitere isogbu ya. 17Jisọs sịrị ha, “Nna m na-arụ ọrụ mgbe niile ruo ugbu a, mụ onwe m kwa, ana m arụ ọrụ.” 18Nʼihi nke a, ndị Juu chọsịrị ike igbu ya. Ọ bụghị naanị na o mebiri ụbọchị izuike, kama ọ na-akpọkwa Chineke Nna ya, sitekwa otu a na-eme ka ya na Chineke hara.

19Jisọs zara ha sị, “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, o nweghị ihe ọbụla Ọkpara pụrụ ime nʼonwe ya; naanị ihe o nwere ike ime bụ ihe ọ hụrụ Nna ya na-eme, nʼihi na ihe ọbụla Nna ahụ na-eme ka Ọkpara ya na-emekwa. 20Nʼihi na Nna ahụ hụrụ Ọkpara ya nʼanya ma na-egosikwa ya ihe niile ọ na-eme. Nʼezie ọ ga-agbagwoju unu anya nʼihi na ọ ga-egosi ya ihe karịrị ndị a. 21Nʼihi na dị ka nna ahụ si akpọte ndị nwụrụ anwụ na-enyekwa ha ndụ, otu ahụ ka Ọkpara ya si enye onye ọbụla ọ masịrị ya ndụ. 22Nna anaghị ekpe onye ọbụla ikpe, kama o nyefere ikpe niile nʼaka Ọkpara. 23Ka mmadụ niile nye Ọkpara ahụ nsọpụrụ dị ka ha na-asọpụrụ Nna ahụ. Onye ọbụla nke na-adịghị asọpụrụ Ọkpara ahụ adịghị asọpụrụ Nna nke zitere ya.

24“Nʼezie, nʼezie agwa m unu, onye ọbụla na-anụ okwu m ma kwerekwa nʼonye zitere m nwere ndụ ebighị ebi, a gaghị amakwa ya ikpe, ọ gafeela site nʼọnwụ banye na ndụ. 25Nʼezie, nʼezie agwa m unu, oge na-abịa, ọ bịakwala ugbu a mgbe ndị nwụrụ anwụ ga-anụ olu Ọkpara Chineke, ndị ahụ nụrụ ya ga-adịkwa ndụ. 26Dị ka Nna ahụ nwere ndụ nʼime onwe ya, otu a ka o nyekwara Ọkpara ahụ ike inwe ndụ nʼime onwe ya. 27O nyekwala ya ikike ikpe ikpe nʼihi na ọ bụ Nwa nke Mmadụ.

28“Ka nke a hapụ iju unu anya, nʼihi na oge na-abịa, mgbe ndị niile nọ nʼili ha ga-anụ olu ya 29ma pụta, ndị mere ihe dị mma ga-ebili dịrị ndụ. Ma ndị mere ihe ọjọọ ga-ebili bụrụ ndị a ga-ama ikpe. 30Enweghị m ike ime ihe ọbụla nʼonwe m, ikpe m na-ekpe bụ naanị dị ka m nụrụ, ikpe m bụkwa nke ziri ezi, nʼihi na anaghị m eme ihe ga-amasị m, kama ọ bụ ihe ga-amasị onye ahụ zitere m.

Ọgbụgba ama maka Jisọs

31“Ọ bụrụ na m na-agba ama banyere onwe m, ama m abụghị eziokwu. 32Enwere m onye ọzọ na-agbara m ama, amatakwara m na ama ya banyere m bụ eziokwu.

33“Unu zigaara Jọn ndị ozi, ọ gbakwaala ama maka eziokwu ahụ. 34Ọ bụghị na m na-anabata ama nke mmadụ, kama a na m ekwu ya ka enwe ike ịzọpụta unu. 35Ọ bụ oriọna nke na-enwu na-amụkekwa, unu họrọkwara ịṅụrị ọṅụ nʼìhè ya nʼoge nta.

36“Ma e nwere m ama dị ukwuu karịa nke Jọn, nʼihi na ọrụ ahụ ya bụ Nna nyere m ka m rụchapụ, bụkwa nke m na-arụ, na-agbara m ama na ọ bụ Nna ahụ zitere m. 37Ya bụ Nna ahụ zitere m na-agbakwa ama nʼonwe ya banyere m. Unu anụbeghị olu maọbụ hụ ụdịdị ya. 38Okwu ya anọkwaghị nʼime unu nʼihi na unu ekweghị nʼonye o zitere. 39Unu na-enyocha akwụkwọ nsọ nʼihi na unu chere na unu ga-esite na ha nwee ndụ ebighị ebi maọbụ ha na-agba ama banyere m. 40Ma unu jụrụ ịbịakwute m ka unu nwee ndụ.

41“Anaghị m anabata otuto nke ụmụ mmadụ. 42Ma amatara m na unu enweghị ịhụnanya Chineke nʼobi unu. 43Abịala m nʼaha Nna m ma unu anabataghị m. Ma ọ bụrụ na onye ọzọ abịa nʼaha nke onwe ya, unu ga-anabata ya. 44Olee otu unu ga-esi kwere ebe unu na-anara otuto site nʼaka ibe unu, ma unu adịghị achọ otuto nke si nʼaka onye naanị ya bụ Chineke?

45“Unu echela na m ga-ebo unu ebubo nʼihu Nna ahụ. Onye ga-ebo unu ebubo bụ Mosis, bụ onye unu tụkwasịrị obi na ya. 46Ọ bụrụ na unu kwenyeere Mosis, unu gakwara ekwere na m, nʼihi na o dere banyere m. 47Ma ebe unu na-ekweghị nʼihe o dere, olee otu unu ga-esi kwere nʼihe m kwuru?”

Ilustração artística — interpretação, não registro histórico.

Você sabia?

Uma cura no sábado em Betesda

  • Perto da Porta das Ovelhas, na muralha oriental de Jerusalém, havia um tanque com cinco pórticos cobertos, chamado Betesda em hebraico, nome que significa 'casa de misericórdia'. A palavra grega para o tanque significa um banho de natação ou reservatório, e um grande número de enfermos, cegos, coxos e paralíticos jazia sob as colunatas, à espera de que a água se agitasse. O lugar também é chamado Betsaida e Bete-Zata; o historiador Eusébio, por volta de 330 d.C., o chama de tanque das ovelhas, e o Dicionário Bíblico de Easton (1897) o identifica com a chamada Fonte da Virgem, no vale do Cedrom, perto do tanque de Siloé.Fontes: Bethesda · Sheep Gate · o próprio texto bíblico
  • Uma cronologia do acontecimento situa a cura em Betesda no ano 28 d.C., e o Evangelho diz que ela ocorreu num sábado. Aqueles a quem o relato chama de judeus disseram ao homem curado que era ilícito carregar o leito naquele dia. Quando Jesus respondeu que o Pai continuava trabalhando e que ele também trabalhava, eles procuraram ainda mais matá-lo, porque o ouviram chamar a Deus de seu próprio Pai, fazendo-se igual a Deus.Fontes: Bethesda pool healing · o próprio texto bíblico
  • No discurso que se segue, Jesus apela ao testemunho de João Batista, a quem o Dicionário Bíblico de Easton (1897) chama de precursor do Senhor e cuja missão, segundo o dicionário, foi objeto de profecia. Jesus o descreve como uma lâmpada que ardia e iluminava, em cuja luz o povo quis se alegrar por um tempo, embora diga ter um testemunho maior que o de João: as obras que o Pai lhe deu para realizar.Fontes: John the Baptist · o próprio texto bíblico

Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.

Lugares deste capítulo

  • Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículos 1, 2
  • Bethesda · Hoje: Pool of Bethesda · 31.781, 35.236 · versículo 2
  • Sheep Gate · Hoje: in Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículo 2

Só aparecem lugares com identificação de alta confiança (90% ou mais segundo as fontes acadêmicas reunidas pelo OpenBible). Mapa da época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa atual: © colaboradores do OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Fale com a gente

Conte de onde você lê, como a Bíblia tem te ajudado ou o que podemos melhorar. Lemos todas as mensagens.