Esdras 7
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.
Ezra abịaruo Jerusalem
1Mgbe nke a gasịrị, nʼoge ọchịchị Ataksekses bụ eze Peshịa. Ezra bụ nwa Seraya nwa Azaraya, Azaraya nwa Hilkaya, 2bụ nwa Shalum, nwa Zadọk, nwa Ahitub, 3nwa Amaraya, nwa Azaraya, nwa Meraiot, 4Meraiot nwa Zerahaya; Zerahaya nwa Uzi, Uzi nwa Buki; 5Buki nwa Abishua, Abishua nwa Finehaz; Finehaz nwa Elieza, Elieza nwa Erọn onyeisi nchụaja. 6Ezra a si Babilọn bịarute. Ọ bụ onye ọka nʼihe gbasara iwu ahụ Onyenwe anyị, Chineke Izrel nyere Mosis. Eze nyere ya ihe niile nke ọ rịọrọ, nʼihi na aka Onyenwe anyị Chineke ya dịkwasịrị nʼahụ ya. 7Ụfọdụ ndị Izrel, ndị nchụaja, ndị Livayị, ndị ọbụ abụ, ndị nche na ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ, soro ya jee Jerusalem nʼafọ asaa nke ọchịchị eze Ataksekses.
8Ezra bịaruru Jerusalem nʼọnwa nke ise, nke afọ asaa nke ọchịchị eze. 9Ọ hapụrụ Babilọn nʼabalị mbụ nke ọnwa mbụ, rute Jerusalem nʼabalị mbụ nke ọnwa ise nʼihi na Chineke nọnyeere ya. 10Nke a mere nʼihi na Ezra kpebiri nʼobi ya ịmụ, na idebe iwu Onyenwe anyị, na ịbụ onye ozizi nke okwu Chineke nye ụmụ Izrel.
Akwụkwọ ozi Ataksekses degara Ezra
11Nke a bụ ndepụta akwụkwọ ozi eze, bụ Ataksekses degaara Ezra onye nchụaja, na onye ozizi, na onye ọka nʼihe gbasara iwu na ụkpụrụ nke Onyenwe anyị nyere Izrel:
12Ataksekses, eze na-achị ndị eze ọzọ,
na-edegara Ezra akwụkwọ, bụ onye nchụaja, bụrụkwa onye nkuzi okwu Chineke nke eluigwe.
Ndeewo!
13Ugbu a, ana m enye iwu ka onye Izrel ọbụla bi nʼalaeze m, ma ndị nchụaja, na ndị Livayị, ndị wepụtara onwe ha ị soro gị gaa Jerusalem, ha nwere ike ịga. 14Eze na mmadụ asaa ndị na-adụ ya ọdụ na-eziga gị Juda na Jerusalem ka ị gaa leba anya nʼiwu Chineke nke dị gị nʼaka. 15Ọzọkwa, ịga e were onyinye ọlaedo na ọlaọcha ndị a eze na ndị ndụmọdụ ya ji afọ ofufu nye Chineke nke Izrel, onye ebe obibi ya dị na Jerusalem. 16Tinyere ọlaedo na ọlaọcha nke i nwere ike ịnata nʼala ahụ niile nʼakụkụ niile nke Babilọn, tinyekwara onyinye ihuọma si nʼaka ndị mmadụ, na ndị nchụaja niile, maka ụlọnsọ ukwu Chineke ha dị na Jerusalem. 17Ị ga-eji ego niile ndị a zụọ oke ehi, na ebule, na atụrụ, na onyinye mkpụrụ ọka, na onyinye ihe ọṅụṅụ, e ji achụ aja nʼebe ịchụ aja nke ụlọnsọ Chineke dị na Jerusalem.
18Ọ bụrụ na ego amapụta nʼime ya, gị na ụmụnne gị ga-eji ya mee ihe unu maara bụ uche Chineke unu. 19Ngwongwo niile e bunyere gị maka ije ozi nʼụlọnsọ Chineke, buru ha buruo nʼihu Chineke nke Jerusalem. 20Ma ihe ndị ọzọ nke fọdụrụ nʼihi ụlọnsọ Chineke gị, nke kwesiri na i mere, ị nwere ike site nʼụlọakụ eze mee ha.
21Mụ, bụ Ataksekses, na-eziga iwu a nye ndị na-elekọta ego nʼọdịda anyanwụ osimiri Yufretis sị ha, ihe ọbụla Ezra, onye nchụaja, na onye nkuzi okwu Chineke nke eluigwe chọrọ site nʼaka unu, unu nye ya. 22Ọ bụladị ruo ọlaọcha dị otu narị talenti, ya na narị akpa ọka wiiti ise, na narị galọọnụ mmanya vaịnị isii, na narị efa nke mmanụ oliv na nnu nʼọtụtụ ọbụla, dịka ọ chọrọ ya. 23Ihe ọbụla ọzọ, nke Chineke nke eluigwe chọrọ, ka e mee ha nʼụzọ kwesiri nye maka owuwu ụlọnsọ Chineke nke eluigwe. Nʼihi gịnị ka iwe Chineke ga-eji dakwasị eze na ụmụ ya ndị ikom? 24Ana m enyekwa iwu na ndị nchụaja niile, ndị Livayị niile, ndị ọbụ abụ niile, ndị nche niile, ndị ozi ụlọnsọ niile, na ndị ọzọ niile na-arụrụ Chineke ọrụ, agaghị atụ ụtụ ọbụla.
25“Ugbu a, Ezra, ị ga-eji amamihe Chineke gị nyere gị họpụta ndị ikpe, na ndịisi, ndị ga-achị obodo niile dị nʼọdịda anyanwụ nke osimiri Yufretis. Ọ bụrụ na ha amazighị iwu Chineke nke ọma, ị ga-akụziri ha. 26Ahụhụ ga-adịrị onye ọbụla jụrụ idebe iwu Chineke, na iwu eze, ga-abụ ọnwụ, maọbụ nchụpụ site nʼala ya gaa mba ọzọ, maọbụ ịnakọrọ ya ihe niile o nwere, maọbụ ịtụba ya nʼụlọ mkpọrọ.”
27Otuto dịrị Onyenwe anyị Chineke nna nna anyị ha, onye mere ka eze kpebie ime ka ụlọnsọ Onyenwe anyị dị na Jerusalem dị mma ile anya. 28Keleekwa Chineke onye nyere m ihuọma nʼihu ndị ndụmọdụ ya, na nʼihu ụmụ eze, bụ ndịisi ọchịchị dị ike. Nʼihi na aka Onyenwe anyị Chineke m nọnyeere m. Eji m obi ike chịkọta ndịisi site nʼIzrel ka ha soro m gaa.

Você sabia?
A missão de Esdras e o decreto de Artaxerxes
- Esdras é apresentado com uma genealogia sacerdotal que remonta a Arão por meio de Hilquias, o sumo sacerdote que encontrou o Livro da Lei no reinado de Josias. Descrito como um escriba versado, Esdras dedicou o coração a estudar a Lei do Senhor, a praticá-la e a ensinar seus decretos em Israel.Fontes: Ezra · Hilkiah · o próprio texto bíblico
- O monarca persa Artaxerxes é tradicionalmente identificado como Artaxerxes I Longímano, cujo sétimo ano de reinado corresponde a 458 a.C. Seu decreto real concedeu a Esdras ampla autoridade para liderar o retorno de israelitas, nomear magistrados a oeste do Eufrates e obter provisões e fundos do tesouro real.Fontes: Artaxerxes · Persia · o próprio texto bíblico
- Esdras e seus companheiros de viagem partiram da Babilônia no primeiro dia do primeiro mês e chegaram a Jerusalém no primeiro dia do quinto mês. A narrativa enfatiza que essa jornada terrestre de quatro meses teve êxito porque a mão benevolente de Deus estava sobre ele.Fontes: Ezra · o próprio texto bíblico
Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.
Lugares deste capítulo
- Babylon · 32.543, 44.422 · versículo 1
- Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículos 1, 6, 7, 8, 9, 13, 14, 15, 16, 17, 19, 27, 28
- Persia · 34.806, 48.516 · versículo 1
- Babylonia · 32.543, 44.422 · versículos 6, 9, 16
- Beyond the River · 31.777, 35.234 · versículos 21, 25
Só aparecem lugares com identificação de alta confiança (90% ou mais segundo as fontes acadêmicas reunidas pelo OpenBible). Mapa da época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa atual: © colaboradores do OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org