2 Pedro 3
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.
Ụbọchị nke Onyenwe anyị
1Ndị enyi m, nke a bụ akwụkwọ nke abụọ m na-edetara unu. Nʼime ha abụọ, ihe m mere bụ ichetara unu ihe ndị ahụ niile unu maara na itute uche unu banyere echiche zuruoke. 2Achọrọ m ka unu cheta okwu ndị amụma dị nsọ kwuru mgbe ochie na iwu nke Onyenwe anyị na Onye nzọpụta anyị nyere site na ndị ozi ya.
3Na mbụ, unu ga-amata nke a, na nʼoge ikpeazụ, ndị na-akwa emo ga-apụta, site nʼịkwa emo gbaso agụ ihe ọjọọ niile nke anụ ahụ ha chọrọ 4na-asị, “O kwere unu nkwa na ọ ga-abịa, gịnị mere na ọ bịabeghị? Kemgbe nna nna anyị ha nwụrụ, ihe niile ka dị otu ha dị na mbụ, site nʼokike ụwa.” 5Ha kpachaara anya chefuo na site nʼogologo oge gara aga, e sitere nʼokwu ọnụ Chineke kee eluigwe ma meekwa ka ụwa dịrị site na mmiri nke gbara ụwa gburugburu. 6Ọ bụkwa site na mmiri ndị a ka e ji bibie ma laa nʼiyi ụwa nke dị nʼoge ahụ. 7Ọ bụkwa otu okwu ahụ ka e ji nye iwu ka e chebe eluigwe na ụwa tutu ruo ụbọchị ahụ, mgbe a ga-eji ọkụ laa ha nʼiyi nʼụbọchị ahụ a ga-ekpe ndị niile na-amaghị Chineke ikpe, laakwa ha nʼiyi.
8Ndị enyi m, unu echefula otu okwu a, nʼanya Chineke, otu ụbọchị dịka puku afọ, puku afọ dịkwa ka otu ụbọchị. 9Onyenwe anyị anaghị anọ ọdụ nʼimezu nkwa ya, dịka ndị ụfọdụ nʼahụta ya na ọ bụ ịnọ ọdụ. Kama o nwere ntachiobi nʼebe unu nọ, nʼihi na ọ chọghị ka onye ọbụla laa nʼiyi, kama ọ chọrọ ka onye ọbụla bịaruo na nchegharị.
10Ma ụbọchị Onyenwe anyị ga-abịa dịka onye ohi. Nʼụbọchị ahụ, eluigwe ga-eji oke ụzụ gafee. Ihe niile dị nʼeluigwe ga-agba ọkụ, laa nʼiyi. Ụwa na ọrụ niile a rụrụ nʼime ya ga-erepịakwa ọkụ nʼotu ntabi anya.
11Ebe ọ bụ na ihe niile gbara anyị gburugburu ga-esi otu a laa nʼiyi, ụdị ndị dị aṅaa ka unu kwesiri ịbụ? Unu kwesiri ị na-ebi ndụ dị nsọ na nke ịsọpụrụ Chineke, 12dịka unu na-ele anya ọbịbịa ụbọchị nke Chineke, na-echesikwa ya ike ka ọ bịa ngwangwa. Nʼihi na ọ bụ ụbọchị a ga-amụnye eluigwe niile ọkụ, mee ka ihe niile dị na ya gbaze bụrụ ihe na-agaghị adịkwa. 13Ma anyị na-ele anya mmezu nkwa ahụ o kwere, nkwa inye anyị eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ ebe ezi omume naanị ga-adị.
14Bikonu ndị m hụrụ nʼanya, mgbe unu nọ na-ele anya ihe ndị a, jisienụ ike hụ na aka unu dị ọcha, ndị na-enweghị ịta ụta na ndị ha na ya dị nʼudo. 15Chetakwanụ na ntachiobi Onyenwe anyị pụtara nzọpụta, dịka ezi nwanna anyị Pọl jiri amamihe Chineke nyere ya deere unu ihe banyere ya. 16O na-ede otu ihe ahụ nʼakwụkwọ ozi ya niile, na-ekwu ihe banyere ihe ndị a nʼime ha. E nwere ụfọdụ ihe o kwuru nke siri ike ịghọta nke ndị nzuzu na ndị na-amaghị ihe na-akọwa dịka ha si chepụta nʼobi ha. Ha asụgharịala ihe o dere dịka ha na-emekwa mpaghara akwụkwọ nsọ ụfọdụ, si otu a wetara onwe ha ịla nʼiyi.
17Ya mere, ezi ndị enyi m, ebe unu matara nke a, nọrọnụ na nche ka a ghara isite na njehie ndị na-emebi iwu duhie unu, ime ka unu si nʼọnọdụ unu daa. 18Bụrụnụ ndị na-eto eto nʼime amara. Bụrụkwanụ ndị na-aga nʼihu ịmụta ihe banyere Onyenwe anyị na Onye nzọpụta anyị Jisọs Kraịst nke ọma.
Ka otuto dịrị ya ugbu a na mgbe niile ebighị ebi. Amen.

Você sabia?
Zombadores e o Dia do Senhor
- Este capítulo diz que, nos últimos dias, virão zombadores, seguindo os próprios desejos maus, e perguntarão onde está a promessa da vinda dele. Afirmarão que, desde que os pais adormeceram, tudo continua como desde o princípio da criação. A carta responde que eles ignoram de propósito que, pela palavra de Deus, os céus já existiam e a terra foi formada da água e por meio da água, que o mundo daquele tempo pereceu no dilúvio e que os céus e a terra de agora estão reservados para o fogo até o dia do juízo.Fontes: o próprio texto bíblico
- A carta pede aos leitores que não deixem passar isto: para o Senhor, um dia é como mil anos, e mil anos são como um dia. Diz que o Senhor não tarda em cumprir a promessa, como alguns entendem a demora, mas é paciente, não querendo que ninguém pereça, e sim que todos cheguem ao arrependimento. Acrescenta que o Dia do Senhor virá como um ladrão e que o autor e seus leitores aguardam, segundo a promessa de Deus, um novo céu e uma nova terra, onde habita a justiça.Fontes: o próprio texto bíblico
- O autor chama Paulo de irmão amado que também escreveu a esses leitores, com a sabedoria que Deus lhe deu, sobre esses assuntos, e diz que Paulo escreve assim em todas as suas cartas. Algumas partes dessas cartas são chamadas de difíceis de entender, e pessoas ignorantes e instáveis as distorcem, como fazem com o restante das Escrituras, para a própria destruição. O Dicionário Bíblico de Easton (1897) identifica Paulo com Saulo e o descreve como natural de Tarso, capital da Cilícia, província romana no sudeste da Ásia Menor; afirma que o nome Paulo provavelmente lhe foi dado na infância para uso no mundo gentio.Fontes: o próprio texto bíblico · Paul
Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.
Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org