Esdras 8
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.
Ndịisi ezinaụlọ niile so Ezra lọta
1Ndị a bụ usoro ọmụmụ ndịisi ezinaụlọ ahụ niile sooro m site na Babilọn laghachi mgbe Ataksekses bụ eze:
2ndị ikwu Finehaz,
Geshọm;
ndị ikwu Itama,
Daniel;
ndị ikwu Devid,
Hatush 3ndị ikwu Shekanaya;
ndị ikwu Parosh,
Zekaraya na narị mmadụ na iri ise (150) ndị so ya denye aha ha nʼakwụkwọ.
4Ndị ikwu Pahat-Moab,
Eliehoenai nwa Zerahaya dị narị mmadụ abụọ (200),
5ndị ikwu Zatu,
Shekanaya nwa Jahaziel na narị mmadụ atọ (300) so ya.
6Ndị ikwu Adin,
Ebed nwa Jonatan na iri mmadụ ise (50) so ya.
7Ndị sitere nʼikwu Elam,
Jeshaya nwa Atalaya, na iri ndị ikom asaa (70),
8ndị sitere nʼikwu Shefataya,
Zebadaya nwa Maikel, na iri ndị ikom asatọ (80).
9Ndị sitere nʼikwu Joab,
Ọbadaya nwa Jehiel na narị ndị ikom abụọ na iri na asatọ (218),
10ndị sitere nʼikwu Bani,
Shelomit nwa Josifaya na narị ndị ikom na iri isii (160).
11Ndị sitere nʼikwu Bebai;
Zekaraya nwa Bebai na ndị ikom iri abụọ na asatọ (28),
12ndị sitere nʼikwu Azgad,
Johanan nwa Hakatan na narị ndị ikom na iri (110).
13Ndị sitere nʼikwu Adonikam,
ndị ikpeazụ, ndị aha ha bụ Elifelet, na Jeuel na Shemaya na iri ndị ikom isii (60) bụ ndị so ha,
14ndị sitere nʼikwu Bigvai,
Utai na Zakua na iri ndị ikom asaa (70) bụ ndị so ha.
Nlọrute na Jerusalem
15Akpọkọtara m ha nʼakụkụ osimiri na-erubanye nʼAhava, anyị nọrọ nʼebe ahụ ụbọchị atọ. Mgbe m leruru anya nʼetiti ndị mmadụ zukọrọnụ, ha na ndị nchụaja bịara, a chọpụtara m na o nweghị ọ bụladị otu onye Livayị nọ nʼebe ahụ. 16Mgbe ahụ, ezigara m ozi kpọọ Elieza, Ariel, Shemaya, Elnatan, Jarib, Elnatan, Netan, Zekaraya na Meshulam, ndị bụ ndịisi. Ezikwara m ozi kpọọ Joiarib na Elnatan, bụ ndị maara ihe. 17Enyere m ha iwu ka ha gakwuru Ido, onyendu nọ na Kasifia. Agwara m ha ihe ha ga-agwa Ido na ndị Livayị ibe ya, bụ ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ dị na Kasifia, ka ha zite ndị ga-eje ozi ka ha bịakwute anyị maka ụlọnsọ Chineke. 18Chineke gosikwara anyị obiọma zitere anyị nwoke a na-akpọ Sherebaya na ụmụ ya, na ụmụnne ya, ndị ọnụọgụgụ ha dị iri na asatọ (18). Sherebaya bụ nwa Mahali, nwa Livayị nwa Izrel, bụrụkwa nwoke nwere ezi uche. 19Chineke sitere nʼikwu Merari zite Hashabaya, na Jeshaya, tinyere ụmụnne ya na ụmụ ha ndị ikom, ndị ọnụọgụgụ ha dị iri ndị ikom abụọ (20). 20Ha zitekwara narị abụọ na iri abụọ (220) site na ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ. Otu nke Devid na ndịisi ya họpụtara hiwee, maka inyere ndị Livayị aka. E deturu aha ha niile nʼotu nʼotu.
21Nʼebe ahụ, ka m nọ kpọsaa obubu ọnụ nʼakụkụ osimiri Ahava, nʼihi iweda onwe anyị ala nʼihu Chineke anyị, na ịrịọ ya ka o duo anyị, ụmụ anyị na akụ anyị niile, nʼụzọ ziri ezi nʼije anyị, ma nọnyekwara anyị. 22Nʼihi na ihere ekweghị m rịọ eze ka o dunyere anyị ndị agha, na ndị na-agba ịnyịnya ga-edu anyị, ichebe anyị nʼụzọ, site nʼaka ndị iro. Nʼihi na anyị agwalarị eze na Chineke, onye anyị na-efe, na-echebe ndị niile na-efe ya; gwakwa ya na oke iwe ya na-adakwasị ndị niile gbakụtara ya azụ. 23Ya mere, anyị buru ọnụ, kpee ekpere, rịọ Chineke ka o chebe anyị. O chebekwara anyị.
24Ahọpụtara m ndị nchụaja iri na abụọ ndị a: Sherebaya, Hashabaya na mmadụ iri ndị ọzọ bụ ụmụnna ha ka ha hụ maka ọlaọcha, na ọlaedo, na efere ọlaedo ahụ, na ihe ndị ọzọ ahụ eze na ndị na-adụ ya ọdụ, na ndịisi ọchịchị ya, na ụmụ Izrel niile nyere maka ụlọnsọ ukwu Chineke anyị. 25Eji m ihe ọtụtụ tụọ onyinye ọlaọcha na ọlaedo na ihe ndị ọzọ eze, na ndị ndụmọdụ ya, na ndịisi ozi ya, na ndị Izrel nyere maka ụlọnsọ ukwu Chineke. 26E jiri m ihe ọtụtụ tụnye ha ọlaọcha dị narị talenti isii na iri ise (ya bụ 650), na ngwongwo ọlaọcha dị otu narị talenti (ya bụ 100), na ọlaedo dị otu narị talenti (ya bụ 100). 27Iri efere ọlaedo abụọ (20) nke ọnụahịa ya bụ puku darik (1,000), tinyere efere bronz abụọ e hichaziri nke ọma, nke dị oke ọnụahịa dị ka efere ọlaedo.
28Emesịa, agwara m ha okwu sị ha, “Lee, unu onwe unu na ihe ndị a niile bụ ihe dị nsọ nye Onyenwe anyị. Ọlaọcha na ọlaedo ndị a bụkwa onyinye afọ ofufu e nyere Onyenwe anyị Chineke nna nna unu ha. 29Chenụ ha nche, debekwa ha nke ọma, tupu ruo mgbe unu ga-atụ ha nʼihu ndịisi nchụaja, na ndịisi Livayị, na ndịisi ụlọ nke Izrel nʼime Jerusalem, nʼime ụlọakụ nke ụlọ Onyenwe anyị.” 30Ya mere, ndị nchụaja na ndị Livayị kwenyere ibu ọlaọcha na ọlaedo, na ngwongwo ihe nsọ ndị ahụ, buga ha nʼụlọnsọ ukwu Chineke dị na Jerusalem.
31Anyị hapụrụ osimiri Ahava nʼụbọchị nke iri na abụọ nke ọnwa mbụ, chee ihu anyị ịga Jerusalem. Chineke nọnyekwaara anyị, dọpụta anyị site nʼaka ndị iro ọbụla, na nʼaka ndị ohi. 32Nʼikpeazụ, anyị rutere Jerusalem nʼudo, zukwaa ike ụbọchị atọ.
33Nʼụbọchị nke anọ, site nʼoge anyị ruru, e jiri ihe ọtụtụ tụọkwa ọlaọcha na ọlaedo ahụ, ha na ngwongwo ihe nsọ ndị ọzọ ahụ. E mere nke a nʼụlọnsọ ukwu Chineke. Ndị tụrụ ha bụ Meremot nwa Ụraya onye nchụaja, na Elieza nwa Finehaz. Jozabad nwa Jeshua, na Noadaya nwa Binui, ndị Livayị, sokwa tụọ ha. 34Ihe niile zuru ezu dịka ịdị arọ ha si dị. E dekwara ọnụọgụgụ ihe a tụpụtara nʼakwụkwọ nʼoge ahụ.
35Emesịa, onye ọbụla nʼime anyị si esi lọta chụụrụ Chineke Izrel aja nsure ọkụ. E ji oke ehi iri na abụọ chụọ aja maka ebo Izrel niile, ya na iri ebule itoolu na isii, na iri ụmụ ebule asaa na asaa. Ma e ji mkpi iri na abụọ chụọ aja mmehie. E jichakwa ha niile chụọ aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị. 36E nyere ndịisi ọrụ eze niile, na ndịisi ọchịchị niile dị nʼofe ọdịda anyanwụ osimiri Yufretis akwụkwọ iwu ahụ eze nyere. Ndịisi a nyekwara aka nʼọrụ iwughachi ụlọnsọ Chineke ahụ.
Você sabia?
A Jornada de Aava a Jerusalém
- Antes de partir da Babilônia, Esdras reuniu os exilados no canal que corre para Aava e percebeu que não havia levitas no grupo. Ele enviou uma delegação a Casifia para recrutar ministros para o templo, conseguindo trazer Serebias, Hasabias e mais de duzentos servos do templo.Fontes: o próprio texto bíblico · Ahava · Casiphia · Sherebiah
- Como Esdras havia afirmado ao rei persa que Deus protege aqueles que O buscam, teve vergonha de pedir uma escolta militar. Em vez disso, a comunidade jejuou junto ao canal de Aava para pedir proteção para o grupo, suas crianças e a valiosa carga de metais preciosos.Fontes: o próprio texto bíblico · Ahava
- O transporte das grandes ofertas—incluindo centenas de talentos de prata e ouro—foi confiado a doze sacerdotes e levitas líderes. Ao chegarem a Jerusalém, cada vaso sagrado e peso de metal foi meticulosamente verificado, registrado e entregue nas câmaras do templo.Fontes: o próprio texto bíblico · Jerusalem
Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.
Lugares deste capítulo
- Babylonia · 32.543, 44.422 · versículo 1
- Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículos 17, 29, 30, 31, 32
- Beyond the River · 31.777, 35.234 · versículo 36
Só aparecem lugares com identificação de alta confiança (90% ou mais segundo as fontes acadêmicas reunidas pelo OpenBible). Mapa da época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa atual: © colaboradores do OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org