Jeremias 26
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.
Mba ọnwụ a baara Jeremaya
1Na mmalite oge ahụ, Jehoiakim nwa Josaya eze Juda bidoro ịchị ndị Juda, Onyenwe anyị mere ka okwu ya rute Jeremaya ntị. 2Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Guzo nʼogige ụlọnsọ Onyenwe anyị. Nọdụ nʼebe ahụ gwa ndị niile si nʼobodo Juda bịa ịkpọ isiala nʼụlọnsọ Onyenwe anyị okwu. Gwa ha ihe ahụ niile m nyere gị nʼiwu. Mee ka ihe ndị ahụ niile m nyere gị nʼiwu rute ha ntị, na-afọdụghị otu. 3Ma eleghị anya ha ga-anụ, si na mmehie ha chegharịa. Mgbe ahụ, mụ onwe m ga-eme ka ihe ọjọọ ahụ m na-ezube na ọ ga-abịakwasị ha ghara ịbịakwasị ha. 4Gwa ha sị, ‘Otu a ka Onyenwe anyị kwuru: Ọ bụrụ na unu ajụ ige m ntị, jụkwa ịgbaso iwu m, nke m nyere unu. 5Ọ bụrụkwa na unu ajụ ige ntị nʼokwu ndị ohu m bụ ndị amụma ahụ m ziteere unu site nʼoge ruo nʼoge (ndị unu nọgidekwara jụ ige ntị), 6mgbe ahụ, aga m eme ka ụlọnsọ a dịrị ka Shaịlo. Aga m emekwa ka obodo a bụrụ obodo a bụrụ ọnụ nʼetiti mba niile dị nʼụwa.’ ”
7Ndị nchụaja, na ndị amụma, na ndị mmadụ ndị ọzọ nọ nʼụlọnsọ Onyenwe anyị nụrụ mgbe Jeremaya kwuru okwu ndị a niile. 8Mgbe Jeremaya kwusiri okwu ndị ahụ Onyenwe anyị sị ya kwuo, ndị nchụaja ahụ, na ndị mmadụ ndị ọzọ, na ndị amụma ahụ niile, jidere ya sị ya, “Ị ghaghị ịnwụ! 9Gịnị mere i ji buo amụma na ụlọnsọ a ga-adị ka Shaịlo? Gịnịkwa mere i ji akwado na obodo a ga-aghọ mkpọmkpọ ebe, nke onye ọbụla na-agaghị ebikwa nʼime ya?” Nʼoge ahụ, ndị mmadụ ahụ niile gbara Jeremaya gburugburu nʼụlọnsọ Onyenwe anyị.
10Mgbe ndịisi ọchịchị Juda nụrụ ihe ndị a na-eme, ha sitere nʼụlọeze bilie pụọ, jee nʼụlọnsọ Onyenwe anyị. Mgbe ha ruru nʼebe ahụ, ha weere ọnọdụ nʼọnụ ụzọ ama ọhụrụ nke dị nʼụlọnsọ Onyenwe anyị. 11Mgbe ahụ, ndị nchụaja na ndị amụma gwara ndịisi ọchịchị ahụ okwu sị ha: “O kwesiri ka a maa nwoke a ikpe ọnwụ, nʼihi na o buru amụma megide obodo a. Unu onwe unu ji ntị unu nụrụ ihe o kwuru.”
12Mgbe ahụ, Jeremaya gwara ndịisi ọchịchị ahụ na mmadụ niile nọ nʼebe ahụ okwu sị ha, “Ọ bụ Onyenwe anyị zitere m ibu amụma megide ụlọnsọ a na obodo a. Okwu niile m kwuru, nke unu nụrụ, bụ ihe Onyenwe anyị ziri m ikwu. 13Ma ọ bụrụ na unu emee ka ụzọ unu na omume unu zie ezi, ọ bụrụ na unu erube isi nye Onyenwe anyị Chineke unu, mgbe ahụ, Onyenwe anyị ga-eme ka ihe ọjọọ ahụ o zubere na ọ ga-abịakwasị unu ghara ịbịakwasị unu. 14Ma nʼebe mụ onwe m nọ, lee adị m unu nʼaka, jirinụ m mee ihe ọbụla ziri unu ezi nʼanya nke dịkwa mma nʼanya unu. 15Ma ghọtakwanụ nke ọma, na ọ bụrụ na unu emee ka m nwụọ, unu ga-eweta ikpe ọmụma nke igbu onye aka ya dị ọcha nʼisi unu. Ikpe ọmụma ga-adịkwara obodo a na ndị bi nʼime ya, nʼihi na eziokwu, Onyenwe anyị zitere m ikwupụta na ntị unu okwu ndị a niile.”
16Mgbe ahụ, ndịisi ọchịchị na ndị mmadụ ahụ niile gwara ndị nchụaja na ndị amụma okwu sị ha, “O kwesighị ka a maa nwoke a ikpe ọnwụ nʼihi na ọ gwara anyị okwu site nʼaha Onyenwe anyị Chineke anyị.”
17Ụfọdụ nʼime ndị okenye nọ nʼebe ahụ pụtara nʼihu ọha mmadụ ahụ gwa ha okwu sị, 18“Maịka onye Moreshet buru amụma nʼoge Hezekaya, bụ eze Juda. Ọ gwara ndị Juda niile, sị ha, ‘Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru:
“ ‘A ga-akọgharị Zayọn dịka ala ubi.
Jerusalem ga-aghọ ebe e kpokọtara nkume na ngwongwo ụlọ dakpọrọ adakpọ,
ugwu nke ụlọnsọ ukwu ahụ ga-aghọ ebe dị elu nke oke ọhịa tochiri.’
19“Hezekaya bụ eze Juda, na ndị Juda niile, ha mere ya ka ọ nwụọ? Hezekaya ọ tụghị egwu Onyenwe anyị, rịọọ amara na ihuọma ya? Ọ bụ na Onyenwe anyị atụgharịghị uche, mee ka ihe ọjọọ o kwuru megide ya gharakwa imezu? Ma anyị na-achọ iwetara onwe anyị ihe ọjọọ nke oke mbibi.”
20(Ụraya nwa Shemaya, onye si Kiriat Jearim pụta, bụkwa onye ọzọ buru amụma site nʼaha Onyenwe anyị. Amụma o buru megide obodo a na ala a bụkwa ụdị amụma nke Jeremaya na-ebu. 21Mgbe Jehoiakim bụ eze na ndịisi ọchịchị nụrụ amụma Ụraya na-ebu, ha gbalịrị ijide ya gbuo ya, ma Ụraya nụrụ ihe ha zubere ime. Ya mere, Ụraya nụrụ ya gbapụ ọsọ gbalaa Ijipt nʼihi egwu. 22Ma eze bụ Jehoiakim, zipụrụ Elnatan nwa Akboa na ụfọdụ ndị ikom ọzọ ka ha gaa Ijipt jide Ụraya. 23Ha si nʼIjipt kpọlata Ụraya, duru ya gaa nʼihu Jehoiakim bụ eze, onye nyere iwu ka e jiri mma agha gbuo ya. A tụnyere ozu ya nʼebe a na-eli ndị mmadụ efu nʼala ahụ.)
24Ma otu ọ dị, Ahikam nwa Shefan, dịnyeere Jeremaya, nʼihi ya a raraghị Jeremaya nye nʼaka ndị mmadụ ka ha gbuo ya.

Você sabia?
O julgamento de Jeremias e os precedentes
- Quando sacerdotes e profetas exigiram a execução de Jeremias por profetizar a destruição do templo, alguns anciãos citaram o precedente de Miqueias de Moresete, ocorrido mais de um século antes. Durante o reinado do rei Ezequias, Miqueias havia proferido uma advertência semelhante contra Jerusalém, mas o rei buscou o favor do Senhor em vez de condená-lo à morte.Fontes: o próprio texto bíblico · Micah · Hezekiah
- O relato evidencia o perigo enfrentado por Jeremias ao contrastar seu caso com o de Urias, filho de Semaías, que proclamou a mesma mensagem. Ao ser perseguido por Joaquim, Urias fugiu para o Egito, mas o rei enviou oficiais para extraditá-lo, mandou executá-lo à espada e jogou seu corpo nas sepulturas do povo comum.Fontes: o próprio texto bíblico · Urijah · Jehoiakim
- Jeremias conseguiu escapar da morte em grande parte devido à proteção de Aicão, filho de Safã, um nobre influente cuja família havia auxiliado o rei Josias em suas reformas religiosas.Fontes: o próprio texto bíblico · Ahikam
Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.
Lugares deste capítulo
- Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículos 6, 9, 18
- Shiloh · Hoje: Khirbet Seilun · 32.056, 35.290 · versículos 6, 9
- New Gate · Hoje: in Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículo 10
- Mount Zion · 31.772, 35.229 · versículo 18
- Zion · Hoje: Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículo 18
- Kiriath-jearim · Hoje: Deir el Azar · 31.809, 35.104 · versículo 20
- Egypt · 30.129, 31.308 · versículos 21, 22, 23
Só aparecem lugares com identificação de alta confiança (90% ou mais segundo as fontes acadêmicas reunidas pelo OpenBible). Mapa da época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa atual: © colaboradores do OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org