Nations Bible

2 Reis 24

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.

1Nʼoge Jehoiakim na-achị, Nebukadneza eze Babilọn ji ike bata nʼala ya, mee ka Jehoiakim ghọọ ohu ya afọ atọ. Ma o mesịrị tụgharịa megide Nebukadneza, nupukwa isi nʼokpuru ya. 2Onyenwe anyị zigara ndị na-apụnara mmadụ ihe site na Kaldịa, Aram, Moab na ndị Amọn, ka ha ga bibie Juda. Ọ bụ nʼusoro okwu Onyenwe anyị kpọsara site nʼọnụ ndị amụma ya. 3Nʼezie, ihe ndị a bịakwasịrị Juda dịka Onyenwe anyị si nye ya nʼiwu, ka o si otu a kpochapụ ha site nʼihu ya nʼihi mmehie niile Manase mere, na dịka ihe niile o mere si dị, 4tinyere ọbara ndị aka ha dị ọcha nke ọ wusiri. Nʼihi na o mere ka ọbara ndị aka ha dị ọcha jupụta na Jerusalem. Onyenwe anyị ekwekwaghị agbaghara ajọ omume dị otu a.

5Akụkọ ọzọ niile gbasara ọchịchị Jehoiakim na ihe niile o mere, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe e mere nʼụbọchị ndụ ndị eze Juda? 6Jehoiakim sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ. Jehoiakin nwa ya ghọrọ eze ọhụrụ nʼọnọdụ ya.

7Ma eze Ijipt esiteghị nʼala ya pụta ọzọ, nʼihi na eze Babilọn nọchiri oke ala ya niile, site na mmiri iyi Ijipt ruo nʼoke Osimiri Yufretis.

Jehoiakin eze Juda

8Jehoiakin gbara afọ iri na asatọ mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịrị naanị ọnwa atọ na Jerusalem. Aha nne ya bụ Nehushta, nwa Elnatan, onye Jerusalem. 9O mere ihe jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị, dịka nna ya ha mere.

10Nʼoge ọ bụ eze, ndịisi Nebukadneza, eze Babilọn bịara, gbaa Jerusalem gburugburu ma nọchibido obodo ahụ nʼagha. 11Nebukadneza, eze Babilọn nʼonwe ya, bịara nʼobodo ahụ mgbe ndị agha ya gbara ya gburugburu. 12Jehoiakin, bụ eze Juda, na nne ya na ndị ọrụ ya niile na ndịisi niile na ndịisi ozi ya niile were onwe ha nyefee Nebukadneza nʼaka.

Nʼafọ asatọ nke ọchịchị eze Babilọn ka ọ kpụụrụ Jehoiakin dịka onye mkpọrọ. 13Ọ kwakọọrọ akụ niile dị nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, na ndị nke dị nʼụlọeze, o gbukakwara ihe ọlaedo niile Solomọn eze Izrel tinyere nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị buru ha bulaa Babilọn, ihe a niile mere dịka Onyenwe anyị kwururịị. 14O bupụkwara puku ndị ikom iri site na Jerusalem bulaa ha Babilọn dịka ndị a dọtara nʼagha. Ndị so nʼime ndị a bụ ndịisi niile na ndị agha niile. O bupụkwara ndị na-akwa ǹka niile na ndị ọkpụ ụzụ. Naanị ndị na-enweghị ike, na ndị ogbenye ka ọ hapụrụ nʼala ahụ.

15Nebukadneza kpụụrụ Jehoiakin ka ọ ga biri na Babilọn. O sikwa na Jerusalem kpọrọ nne eze, na ndị nwunye eze, ndị ozi ya, na ndị niile a ma ama nʼala ahụ gaa Babilọn. 16Eze Babilọn bupụkwara ndị ikom niile dị ike ma tozukwaa ibu agha, ndị ọnụọgụgụ ha dị puku asaa, tinyere otu puku ndị ọrụ aka, na ndị ọrụ ǹka, bulaa ha Babilọn. 17O mere nwanne nna Jehoiakin, bụ Matanaya, eze nʼọnọdụ ya. Ọ gụgharịrị ya aha, kpọọ ya Zedekaya.

Zedekaya eze Juda

18Iri afọ abụọ na otu ka Zedekaya gbara mgbe ọ malitere ịbụ eze nʼime Jerusalem. Aha nne ya bụ Hamutal, nwa Jeremaya onye Libna. Ọ chịrị dịka eze na Jerusalem afọ iri na otu. 19Ma o mere ihe jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị dịka Jehoiakim mere. 20Ọ bụ nʼihi iwe Onyenwe anyị ka ihe ndị a niile ji bịakwasị Jerusalem na Juda. Nʼikpeazụ, o sitere nʼihu ya chụpụ ha.

Ọdịda Jerusalem

Nʼoge a, Zedekaya nupuru isi nʼokpuru eze Babilọn.

Ilustração artística — interpretação, não registro histórico.

Você sabia?

O Domínio Babilônico e a Primeira Deportação

  • Durante o reinado de Jeoaquim, a Babilônia quebrou decisivamente a influência egípcia sobre o Levante, assumindo o controle de toda a região desde o rio Eufrates até o ribeiro do Egito.Fontes: o próprio texto bíblico · Jehoiakim · Nebuchadnezzar
  • Quando Joaquim, de apenas dezoito anos, rendeu Jerusalém, Nabucodonosor deportou para a Babilônia milhares de guerreiros, nobres e artífices, além de retirar utensílios de ouro que vinham da época do rei Salomão.Fontes: o próprio texto bíblico · Jehoiachin · Solomon
  • Nabucodonosor estabeleceu Matanias, tio de Joaquim, como rei vassalo sobre a população mais pobre que restou, mudando seu nome para Zedequias para assinalar a autoridade imperial.Fontes: o próprio texto bíblico · Zedekiah

Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.

Lugares deste capítulo

  • Babylon · 32.543, 44.422 · versículos 1, 7, 10, 11, 12, 15, 16, 17, 20
  • Ammon · 31.955, 35.934 · versículo 2
  • Chaldea · 30.962, 46.104 · versículo 2
  • Moab · Hoje: Moab 1 · 31.181, 35.701 · versículo 2
  • Syria · Hoje: Aram · 33.511, 36.306 · versículo 2
  • Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículos 4, 8, 10, 14, 15, 18, 20
  • Egypt · 30.129, 31.308 · versículo 7
  • Euphrates · Hoje: Euphrates River · 31.004, 47.442 · versículo 7

Só aparecem lugares com identificação de alta confiança (90% ou mais segundo as fontes acadêmicas reunidas pelo OpenBible). Mapa da época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa atual: © colaboradores do OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Fale com a gente

Conte de onde você lê, como a Bíblia tem te ajudado ou o que podemos melhorar. Lemos todas as mensagens.