2 Pedro 2
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.
Ịla nʼiyi nke ndị ozizi ụgha
1Ma na mgbe ochie ahụ kwa, e nwere ọtụtụ ndị amụma ụgha nʼetiti ha, dịka a ga-esi nwee ndị ozizi ụgha nʼetiti unu. Ndị a ga-esite na nzuzo na-ewebata ozizi ọjọọ nke na-eweta ịla nʼiyi, ha ga-agọnarị ọ bụladị onye kachasị ihe niile, bụ Onyenwe, onye gbapụtara ha. Ha na-eweta ịla nʼiyi na mberede, na-atụkwasị onwe ha nʼisi. 2Ya mere, ọtụtụ mmadụ ga-esoro ndụ rụrụ arụ ha na-ebi, nʼihi ha ga-ekwutọkwa ụzọ nke eziokwu ahụ. 3Nʼanya ukwu ha, ndị nkuzi ụgha ndị a ga-eji okwu nrafu rigbuo unu nʼuru. Site na mgbe ochie, onye ga-ekpe ha ikpe dị njikere. Onye ga-ala ha nʼiyi anaghị arahụ ụra.
4Ọ bụrụ na Chineke ahapụghị ndị mmụọ ozi ahụ mgbe ha mehiere, kama o weere ha kpọchie nʼime ala mmụọ, ebe e kere ha agbụ na-eche ụbọchị ikpe ahụ. 5Ọ bụrụkwa na o mereghị ndị ụwa nke mbụ ebere mgbe o mere ka uju mmiri bịakwasị ndị bi na ya na-amaghị Chineke, kama ọ zọpụtara naanị Noa bụ onye kwusara ezi omume na mmadụ asaa ndị ọzọ. 6Ọ bụrụ na ọ mara obodo Sọdọm na Gọmọra ikpe site nʼiwere ọkụ rechapụ ha, mee ha ihe ịmaatụ banyere ihe gaje ịbịakwasị ndị na-amaghị Chineke; 7ọ bụrụkwa na ọ napụtara Lọt bụ onye ezi omume, onye ndụ ọjọọ nke ndị na-emebi iwu wutere 8(nʼihi na nwoke ezi omume ahụ nke na-ebi nʼetiti ha ụbọchị niile, ehihie na abalị, bụ onye eji ọrụ mmebi iwu niile ọ na-anụ, na nke o ji anya ya na-ahụ, mekpaa mkpụrụobi ezi omume ya ahụ). 9Ọ bụrụ na ọ dị otu a, Onyenwe anyị maara otu o si anapụta ndị na-asọpụrụ Chineke site nʼọnwụnwa niile gbara ha gburugburu. Ọ makwaara edebe ndị ajọ omume nʼahụhụ, tutu ruo ụbọchị ikpe ahụ.
Ahụhụ nke na-abịa
10Nke a bụ eziokwu banyere ndị ahụ na-agbaso ọchịchọ emerụrụ emerụ nke anụ ahụ mmehie ha, na-eledakwa ike ọchịchị anya. Ndị nwere anya ike ma jupụtakwa na mpako. Ndị ahụ ụjọ na-adịghị atụ ikwutọ ọ bụladị mmụọ ndị ahụ jupụtara nʼebube nke anya na-adịghị ahụ. 11Lee, ọ bụ ezie na ndị mmụọ ozi karịrị ha nʼịdị ike, nweekwa ume karịa, ma ha anaghị e kpegide ha ikpe nkwujọ nʼihu Onyenwe anyị. 12Lee ka ha si na-ekwulu ihe ndị ha aghọtaghị. Ha dị ka ụmụ anụ ọhịa, ndị nzuzu na-eme naanị ihe ọbụla ha kpebiri nʼobi ha. Ndị a mụrụ naanị maka ijide ha ma bibiekwa ha. A ga-egbu ha otu e si egbu ụmụ anụ ọhịa ndị a.
13A ga-eji ntaramahụhụ kwụghachi ha ụgwọ ihe ọjọọ ha mere. Ihe na-atọ ha ụtọ bụ ịkpọ oriri na ọṅụṅụ nʼetiti ehihie. Ha bụ ihe ihere, bụrụkwa ndị na-ewetara unu ntụpọ ma ọ bụrụ na ha na-eso unu na-erikọta oriri. 14Anya ha jupụtara nʼagụụ ịkwa iko, mmehie adịghị ejukwa ha afọ. Ha na-arafu ndị okwukwe ha na-esighị ike. Ha bụkwa ndị a maara aha ha nʼihi oke ọchịchọ. Nʼezie ha bụ ụmụ a bụrụ ọnụ. 15Ha esitela nʼezi ụzọ ahụ jehie, soro omume Belam nwa Beoa, onye hụrụ ụgwọ ọrụ nke ajọ omume nʼanya. 16Ma a baara ya mba maka ajọ omume ya, mgbe e mere ka ịnyịnya ibu ya jiri olu mmadụ gwa ya okwu; gbochie ọrụ onyeisi na-adịghị mma nke onye amụma ahụ chọrọ ịrụ.
17Ndị a dịkwa ka iyi tara ata nke mmiri ọbụla na-adịghị nʼime ya. Ha dịkwa ka igwe ojii nke oke ifufe na-efesasị, nke na-adịghị ezo mmiri ọbụla. Ndị a kwadobere ebe kachasị ịgba ọchịchịrị. 18Ha na-eji okwu efu na-enweghị isi, na agụụ ihe ọjọọ nke na-agụ anụ ahụ ha, na-arafu ndị sitere nʼetiti ndị na-ebi ndụ ọjọọ na-ekewapụ onwe ha. 19Ha na-ekwe ha nkwa inwere onwe ha, ma ha onwe ha bụ ohu nye ihe rere ure, nʼihi na mmadụ bụ ohu nye ihe ọbụla na-achị achị nʼime ya. 20Mgbe ha sitere nʼihe niile emerụrụ emerụ nke ụwa gbapụ, site na mmazu nke Onyenwe anyị, na Onye nzọpụta anyị Jisọs Kraịst, bụrụ ndị atụhịrị na mmehie ọzọ, bụrụkwa ndị e meriri, ha ga-abụ ndị ọnọdụ ha ga-ajọ njọ karịa ka ọ dị na mbụ. 21Ọ gaara akara ha mma ma ọ bụrụ na ha amataghị ụzọ ezi omume, karịa na ha matara ya, mesịa gbakụta iwu ahụ dị nsọ nyere ha azụ. 22Ilu ndị a bụ eziokwu banyere ha sị, “Nkịta laghachiri ọzọ nʼihe ọ gbọrọ,” ya na, “Nne ezi a sachara ahụ laghachiri ọzọ ịtụrụ onwe ya nʼapịtị.”

Você sabia?
Falsos mestres e juízos do passado
- 2 Pedro aponta Sodoma e Gomorra, reduzidas a cinzas, como exemplo do que virá sobre os ímpios. O Dicionário Bíblico de Easton (1897) descreve Sodoma como uma cidade murada no vale de Sidim, destruída por fogo vindo do céu, e Gomorra como uma das cinco cidades dessa planície, sempre mencionada logo depois de Sodoma. Diz que essas cidades provavelmente ficavam próximas entre si, perto da extremidade norte do que hoje é o Mar Morto, e que nenhum vestígio de Sodoma ou das outras cidades da planície foi encontrado.Fontes: o próprio texto bíblico · Sodom · Gomorrah
- O capítulo diz que esses falsos mestres deixaram o caminho reto para seguir Balaão, filho de Beor, que amou o salário da maldade e foi repreendido por uma jumenta, de outro modo sem fala, que falou com voz humana. O Dicionário Bíblico de Easton descreve Balaão como um homem de certa posição entre os midianitas, que morava em Petor, na Mesopotâmia; embora vivesse entre idólatras, tinha algum conhecimento do verdadeiro Deus, e Balaque mandou chamá-lo para amaldiçoar Israel. O mesmo dicionário observa que Beor, pai de Balaão, é chamado Bosor em 2 Pedro 2:15.Fontes: o próprio texto bíblico · Balaam · Beor
- 2 Pedro chama Noé de pregador da justiça e diz que ele foi preservado entre oito pessoas quando o dilúvio veio sobre os ímpios do mundo antigo. O Dicionário Bíblico de Easton o identifica como filho de Lameque e neto de Matusalém, e o descreve como um elo entre o mundo antigo e o novo e como o segundo grande progenitor da família humana. Registra que ele viveu quinhentos anos antes de nascerem seus três filhos, Sem, Cam e Jafé.Fontes: o próprio texto bíblico · Noah
Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.
Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org