Atos 22
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.
1“Ụmụnna m na ndị nna anyị, geenụ m ntị mgbe m na-agọrọ onwe m nʼihu unu.”
2Mgbe ha nụrụ na ọ na-agwa ha okwu nʼasụsụ Hibru, ha deere duu karịa.
Mgbe ọ sịrị, 3“Abụ m onye Juu. Amụrụ m na Tasọs nʼime Silisia. Azụrụ m na obodo a nʼụkwụ Gamaliel onye nkuzi m. Anatara m ọzụzụ dị ike na ịsọpụrụ iwu nke nna nna anyị ha ejikwa m ịnụ ọkụ nʼobi na-efe Chineke dịka unu niile si eme taa. 4Akpagburu m ndị niile na-eso ụzọ ọhụrụ a, na-etinye ha nʼaka ọnwụ. Ejidere m ndị ikom na ndị inyom ha tụbakwa ha nʼụlọ mkpọrọ. 5Ma dịka onyeisi nchụaja na nzukọ ndị okenye niile pụrụ ịgbara m akaebe. Anatakwara m nʼaka ha akwụkwọ ozi e deere ụmụnna anyị nọ na Damaskọs. Agara m ebe ahụ ịkpụta ha nʼagbụ bịa Jerusalem maka ịta ha ahụhụ.
Akụkọ nchegharị Pọl
6“Nʼetiti ehihie, mgbe m na-aga nʼụzọ, nʼebe dị Damaskọs nso, oke ìhè nke si nʼeluigwe, chara gburugburu m. 7Adara m nʼala ma nụkwa olu gwara m okwu sị m, ‘Sọl, Sọl, gịnị mere i ji na-akpagbu m?’
8“ ‘Onye ka ị bụ Onyenwe m?’ Ka m jụrụ.
“Ọ sịrị m, ‘Abụ m Jisọs onye Nazaret onye ị na-akpagbu.’ 9Ndị mụ na ha so hụkwara ìhè ahụ, ma ha anụghị olu onye ahụ na-agwa m okwu.
10“Asịrị m, ‘Gịnị ka m ga-eme Onyenwe anyị?’
“Onyenwe anyị sịrị m, ‘Bilie banye Damaskọs; nʼebe ahụ a ga-agwa gị ihe niile a kwadobere na ị ga-eme.’ 11Nʼihi na-enweghị m ike ịhụ ụzọ nʼihi ebube ìhè ahụ chachiri m anya. Ya mere ndị mụ na ha so sekpụụrụ m nʼaka bata na Damaskọs.
12“Nʼebe ahụ ka Ananayas bi, bụ onye anyị pụrụ ịgụ nʼonye ezi omume nʼihi idebe iwu. O nwekwara ọgbụgba ama dị mma site nʼọnụ ndị Juu bi nʼebe ahụ. 13Ọ bịakwutere m, guzoro nʼakụkụ m sị, ‘Nwanna anyị Sọl, ka emee ka ị hụ ụzọ!’ Otu mgbe ahụ, e nwetara m ike ịhụ ụzọ, m hụkwara ya.
14“Mgbe ahụ, ọ sịrị, ‘Chineke nke nna nna anyị ha ahọpụtala gị ịmara uche ya na ịhụ Onye Ezi Omume ahụ na ịnụta okwu site nʼọnụ ya. 15Ị ga-abụ onyeama ya nye ndị niile banyere ihe ị hụrụ na ihe ị nụrụ. 16Ma ugbu a, gịnị ka ị na-eche? Bilie ọtọ, ka e mee gị baptizim, ka a sachakwa gị site na mmehie, na-akpọkukwa aha ya.’
Pọl onyeozi nye ndị mba ọzọ
17“Mgbe m lọghachikwara na Jerusalem, nọrọ na-ekpe ekpere nʼụlọnsọ ukwu ahụ, ahụrụ m ọhụ, 18ebe ọ na-agwa m, ‘Mee ngwa! Hapụ Jerusalem, nʼihi na ndị bi nʼala a agaghị anara ọgbụgba ama gị banyere m.’
19“Ma asịrị m, ‘Onyenwe anyị, ndị a maara nke ọma na m na-aga nʼụlọ nzukọ nʼotu nʼotu, na-atụba ndị kwere na gị nʼụlọ mkpọrọ, na-etikwa ha ihe. 20Nʼoge a na-awụfu ọbara onyeama gị bụ Stivin, eguzo m nso na-akwado nʼihe emere dị mma, ma na-elekọtakwa uwe ndị ahụ tụgburu ya anya.’
21“Mgbe ahụ, ọ sịrị m, ‘Gawa; nʼihi na aga m ezipu gị ebe dị anya ijekwuru ndị mba ọzọ.’ ”
Pọl onye Rom
22Ha ṅara ya ntị ruo ugbu a. Mgbe ahụ, ha niile tiri mkpu nʼotu olu sị, “Wepụnụ onye dị otu a nʼụwa! O kwesighị ka onye dị otu a dịrị ndụ!”
23Ha tiri mkpu na-atụli uwe mgbokwasị ha elu, na-achilikwa aja nʼala na-efesasị ya ebe niile, 24ọchịagha ahụ nyere iwu ka a kpụgaa ya nʼogige ndị agha, pịa ya ụtarị, ka eziokwu pụta ya nʼọnụ. Ọ chọrọ ịmata ihe mere ha ji eti mkpu otu a megide ya. 25Ma mgbe ha chịịrị ụdọ akpụkpọ kechaa ya, Pọl sịrị onye agha guzo ya nso, “Ọ bụ ihe ziri ezi nʼiwu na unu ga-eti nwa afọ Rom ihe, onye na-enweghị ikpe a mara ya?”
26Mgbe onye agha a nụrụ okwu a, o jekwuuru ọchịagha ahụ sị, “Gịnị ka ị na-aga ime? Nwoke a bụkwa onye Rom.”
27Ọchịagha ahụ bịakwutere sị ya, “Gwa m, ị bụ onye Rom?”
Ọ sịrị, “E.”
28Ọchịagha ahụ zara, “ma o furu m ego dị ukwuu iji bụrụ onye Rom.”
Ma Pọl sịrị, “Amụrụ m dịka nwa afọ ala a.”
29Ndị ahụ chọrọ ịgba ya ajụjụ ọnụ mere ngwangwa wezuga onwe ha. Egwu tụkwara ọchịagha nʼonwe ya mgbe ọ matara na ọ bụ nwa afọ Rom, nʼihi na o keela ya rịị agbụ na mbụ.
Pọl nʼihu ndị ikpe
30Nʼechi ya, ebe ọ chọrọ ịmata ihe bụ isi okwu na ihe mere ndị Juu ji ebo ya ebubo, o nyere iwu ka ndịisi nchụaja na ndị ụlọ ikpe ha zukọọ. Mgbe ahụ, o dupụtara Pọl, mee ka o guzo nʼihu ha.

Você sabia?
A defesa de Paulo em Jerusalém
- Paulo começou sua defesa em hebraico, e a multidão ficou ainda mais silenciosa. Apresentou-se como judeu, nascido em Tarso da Cilícia, criado em Jerusalém e educado aos pés de Gamaliel, em estrita conformidade com a lei dos pais. Um dicionário descreve Gamaliel como um fariseu erudito, neto do rabino Hilel e presidente do Sinédrio nos reinados de Tibério, Calígula e Cláudio.Fontes: o próprio texto bíblico · Gamaliel
- Paulo recordou que prendeu e espancou crentes, e que esteve ali aprovando, enquanto guardava as vestes dos que mataram Estêvão. Um dicionário chama Estêvão, um dos sete diáconos, de primeiro mártir cristão, e observa que os apedrejadores depositaram as roupas aos pés do jovem fariseu Saulo de Tarso, cena que deixou uma impressão profunda, a qual Paulo recorda neste discurso.Fontes: o próprio texto bíblico · Stephen
- A multidão ouviu Paulo até ele dizer que seria enviado para longe, aos gentios; então gritaram que ele não era digno de viver, atiraram os mantos e lançaram poeira para o ar. Quando o estenderam para amarrá-lo, ele perguntou ao centurião se era lícito açoitar um cidadão romano sem julgamento, e disse ao comandante que havia nascido cidadão, enquanto o comandante havia pago um alto preço pela dele. Uma cronologia data este testemunho, e sua apresentação diante do Conselho no dia seguinte, de 54 d.C.Fontes: o próprio texto bíblico · Paul gives his testimony · Paul goes before the Council
Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.
Lugares deste capítulo
- Cilicia · 36.913, 34.892 · versículo 3
- Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículos 3, 5, 17, 18
- Tarsus · 36.913, 34.892 · versículo 3
- Damascus · 33.511, 36.306 · versículos 5, 6, 10, 11, 12
- Nazareth · 32.702, 35.298 · versículo 8
Só aparecem lugares com identificação de alta confiança (90% ou mais segundo as fontes acadêmicas reunidas pelo OpenBible). Mapa da época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa atual: © colaboradores do OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org