2 Reis 23
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.
Ọgbụgba ndụ eze na ndị Juda
1Mgbe ahụ, eze zigara ozi kpọkọta ndị okenye Juda na Jerusalem. 2Ọ gara nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, ya na ndị ikom Juda niile, ndị niile bi na Jerusalem, na ndị nchụaja, na ndị amụma niile, na ndị mmadụ niile, site nʼonye nta ruo na onye ukwu. Ọ gụpụtara na ntị onye ọbụla okwu niile si nʼakwụkwọ ọgbụgba ndụ ahụ, bụ nke achọtara nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị. 3Eze guzoro nʼakụkụ ogidi, kwee nkwa nʼihu Onyenwe anyị, ịgbaso Onyenwe anyị, na iji obi ya niile, na mkpụrụobi ya niile, debe ihe niile o nyere nʼiwu, nʼihe ama ya niile na ụkpụrụ ya niile. O si otu a mee ka okwu niile nke ọgbụgba ndụ ahụ e dere nʼakwụkwọ guzosie ike. Mgbe ahụ, ndị mmadụ niile kwekwara nkwa idebe ọgbụgba ndụ ahụ.
4Eze nyere Hilkaya onyeisi nchụaja na ndị nchụaja na-esote nʼọkwa, na ndị na-eche ọnụ ụzọ mbata, iwu ka ha site nʼụlọnsọ Onyenwe anyị kwapụtasịa ngwongwo niile e mere nye Baal, na Ashera, na usuu ihe niile nke mbara eluigwe. O sunyere ha niile ọkụ nʼazụ Jerusalem, nʼọhịa dị na Ndagwurugwu Kidrọn, buru ntụ ha bulaa Betel. 5Ọ chụdara ndị nchụaja arụsị ndị ahụ niile, bụ ndị eze Juda họpụtara isure ihe na-esi isi ụtọ nʼelu ebe dị elu nke obodo Juda nakwa ebe dị ọkụ. Nʼihi na ndị nchụaja ndị a achụọla aja, surekwaa ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼebe ịchụ aja dị nʼelu ugwu niile dị nʼobodo dị iche iche na Juda, nakwa ndị dị gburugburu Jerusalem. Ha bụ ndị surere ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye Baal, na anyanwụ, ọnwa na kpakpando, nyekwa usuu niile nke mbara eluigwe. 6O sikwa nʼụlọnsọ Onyenwe anyị bupụ ogidi chi Ashera, wezuga ya nʼazụ Jerusalem, na Ndagwurugwu Kidrọn. Ebe ahụ ka ọ nọ suo ya ọkụ, supịa ya ka ọ ghọọ ntụ, fesaa ya nʼebe a na-eli ndị mmadụ efu. 7Ọ kwadakwara ụlọ obibi ụmụ ndị ikom na-agba akwụna dị nọ nʼụlọnsọ Onyenwe anyị. Nʼebe ndị inyom na-anọ na-akpara Ashera akwa.
8O mere ka ndị nchụaja niile site nʼobodo Juda niile bịa, o merụkwara ebe ịchụ aja niile nke dị elu, site na Geba ruo Bịasheba, ebe ndị nchụaja ndị a nọrọ suree ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ. Ọ kwatụrụ ọnụ ụzọ ama nke dị nʼebe ọnụ ụzọ ama Joshua, onye bụ gọvanọ obodo, nke dị nʼakụkụ aka ekpe nke ọnụ ụzọ ama obodo. 9Ma e kweghị ka ndị nchụaja ahụ jee ozi nʼụlọnsọ Onyenwe anyị dị na Jerusalem, ma o nyere ha ike iso ndị nchụaja ndị ọzọ rie achịcha a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee.
10Josaya merụrụ Tofet, laa ya nʼiyi. Tofet bụ ebe ịchụ aja dị na Ndagwurugwu nke Ben Hinom. O mere nke a igbochi mmadụ ọbụla iji nwa ya nwoke, maọbụ nwa ya nwanyị chụọrọ chi Molek aja nsure ọkụ. 11O sitere nʼọnụ ụzọ ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị wepụ ịnyịnya ndị ahụ ndị eze Juda doro nsọ nye anyanwụ. Ịnyịnya ndị a dị nʼogige ụlọnsọ Onyenwe anyị nʼebe dị nso nʼụlọ onyeozi aha ya bụ Netan-Melek. Josaya kpọrọ ụgbọ agha ndị a niile e doro nsọ nye anyanwụ ọkụ.
12Josaya kwadara ebe ịchụ aja niile nke ndị eze Juda wukwasịrị nʼelu ụlọeze, nʼelu elu ụlọ Ehaz. Ọ kwadakwara ebe ịchụ aja niile nke Manase wuru nʼime ogige abụọ nke ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, kporo ha kpofuo nʼime Ndagwurugwu Kidrọn. 13Eze merụkwara ebe ịchụ aja niile dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ obodo Jerusalem nʼakụkụ ndịda nke Ugwu Mbibi, nke Solomọn eze Izrel wuru nye chi Ashtọret, ihe arụ ndị Saịdọn, na chi Kemosh, ihe arụ ndị Moab, na chi Molek, ihe arụ ụmụ Amọn. 14Josaya kwadakwara ogidi nkume niile, gbutuo ihe arụsị Ashera niile, werekwa ọkpụkpụ ndị mmadụ wụsa nʼelu ala ahụ niile.
15Josaya kwadakwara ogidi niile dị na Betel, nke Jeroboam nwa Nebat wuru mgbe o dubara ndị Izrel na mmehie. Ọ kwadara ebe ịchụ aja dị nʼebe ahụ, kụjisie nkume e doro nʼebe ahụ, gwerie ha dịka ntụ. Ọ kpọkwara arụsị Ashera ọkụ. 16Josaya legharịkwara anya gburugburu hụ ọtụtụ ili dị nʼelu ugwu. O ziri ndị ohu ya ka ha gaa chịpụtasịa ọkpụkpụ dị nʼili ahụ niile, kpọọ ha ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja imerụ ya, dịka okwu Onyenwe anyị si dị, nke onye nke Chineke kwupụtara mgbe o buru amụma banyere ihe ndị a.
17Josaya jụrụ ndị guzo nʼebe ahụ ajụjụ sị, “Ọ bụ ili onye bụ nke a?”
Ndị ikom obodo ahụ zara sị, “Ọ bụ ili onye nke Chineke ahụ si Juda bịa buo amụma megide ebe ịchụ aja Betel. O buru amụma na ihe ndị a ị na-eme ebe ịchụ aja a ga-emezu.”
18Mgbe ahụ, Josaya zara sị ha, “Hapụnụ ya ka o guzoro onwe ya. Ka nwoke ọbụla gharakwa ịchịpụta ọkpụkpụ ya.” Ha hapụrụ ọkpụkpụ ya, hapụkwa ọkpụkpụ onye amụma ahụ si Sameria bịa.
19Dịka o mere na Betel, otu a ka Josaya wepụrụ ma merụkwaa ebe ịchụ aja niile dị nʼebe niile dị elu nke ndị eze Izrel wuru nʼobodo niile nke Sameria, bụ ebe ịchụ aja kpasuru Onyenwe anyị iwe. 20O gburu ndị nchụaja chi ndị a niile nʼelu ebe ịchụ aja ha, suo ọkpụkpụ ha ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja ha. Mgbe o mesịrị ihe ndị a, ọ laghachiri na Jerusalem.
21Eze nyere ndị Juda niile iwu sị ha, “Meerenụ Onyenwe anyị Chineke unu Mmemme Ngabiga, dịka e dere ya nʼakwụkwọ ọgbụgba ndụ a.” 22O nwebeghị mgbe e mere ụdị Mmemme Ngabiga dịka nke a nʼoge ọbụla, site nʼụbọchị ndị ikpe bụ ndị duru Izrel maọbụ nʼụbọchị ndị eze Izrel na eze niile chịrị Juda, ọ dịghị nke yiri Mmemme Ngabiga a. 23Ma ọ bụ nʼafọ nke iri na asatọ nke ọchịchị eze Josaya, nʼime Jerusalem ka a nọ mee Mmemme Ngabiga a nye Onyenwe anyị.
24Ọzọkwa, Josaya gara nʼihu kpochapụ ndị niile na-ajụta mmụọ ọjọọ ase, na ndị dibịa afa, na arụsị ezinaụlọ dị iche iche, na arụsị a pịrị apị, na ihe arụ niile nke a hụrụ nʼime Juda na Jerusalem niile. O mere nke a ka e mezuo ihe niile e dere nʼime akwụkwọ ahụ Hilkaya onye nchụaja chọtara nʼụlọ Onyenwe anyị. 25Ọ dịghị eze ọzọ nʼime ndị niile buru ya ụzọ chịa nke dịka Josaya, onye chigharịkwutere Onyenwe anyị. Onye ji obi ya niile, na mmụọ ya niile na ike ya niile debe iwu niile e nyere Mosis. Ọ dịkwaghị eze ọzọ dịka ya, onye biliri mgbe ọ nwụsịrị.
26Ma ihe ndị a emeghị ka iwe ọkụ Onyenwe anyị na-ewe megide Juda dajụọ, bụ iwe a kpasuru ya nʼihi ihe ọjọọ niile nke Manase mere. 27Ya mere, Onyenwe anyị sịrị, “Aga m ekpochapụ Juda niile site nʼihu m, dịka m si kpochapụ Izrel niile. Aga m ajụkwa obodo ahụ m họpụtara, bụ Jerusalem, jụkwa ụlọnsọ ukwu a nke m kwuru banyere ya sị, ‘Nʼime ya ka Aha m ga-adị.’ ”
28Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Josaya na ihe niile o mere, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze Juda?
29Nʼoge Josaya bụ eze, Fero Neko, eze Ijipt, gbagoro gaa nʼakụkụ osimiri Yufretis inyere eze Asịrịa aka. Eze Josaya pụkwara izute ya nʼagha, ma Neko zutere ya nʼagha, gbuo ya na Megido. 30Ndị na-ejere Josaya ozi sị na Megido buru ozu ya nʼime ụgbọ agha bulata ya na Jerusalem, lie ya nʼili nke aka ya. Ndị ala ahụ kpọọrọ Jehoahaz nwa nwoke Josaya, tee ya mmanụ, mee ya eze nʼọnọdụ nna ya.
Jehoahaz eze Juda
31Jehoahaz gbara iri afọ abụọ na atọ mgbe o bidoro ịchị, ma ọ chịrị na Jerusalem ọnwa atọ. Aha nne ya bụ Hamutal, nwa Jeremaya onye Libna. 32O mere ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị dịka ndị eze buru ya ụzọ. 33Ma Fero Neko keere ya agbụ na Ribla nʼala Hamat, ime ka ọ ghara ịchịkwa na Jerusalem. Neko kwagidere ndị Juda ka ha tụọrọ ya ụtụ narị talenti ọlaọcha, na otu talenti ọlaedo. 34Fero Neko mere Eliakịm nwa nwoke Josaya, eze, nʼọnọdụ Josaya bụ nna ya. Ọ gụgharịrị aha Eliakịm ka ọ bụrụ Jehoiakim. Ma o duuru Jehoahaz gaa Ijipt, ebe ọ nọ nwụọ. 35Jehoiakim kwụrụ Fero Neko ọlaọcha na ọlaedo ahụ ọ nara nʼaka ya. Ka o nwee ike mee nke a, o kere ụtụ nʼala ahụ, werekwa ike nara ndị ala ahụ ọlaọcha na ọlaedo, dịka mkpebi ha si dị banyere ihe onye ahụ ga-akwụ.
Jehoiakim eze Juda
36Jehoiakim gbara iri afọ abụọ na ise mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịrị afọ iri na otu na Jerusalem. Aha nne ya bụ Zebida nwa Pedaya, onye Ruma. 37O mere ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị, dịka ihe niile nna ya ha ndị bu ya ụzọ mere.

Você sabia?
As Reformas de Josias e a Queda dos Reis de Judá
- A ampla purificação promovida por Josias desmantelou séculos de instalações idólatras em Judá e Samaria. Ele queimou objetos dedicados a Baal e ao exército dos céus, profanou Tofete no vale de Ben-Hinom para encerrar os sacrifícios de crianças a Moloque e destruiu o antigo altar erguido por Jeroboão em Betel.Fontes: o próprio texto bíblico · Josiah · Molech · Bethel (of Palestine)
- No décimo oitavo ano de seu reinado, Josias restabeleceu a celebração nacional da Páscoa em Jerusalém de acordo com o recém-descoberto Livro da Aliança. O relato bíblico destaca que nenhuma Páscoa semelhante havia sido celebrada desde os dias dos juízes de Israel.Fontes: o próprio texto bíblico · Hilkiah
- Josias morreu em batalha em Megido ao tentar confrontar o faraó Neco do Egito. Após sua morte, Neco depôs o sucessor de Josias, Jeoacaz, após apenas três meses de reinado, levou-o cativo para o Egito e colocou seu irmão Eliaquim no trono com o nome de Jeoaquim.Fontes: o próprio texto bíblico · Jehoahaz · Jehoiakim · Megiddo
Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.
Lugares deste capítulo
- Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículos 1, 2, 4, 5, 6, 8, 9, 13, 20, 23, 24, 27, 30, 31, 33, 36
- Kidron · Hoje: Kidron River · 31.780, 35.240 · versículos 4, 6, 12
- Topheth · Hoje: in the Hinnom Valley · 31.769, 35.228 · versículo 10
- Valley of Hinnom · Hoje: Hinnom Valley · 31.769, 35.228 · versículo 10
- Ammon · 31.955, 35.934 · versículo 13
- Moab · Hoje: Moab 1 · 31.181, 35.701 · versículo 13
- Mount of Olives · 31.778, 35.246 · versículo 13
- Samaria · 32.276, 35.195 · versículos 18, 19
- Assyria · 36.359, 43.153 · versículo 29
- Egypt · 30.129, 31.308 · versículos 29, 34
- Euphrates · Hoje: Euphrates River · 31.004, 47.442 · versículo 29
- Megiddo · Hoje: Tel Megiddo · 32.585, 35.184 · versículos 29, 30
- Hamath · Hoje: Hama · 35.136, 36.750 · versículo 33
- Riblah · Hoje: Rableh · 34.460, 36.573 · versículo 33
Só aparecem lugares com identificação de alta confiança (90% ou mais segundo as fontes acadêmicas reunidas pelo OpenBible). Mapa da época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa atual: © colaboradores do OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org