Jeremias 27
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.
Juda ga-aghọ onye na-ejere Nebukadneza ozi
1Na mmalite ọchịchị Zedekaya, nwa Josaya eze Juda, okwu ndị a si nʼọnụ Onyenwe anyị rute Jeremaya ntị. 2Ihe ndị a ka Onyenwe anyị gwara m, “Jiri akpụkpọ anụ dị warawara na ụfọdụ okporo igwe, meere onwe gị ụdị agbụ ahụ a na-amanye ụmụ ehi nʼolu, nyakwasị ya nʼolu gị. 3Mgbe ahụ, zigara ndị eze Edọm, na Moab, na Amọn, na Taịa, na Saịdọn ozi site nʼọnụ ndị ozi ha bịara Jerusalem iwetara Zedekaya eze Juda ozi. 4Zie ha ozi ha ga-ezi ndị nwe ha, sị, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, sị, “Zienụ ndị nna unu ukwu ozi a, sị, 5Ọ bụ site nʼike aka m, na site nʼogwe aka m, nke e setịrị eseti, ka m ji mee ụwa, na mmadụ, na anụmanụ dị nʼime ya. Mụ onwe m ka ọ dịkwara ikpebi itinye ha niile nʼaka onye ọbụla m họpụtara dịka o si dị m mma. 6Ugbu a, ana m ewere alaeze unu niile nyefee ya nʼaka onye na-ejere m ozi bụ Nebukadneza eze Babilọn; aga m emekwa ka ọ bụladị ụmụ ajọ anụ ọhịa mee ihe o nyere nʼiwu. 7Mba niile ga-akpọ isiala nye ya; ha ga-akpọkwa isiala nye nwa ya na nwa nwa ya, tutu ruo mgbe m kpebiri na oge ha ezuola. Mgbe ahụ, aga m eme ka ọtụtụ mba na ọtụtụ ndị eze merie ya.
8“ ‘ “Ma ọ bụrụkwa na mba maọbụ alaeze ọbụla ajụ ife Nebukadneza, bụ eze Babilọn, maọbụ jụ ijere ya ozi dịka ohu, aga m eji mma agha na ụnwụ na ọrịa na-efe efe, taa mba ahụ ahụhụ, tutu ruo mgbe m bibiri ya site nʼaka ya. Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 9Ya mere, unu aṅala ndị amụma unu, na ndị na-ajụ mmụọ ase, na ndị na-akọwara unu nrọ, na ndị mmụọ ọjọọ si nʼọnụ ha ekwu okwu, na ndị mgbaasị ntị. Unu aṅala ha ntị mgbe ha na-asị unu, ‘Unu agaghị abụ ndị ohu eze Babilọn.’ 10Nʼihi na ọ bụ naanị amụma ụgha ka ha na-eburu unu, okwu ụgha nke ga-eme ka e site nʼala unu wezuga unu, bulaa unu ala dị anya. Aga m esi nʼala unu chụsaa unu. Unu ga-alakwa nʼiyi. 11Ma ọ bụrụ na mba ọbụla ekwere ịbụ ohu eze Babilọn, kwenyekwa ife ya ofufe, mba ahụ ka m ga-eme ka ọ nọgide nʼala nke aka ya. Ọ ga-akọ ala ahụ, birikwa nʼime ya. Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.” ’ ”
12Otu ozi ahụ ka m ziri Zedekaya, bụ eze Juda. Asịrị m, “Were olu gị nyefee eze Babilọn nʼaka dịka ohu, feekwa ya na ndị ya, ị ga-adịkwa ndụ. 13Nʼihi gịnị ka gị na ndị gị ga-eji nwụọ site na mma agha, na site nʼụnwụ na ọrịa na-efe efe, dịka nke Onyenwe anyị kwurula banyere mba ọbụla nke na-agaghị efe eze Babilọn? 14Egela ntị nʼokwu ndị amụma na-agwa gị sị, ‘Unu agaghị efe eze Babilọn,’ nʼihi na ọ bụ okwu ụgha ka ha na-agwa unu. 15‘Ọ bụghị m zitere ha,’ otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. ‘Ha ji aha m na-ebu amụma ụgha. Nʼihi ya, aga m achụpụ unu, unu ga-alakwa nʼiyi, unu na ndị amụma ahụ na-eburu unu amụma.’ ”
16Mgbe ahụ, agwara m ndị nchụaja na ndị mmadụ niile okwu sị ha, “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru: Unu egela ndị amụma ahụ ntị, bụ ndị na-asị unu, ‘Na mgbe na-adịghị anya a ga-ebughachi ngwongwo ahụ e si nʼụlọnsọ Onyenwe anyị bulaa Babilọn.’ Ọ bụ amụma ụgha ka ha na-eburu unu. 17Unu egela ha ntị. Feenụ eze Babilọn, nʼihi na ọ bụ naanị site nʼụzọ ahụ ka unu ga-esi dịrị ndụ. Nʼihi gịnị ka unu ga-eji kwenye ka obodo a ghọọ mkpọmkpọ ebe? 18Ọ bụrụ nʼezie na ọ bụ okwu Onyenwe anyị si nʼọnụ ndị amụma a na-apụta, ha rịọọnụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile arịrịọ ka ọ hapụ ikwe ka e bukọrọ ngwongwo fọdụrụ nʼime ụlọnsọ nakwa ndị fọdụrụ nʼụlọeze Juda, na nʼime Jerusalem bulaa Babilọn. 19Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru banyere ogidi niile ndị ahụ, na Oke osimiri bronz ahụ, na ihe ndọkwasị niile, na ihe niile fọdụrụ nʼobodo a, 20nke Nebukadneza, bụ eze Babilọn na-eburughị mgbe o sitere na Juda na Jerusalem, dọkpụrụ Jehoiakin nwa Jehoiakim, bụ eze Juda, na ndị niile a na-asọpụrụ bulaa Babilọn. 21E, ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile bụ Chineke Izrel kwuru banyere ihe niile fọdụrụ nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, na ndị fọdụrụ nʼụlọeze Juda na nʼime Jerusalem. 22‘A ga-eburu ha niile bulaa ha Babilọn. Ebe ahụ ka ha ga-anọkwa tutu ruo mgbe m ga-abịa leta ha,’ ka Onyenwe anyị kwubiri. ‘Mgbe ahụ, aga m ebulatakwa ha, kpọghachitekwa ha nʼebe a.’ ”
Você sabia?
O jugo da Babilônia
- Deus instruiu Jeremias a fazer um jugo com correias e colocá-lo sobre o pescoço como uma mensagem visual viva. Ele foi orientado a advertir os enviados de Edom, Moabe, Amom, Tiro e Sidom que visitavam o rei Zedequias em Jerusalém, instando suas nações a se submeterem à Babilônia em vez de se rebelarem.Fontes: o próprio texto bíblico
- Nesta mensagem, Deus se refere a Nabucodonosor, o governante da Babilônia, como 'meu servo'. O texto enfatiza que o Criador da terra concede o domínio sobre terras e reinos a quem Lhe agrada, sujeitando as nações vizinhas ao domínio babilônico.Fontes: o próprio texto bíblico · Nebuchadnezzar
- Enquanto profetas rivais afirmavam que os utensílios sagrados levados durante o exílio de Jeconias (Joaquim) logo retornariam, Jeremias advertiu que isso era uma mentira. Ele anunciou que as peças restantes do templo, incluindo as colunas de bronze, o mar e os suportes, também seriam levadas para a Babilônia.Fontes: o próprio texto bíblico · Jehoiachin
Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.
Lugares deste capítulo
- Ammon · 31.955, 35.934 · versículo 3
- Edom · 30.746, 35.604 · versículo 3
- Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículos 3, 18, 20, 21, 22
- Moab · Hoje: Moab 1 · 31.181, 35.701 · versículo 3
- Sidon · Hoje: Sandikli archaeological site in Sidon · 33.561, 35.372 · versículo 3
- Tyre · 33.271, 35.196 · versículo 3
- Babylon · 32.543, 44.422 · versículos 6, 7, 8, 9, 11, 12, 13, 14, 16, 17, 18, 20, 22
Só aparecem lugares com identificação de alta confiança (90% ou mais segundo as fontes acadêmicas reunidas pelo OpenBible). Mapa da época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa atual: © colaboradores do OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org