Deuteronômio 15
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.
Afọ inwere onwe
1Nʼọgwụgwụ afọ asaa ọbụla, ị ga-akagbu ụgwọ niile mmadụ ji gị. 2Otu a ka a ga-esi mee ya: Onye ọbụla e ji ụgwọ ga-akagbu ụgwọ niile onye Izrel ibe ya ji ya. Ọ gaghị elekwa anya na onye agbataobi ya maọbụ nwanna ya ga-akwụ ya ụgwọ ahụ, nʼihi na oge a na-ekwusa mgbaghara ụgwọ Onyenwe anyị eruola. 3Mgbaghara a erughị nʼebe ndị ọbịa nọ, ma ị ghaghị ịkagbu ụgwọ ọbụla nwanna gị ji gị. 4Otu ọ dị, o kwesighị ka ndị ogbenye dịrị nʼetiti gị, nʼihi nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị ka inweta dịka ihe nketa gị, ọ ga-agọzi gị nke ukwuu, 5ma ọ bụrụ na i rube isi nye Onyenwe anyị Chineke gị, ma lezie anya debe iwu ndị a niile m na-enye gị taa. 6Onyenwe anyị Chineke gị ga-agọzi gị dịka o kwere na nkwa. Ị ga-agbazinye ọtụtụ mba ego, ị gaghị anọ nʼụkọ! Ị ga-achị ọtụtụ mba, ma ha agaghị achị gị.
7Ma mgbe ị banyere nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke unu na-enye gị, a sị na e nwee onye ogbenye nʼetiti gị, nke bụ onye Izrel ibe gị, ị gaghị emechi obi gị maọbụ kechie aka gị megide ya, 8ị ghaghị ịgbazinye ya ihe dị ka o si chọọ. 9Lezie anya ka ị ghara inwe ụdị echiche ọjọọ a nʼobi gị sị, “Afọ mgbaghara ụgwọ na-abịa nso,” nʼihi ya, i kechie obi gị jụ ibinye nwanna gị nọ na mkpa ihe ọ chọrọ. Ọ bụrụ na onye ahụ nọ na mkpa akwaa akwa kpọkuo Onyenwe anyị, a ga-agụ gị dịka onye ikpe mmehie mara. 10Ị ghaghị inye ha site nʼafọ ofufu, meekwa nke a na-enweghị obi ilu, mgbe ahụ, nʼihi nke a, Onyenwe anyị bụ Chineke gị ga-agọzi gị nʼọrụ gị niile nakwa ihe niile nke ị tinyere aka na ya. 11A ghaghị inwe ndị ogbenye nʼetiti unu, ọ bụ ya mere iwu a jiri dị mkpa. Gbasapụ aka nʼebe nwanna gị na nʼebe ndị ogbenye na ndị nọ na mkpa nọ.
Mmeso a na-emeso ndị ohu
12Ọ bụrụ na onye Hibru ibe gị, ndị nwoke maọbụ ndị nwanyị, eresi gị onwe ha, gbakwaara gị odibo afọ isii, nʼafọ nke asaa, ị ghaghị ịhapụ ha ka ha nwere onwe ha. 13Mgbe ọ hapụrụ ụlọ gị, ezipụkwala ya nʼaka efu! 14Ị ga-esite nʼigwe anụ ụlọ gị, na nʼebe ịzọcha ọka gị, na nʼebe ịzọcha vaịnị gị, nye ya onyinye pụrụ iche iji sị ya laa nʼudo. Nye ya onyinye a dịka Onyenwe anyị Chineke gị si gọzie gị. 15Cheta na ị bụrị ohu nʼala Ijipt ma Onyenwe anyị bụ Chineke gị gbapụtara gị. Ọ bụ nʼihi ya ka m ji na-enye gị iwu a taa.
16Ma ọ bụrụ na ohu gị asị gị, “Achọghị m ịhapụ gị,” nʼihi na ọ hụrụ gị na ndị ụlọ gị nʼanya, hụkwa na ihe na-agara gị na ya nke ọma, mgbe gị na ya nọ. 17Were agịga kpọpuo ntị ya nʼọnụ ụzọ ụlọ gị. Ọ ga-abụkwara gị ohu ogologo ndụ ya niile. Otu aka ahụ kwa ka ị ga-eme ohu gị nwanyị.
18Enwela obi mwute mgbe ọbụla ị na-ahapụ ohu gị ka o nwere onwe ya, nʼihi na ị ga-echeta na ọ rụụrụ gị ọrụ afọ isii, ihe i mefukwara erughị ọkara ihe ị gaara eji goo ndị ọrụ. Onyenwe anyị Chineke gị ga-agọzikwa gị nʼihe niile ị na-eme.
Anụ ụlọ e bụ ụzọ mụọ
19Nwa oke ehi ọbụla maọbụ nwa atụrụ ọbụla maọbụ nwa ewu ọbụla e bụ ụzọ mụọ nʼime igwe anụ ụlọ gị ka ị ga-edo nsọ nye Onyenwe anyị Chineke gị, ejila nwa mbụ nke ehi gị e buru ụzọ mụọ arụ ọrụ ubi, akpachakwala ajị nwa ewu maọbụ nwa atụrụ ọbụla e buru ụzọ mụọ dị nʼime igwe ewu na atụrụ gị. 20Gị na ezinaụlọ gị ga-eri anụ ndị a nʼihu Onyenwe anyị Chineke gị afọ ọbụla nʼebe ọ họpụtara. 21Ma ọ bụrụ na nwa anụ ọbụla e buru ụzọ mụọ nwere nkwarụ, dịka ngwụrọ maọbụ ìsì maọbụ nkwarụ ọbụla nke jọrọ njọ, ị gaghị eji ya achụ aja nye Onyenwe anyị Chineke gị. 22Kama, ka ọ bụrụ ihe oriri nye ezinaụlọ gị nʼime ụlọ gị. Onye ọbụla, ma ndị dị ọcha ma onye rụrụ arụ nʼoge ahụ ga-eri ya, dịka onye ọbụla pụrụ iri anụ ele maọbụ anụ mgbada. 23Ma erila ọbara ya. Wụsa ya nʼala dịka mmiri.
Você sabia?
Dívidas, Servos e Ofertas de Primogênitos
- A cada sete anos, os israelitas deviam perdoar as dívidas de seus compatriotas. Os credores foram expressamente advertidos a não negar empréstimos apenas porque o sétimo ano de remissão estava se aproximando.Fontes: o próprio texto bíblico
- Os servos hebreus que completavam seis anos de serviço deviam ser libertados no sétimo ano e supridos generosamente com rebanhos, cereais e vinho. Se o servo escolhesse ficar voluntariamente por afeição à casa, o senhor furava a orelha dele contra a porta com uma sovela como sinal de servidão permanente.Fontes: o próprio texto bíblico
- Os machos primogênitos do gado e dos rebanhos eram consagrados a Deus e não podiam ser postos a trabalhar nem tosquiados. Os animais sem defeito eram consumidos anualmente no santuário escolhido, enquanto os que tinham defeitos podiam ser comidos em casa por qualquer pessoa.Fontes: o próprio texto bíblico
Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.
Lugares deste capítulo
- Egypt · 30.129, 31.308 · versículo 15
Só aparecem lugares com identificação de alta confiança (90% ou mais segundo as fontes acadêmicas reunidas pelo OpenBible). Mapa da época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa atual: © colaboradores do OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org