Nations Bible

Deuteronômio 10

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.

Mbadamba nkume abụọ ọzọ

1Nʼoge ahụ, Onyenwe anyị gwara m, sị, “Wapụta mbadamba nkume abụọ dịka nke mbụ, were ha bịakwute m nʼelu ugwu. Ọzọ, wuokwara onwe gị igbe osisi. 2Aga m edekwasị nʼelu mbadamba nkume ndị a, okwu niile nke dị nʼelu mbadamba nkume ndị mbụ, bụ nke ị tụpịasịrị. Ị ga-etinyekwa ha nʼime igbe ahụ.”

3Ya mere, eji m osisi akashia kwaa igbe ahụ. A wapụtakwara m mbadamba nkume abụọ yiri ndị nke mbụ, were ha rigoro ugwu ahụ. 4Onyenwe anyị dere nʼelu mbadamba nkume ahụ ihe ndị ahụ o dere na mbụ, bụ iwu iri ndị ahụ o gwara unu nʼelu ugwu site nʼime ọkụ, nʼụbọchị mkpọkọta ahụ. Onyenwe anyị nyekwara m ha. 5Mgbe m si nʼugwu ahụ rịdata, etinyere m mbadamba nkume abụọ ahụ nʼime igbe ahụ m kwara, dịka Onyenwe anyị nyere m nʼiwu. Ha dịkwa nʼebe ahụ ruo taa.

6(Ụmụ Izrel gara ije site nʼolulu mmiri nke Bene Jaakan garuo Mosera, nʼebe ahụ ka Erọn nọ nwụọ, e lie ya nʼebe ahụ. Elieza, bụ ọkpara ya nọchiri ọnọdụ ya dịka onye nchụaja. 7Site nʼebe ahụ, ha gagidere ije ruo Gudgoda, sitekwa na ya ruo Jotbata, ala nke iyi na-asọ asọ juru nʼime ya. 8Nʼoge ahụ, Onyenwe anyị kewapụtara ebo Livayị ibu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, na iguzo nʼihu Onyenwe anyị ijere ya ozi na ikwupụta ngọzị nʼaha ya, dịka ha sị eme ruo taa. 9Ọ bụ nke a mere ndị Livayị enweghị oke maọbụ ihe nketa nʼetiti ndị Izrel ibe ha; Onyenwe anyị bụ ihe nketa ha, dịka Onyenwe anyị Chineke unu gwara ha.)

10Ugbu a, anọọla m nʼelu ugwu ahụ iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị, dịka m mere nʼoge mbụ, Onyenwe anyị gekwara m ntị nʼoge ugbu a. Ọ bụghị ọchịchọ Onyenwe anyị ibibi unu. 11Onyenwe anyị gwara m, “Bilie, gaa ka i duru ndị a gaa na njem ha, ka ha banye, ma nwetakwa ala ahụ nke m kwere nna nna ha na nkwa inye ha.”

Sọpụrụ Onyenwe anyị

12Ugbu a, Izrel, gịnị ka Onyenwe anyị Chineke gị na-ana nʼaka gị ma ọ bụghị ka ị tụọ egwu Onyenwe anyị bụ Chineke gị, jee ije na nrube isi nye ya, ịhụ ya nʼanya, na iwere obi gị niile na mmụọ gị niile fee ya ofufe, 13na ilezi anya debezuo iwu na ụkpụrụ Onyenwe anyị, ndị m na-enye gị taa, nʼihi ọdịmma gị.

14Ụwa na eluigwe na ebe niile kachasị elu nke eluigwe, na ihe niile dị nʼime ha, bụ nke Onyenwe anyị Chineke gị. 15Ma Onyenwe anyị nwere mmasị nʼahụ nna nna unu ha, hụkwa ha nʼanya, ọ họrọ unu, na naanị ụmụ ha niile, site nʼetiti mba niile dịka ọ dị taa. 16Nʼihi nke a, biekwanụ obi unu ugwu, kwụsịkwanụ ibi ndụ nke isiike. 17Nʼihi na Onyenwe anyị, bụ Chineke unu bụ Chineke kachasị chi niile, bụrụkwa Onyenwe kachasị ndị nwenụ niile. Chineke ukwu ahụ, onye dị ike dịkwa egwu, onye na-adịghị ele mmadụ anya nʼihu, ọ nakwaghị eri ngarị. 18Ọ na-alụrụ ndị na-enweghị nna, na ụmụ nwanyị na-enweghị di ọgụ. Ọ na-ahụ ndị ọbịa nʼanya, na-enyekwa ha nri na uwe. 19Ya mere, unu onwe unu kwa, hụnụ ndị ọbịa nʼanya, nʼihi na unu onwe unu bụrụrị ndị ọbịa nʼala Ijipt. 20Tụọ Onyenwe anyị Chineke gị egwu, feekwa ya ofufe. Ya ka ị ga-arapara nʼahụ, ọ bụkwa naanị nʼaha ya ka ị ga-aṅụ iyi. 21Ọ bụ ya bụ onye ị ga-eto otuto, ọ bụ ya bụ Chineke gị, onye rụrụ gị ọrụ ndị ahụ dị oke egwu na ebube, nke gị onwe gị ji anya gị hụ. 22Nna nna unu ndị gara nʼIjipt dị naanị iri mmadụ asaa, ma ugbu a, Onyenwe anyị Chineke gị emeela ka ịmụbaa dịka kpakpando nke mbara igwe.

Você sabia?

Novas Tábuas de Pedra e o Chamado à Obediência

  • Depois de quebrar o primeiro conjunto de tábuas por causa do bezerro de ouro, Moisés recebeu a ordem de lavrar duas novas tábuas de pedra e fazer uma arca de madeira de acácia para guardá-las. Essas novas tábuas, contendo os Dez Mandamentos, foram colocadas na arca, onde permaneceram.Fontes: o próprio texto bíblico
  • A tribo de Levi foi separada para tarefas sagradas, como transportar a arca da aliança, servir perante o Senhor e abençoar em Seu nome. Por causa dessa dedicação exclusiva ao serviço religioso, Levi não recebeu porção territorial ou herança de terras entre as outras tribos de Israel.Fontes: o próprio texto bíblico · Levi (patriarch)
  • Moisés lembrou a Israel de suas origens modestas, recordando que seus antepassados eram apenas setenta pessoas ao descerem para o Egito. O povo foi instruído a fazer justiça aos órfãos e às viúvas e a amar os estrangeiros, lembrando que eles próprios haviam sido estrangeiros no Egito.Fontes: o próprio texto bíblico · Egypt

Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.

Lugares deste capítulo

  • Beeroth Bene-jaakan · Hoje: Birein · 30.792, 34.473 · versículo 6
  • Egypt · 30.129, 31.308 · versículos 19, 22

Só aparecem lugares com identificação de alta confiança (90% ou mais segundo as fontes acadêmicas reunidas pelo OpenBible). Mapa da época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa atual: © colaboradores do OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Fale com a gente

Conte de onde você lê, como a Bíblia tem te ajudado ou o que podemos melhorar. Lemos todas as mensagens.