Atos 23
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.
Pọl nʼihu nzukọ ndị Juu
1Mgbe Pọl legidere ndị nzukọ a anya, ọ sịrị, “Ụmụnna m, mụ onwe m ejirila ezi akọnuche bie ndụ m niile nʼihu Chineke ruokwa ụbọchị taa.” 2Nke a mere, Ananayas onyeisi nchụaja nyere iwu ka ndị nọ ya nso tie ya aka nʼọnụ. 3Ma Pọl, sịrị ya, “Otu a ka Chineke ga-esi tie gị, gị mgbidi e tere nzu. Ụdị onye ikpe dị aṅaa ka ị bụ i ji na-emebi iwu nʼonwe gị site nʼinye iwu ka e si otu a tie m ihe?”
4Ndị guzo ya nso sịrị, “Ị na-ekwutọ onyeisi nchụaja Chineke?”
5Ma Pọl sịrị, “Aghọtaghị m, ụmụnna m na ọ bụ onyeisi nchụaja. Nʼihi na akwụkwọ nsọ kwuru sị, ‘Ekwula okwu ọjọọ ọbụla megide onye na-achị ndị nke gị.’”
6Mgbe Pọl chọpụtara na otu ụzọ nʼime nzukọ ahụ bụ ndị otu Sadusii, ebe ndị ọzọ bụkwa ndị Farisii, o tiri mkpu nʼime nnọkọ ahụ sị, “Ụmụnna m, abụ m onye Farisii na nwa ndị Farisii. A na-ekpe m ikpe taa nʼihi olileanya m nwere na mbilite nʼọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ.” 7Mgbe o kwusiri nke a esemokwu dapụtara nʼetiti ndị Farisii na ndị Sadusii. Ọgbakọ ahụ kewara. 8Nʼihi na ndị Sadusii na-asị na mbilite nʼọnwụ maọbụ mmụọ ozi maọbụ mmụọ ọbụla adịghị. Ma ndị Farisii kweere nʼihe ndị a niile.
9Mkpọtụ malitere na-ada ike ike. Ụfọdụ ndị ozizi iwu so nʼotu ndị Farisii biliri ọtọ malite ịrụ ụka nʼoke olu sị, “Anyị ahụghị ihe ọjọọ nʼebe nwoke a nọ, ma gịnịkwa ma ọ bụrụ na ọ bụ mmụọ, maọbụ mmụọ ozi gwara ya okwu?” 10Esemokwu a bịara karịa, nke mere na onyeisi ọchịagha tụrụ egwu na ha ga-adọkasị Pọl. Ọ gwara ndị agha ya ka ha banye were ike kpọpụta ya, ziga ya nʼogige ndị agha.
11Nʼabalị ya, Onyenwe anyị bịakwutere ya sị, “Nwee obi ike, dịka i si gbaa ama banyere m na Jerusalem, ị ghaghị ịgbakwara m ama na Rom.”
Izuzu igbu Pọl
12Nʼụtụtụ echi ya ụfọdụ ndị Juu zukọtara gbaa izu, ṅụọkwa iyi na ha agaghị eri nri maọbụ ṅụọ ihe ọbụla tutu ruo mgbe ha gburu Pọl. 13Ndị zukọtara gbaa izu ọjọọ a karịrị iri mmadụ anọ. 14Ha jekwuuru ndịisi nchụaja ha na ndị okenye, sị ha, “Anyị kwekọtara ịhapụ iri maọbụ ịṅụ ihe ọbụla tutu ruo mgbe anyị gburu Pọl. 15Ugbu a, unu na nzukọ zienụ onyeisi ọchịagha ka ọ kpọpụtara unu ya. Meenụ ka unu na-achọ ịjụpụtasị eziokwu nʼọnụ ya nakwa itule ikpe ya nke ọma. Anyị dị njikere igbu ya nʼụzọ tupu ọ bịaruo unu nso.”
16Ma nwa nwanne nwanyị Pọl nụrụ maka izuzu ọjọọ a. Ọ banyere nʼogige ndị agha kọọrọ Pọl.
17Pọl kpọrọ otu nʼime ndịisi agha ahụ gwa ya, “Biko kpọrọ nwokorobịa a gaa nʼebe ọchịagha nọ, o nwere okwu dị mkpa ọ chọrọ ịgwa ya.” 18Ọ kpọọrọ ya jekwuru onyeisi agha, sị.
“Pọl, onye mkpọrọ, kpọrọ m rịọ m ka m kpọtara gị nwokorobịa a nʼihi na o nwere ihe ọ chọrọ ịgwa gị.”
19Onyeisi agha ahụ duuru ya nʼaka ya gaa nʼakụkụ ọzọ jụọ ya, “Gịnị bụ ihe ị chọrọ ịkọrọ m?”
20Ọ sịrị, “Ndị Juu ụfọdụ ekwekọrịtala ịrịọ gị ka ị kpọpụta Pọl echi na nzukọ ụlọ ikpe. Ha ga-eme dịka ha nwere ihe dị mkpa ha chọrọ ịjụta ya. 21Ma aṅala ha ntị. Nʼihi na ihe karịrị iri mmadụ anọ na-ezo onwe ha na-eche inwude ya. Ndị a gbara ndụ na ha agaghị eri maọbụ ṅụọ ihe ọbụla tutu ruo mgbe ha gburu ya. Ha adịla njikere, ihe a na-eche bụ mkpebi gị nye arịrịọ ha.”
22Ọchịagha ahụ zilagara nwokorobịa ahụ site nʼinye ya iwu, “Emekwala ka onye ọbụla mata na ị bịara gwa m ihe dị otu a.”
Pọl agaa Sizaria
23Mgbe e mesịrị, ọ kpọrọ mmadụ abụọ nʼime ndịisi agha nye ha iwu sị, “Gaanụ jikere narị ndị agha abụọ, na iri mmadụ asaa ndị na-agba ịnyịnya, tinyere narị ndị ikom abụọ ndị na-ama ùbe, ndị ga-aga Sizaria nʼelekere itoolu nke abalị a. 24Nyekwa Pọl ịnyịnya nke ọ ga-agba, ka e nwee ike duru ya gakwuru Feliks bụ gọvanọ nʼudo.”
25O dere akwụkwọ nʼolu dị otu a:
26Klọdiọs Lisias,
Na-edegara Feliks onye nsọpụrụ na-adịrị, onye na-achị akụkụ a.
Ana m ekele gị.
27Ndị Juu jidere nwoke a chọọ igbu ya, ma mgbe m nụrụ na ọ bụ onye Rom, mụ na ndị agha m bịara napụta ya nʼaka ha. 28Achọrọ m ịmata ihe mere ha ji ebo ya ebubo, nʼihi ya eduuru m ya gaa nʼọgbakọ ndị okenye ha. 29Ma achọpụtara m na ọ bụ ihe banyere iwu ha. Nʼeziokwu, o nweghị ihe ọbụla kwesiri iji tụọ ya mkpọrọ maọbụ ọnwụ nʼime ebubo ahụ. 30Mgbe a gwara m banyere izuzu a na-agba megide nwoke a, ezitere m gị ya nʼegbughị oge. Enyekwara m ndị niile na-ebo ya ebubo iwu, ka ha bịa nʼihu gị kpee ọnụ ha.
31Ya mere, nʼabalị ahụ, ndị agha dubatara Pọl na Antipatris dịka e nyere ha nʼiwu. 32Nʼechi ya, ha hapụrụ ya na ndị na-agba nʼelu ịnyịnya ka ha duru ya gawa, ebe ha laghachiri nʼogige ndị agha. 33Mgbe ha bịarutere Sizaria, ha nyere onyeisi obodo ahụ akwụkwọ ozi, ma kpọnyekwa ya Pọl. 34Gọvanọ ahụ gụrụ akwụkwọ ozi ahụ, jụọ ya akụkụ ala o si pụta. Mgbe ọ matara na ọ bụ onye Silisia, 35ọ sịrị ya, “Aga m enye okwu gị ezigbo ohere mgbe ndị na-ebo gị ebubo bịara.” O nyekwara iwu ka e debe ya nʼobi Herọd nʼaka ndị nche.

Você sabia?
Paulo diante do Sinédrio e a caminho de Cesareia
- Ananias era o sumo sacerdote perante quem Paulo foi levado enquanto Félix era procurador. Depois que Paulo disse que se havia conduzido diante de Deus com toda a boa consciência, Ananias ordenou aos que estavam por perto que o ferissem na boca; Paulo chamou-o de parede branqueada e, quando protestaram que ele havia insultado o sumo sacerdote de Deus, respondeu que não sabia que Ananias ocupava esse cargo. O Easton's Bible Dictionary (1897) observa que essa resposta tem ocasionado certa dificuldade.Fontes: Ananias (High Priest) · o próprio texto bíblico
- Mais de quarenta homens se comprometeram sob juramento a não comer nem beber até que matassem Paulo, e soldados o levaram de noite de Jerusalém até Antipátride. Antipátride, construída por Herodes, o Grande, e nomeada em honra de seu pai Antipater, ficava na grande estrada romana de Cesareia a Jerusalém, a cerca de vinte e oito milhas de Cesareia. Cesareia, na costa do Mediterrâneo, a cerca de setenta milhas a noroeste de Jerusalém, era a capital da província romana da Judeia e a sede dos procuradores.Fontes: o próprio texto bíblico · Antipatris · Caesarea
- Cláudio Lísias, descrito pelo Easton's Bible Dictionary como um grego que havia comprado a cidadania romana e tomado o nome de Cláudio, escreveu ao governador Félix que as acusações envolviam questões da lei judaica e que não havia acusação digna de morte ou prisão. Félix, o procurador romano da Judeia, perguntou de que província Paulo era; ao saber que era da Cilícia, onde Tarso, cidade natal de Paulo, era uma das principais cidades, ordenou que Paulo fosse mantido sob guarda no Pretório de Herodes até que os acusadores chegassem.Fontes: Claudius Lysias · Felix · Cilicia · o próprio texto bíblico
Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.
Lugares deste capítulo
- Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículo 11
- Rome · 41.892, 12.485 · versículo 11
- Caesarea · Hoje: Caesarea Maritima · 32.500, 34.892 · versículos 23, 32, 33
- Aphek · Hoje: Tell Ras el Ain · 32.105, 34.930 · versículo 31
- Cilicia · 36.913, 34.892 · versículo 34
Só aparecem lugares com identificação de alta confiança (90% ou mais segundo as fontes acadêmicas reunidas pelo OpenBible). Mapa da época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa atual: © colaboradores do OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org