Nations Bible

2 Crônicas 15

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.

Mgbanwe Asa wetara

1Mgbe ahụ, Mmụọ nke Chineke dakwasịrị Azaraya nwa Oded. 2Ọ pụrụ jekwuru Asa sị ya, “Geenụ m ntị, gị Asa na ndị Juda niile na Benjamin. Onyenwe anyị ga-anọnyere unu oge niile unu na-eme okwu ya. Unu ga-achọta ya mgbe ọbụla unu chọrọ ya. Ma ọ ga-agbakụta unu azụ oge ọbụla unu nupuru isi nʼiwu ya. 3Ma ọtụtụ oge dị anya ndị Izrel nọ na-enweghị Chineke nke ezie, ha enweghịkwa onye nchụaja ga-ezi ihe, ha enweghịkwa iwu Chineke 4Ma mgbe ọbụla ha chigharịkwutere Onyenwe anyị, Chineke Izrel tikuo ya nʼime mkpagbu ha, ọ na-enyere ha aka. 5Nʼoge ahụ, ọ dịghị udo dịrị onye ọbụla na-apụ apụ ịgagharị nʼobodo, maka na ndị niile bi nʼala ahụ nọ nʼọnọdụ oke ọgbaaghara. 6Otu obodo na-azọpịa obodo ọzọ ebe otu mba na-emegidekwa mba ọzọ nʼihi na Chineke ji nsogbu dị iche iche megide ha. 7Ma unu ndị Juda, unu adala mba nʼọrụ ọma unu, nʼihi na a ga-akwụ unu ụgwọ ọrụ unu.”

8Mgbe Asa nụrụ okwu ndị a, bụ amụma Azaraya nwa Oded, ọ bụ onye a gbara ume. O wepụrụ ihe arụ niile dị nʼala Juda na Benjamin na nke dị nʼobodo niile ahụ o meriri nʼagha ndị dị nʼugwu Ifrem. Ọ wuziri ebe ịchụ aja Onyenwe anyị, nke dị nʼihu mpụta ọnụ ụlọ ụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị.

9Mgbe ahụ, Asa kpọrọ ndị Juda na Benjamin niile oku, ha na ndị ọbịa niile si Izrel, nʼihi na ọtụtụ sitere nʼala Ifrem na Manase, na Simiọn gbafeta Juda, mgbe ha hụrụ na Onyenwe anyị Chineke nọnyeere Asa.

10Ha niile zukọrọ na Jerusalem nʼọnwa nke atọ nʼafọ nke iri na ise nke ọchịchị eze Asa. 11Nʼoge ahụ, ha ji narị ehi asaa na puku atụrụ na ewu asaa, chụọrọ Onyenwe anyị aja nʼụbọchị ahụ. Anụmanụ ndị a so nʼihe ha kwatara nʼagha. 12Emesịa, nʼụbọchị ahụ, ha gbara ndụ, kpebie na ọ bụ naanị Onyenwe anyị Chineke nna ha ka ha ga-efe. 13Ha kpebikwara na onye ọbụla nke na-agaghị efe Onyenwe anyị, Chineke Izrel ga-anwụ, ma onye ahụ ọ bụ nwoke maọbụ nwanyị, nwantakịrị maọbụ okenye. 14Ha niile ji oke olu na iti mkpu na opi na opi ike, ṅụọrọ Onyenwe anyị iyi. 15Ndị Juda niile ṅụrịrị ọṅụ nʼihi na ha ji obi ha niile ṅụọ iyi a. Ha jikwa obi ha niile chọọ Chineke. O mere ka ha chọta ya. Onyenwe anyị nyekwara ha udo nʼakụkụ niile.

16Eze Asa chụdakwara nne nne ya bụ Maaka, site nʼọnọdụ ya dịka nne eze, nʼihi na ọ kpụrụ ihe arụ, ogidi Ashera maka iji fee ya ofufe. Asa gbuturu ya, sụpịa ya, kpọọ ya ọkụ na ndagwurugwu iyi Kidrọn. 17Ọ bụ ezie na o wezugaghị ugwu niile dị elu site nʼIzrel, ma Asa ji obi zuruoke jere Onyenwe anyị ozi nʼoge ndụ ya niile 18O webatara nʼime ụlọnsọ ukwu Chineke, ọlaọcha na ọlaedo na ihe niile, nke nna ya na ya onwe ya doro nsọ.

19Ọ dịkwaghị agha ọzọ a lụrụ tutu ruo nʼafọ iri atọ na ise nke ọchịchị eze Asa na Juda.

Você sabia?

A Reforma Religiosa de Asa e a Renovação da Aliança

  • Incentivado pela mensagem do profeta Azarias, filho de Odede, o rei Asa removeu os ídolos detestáveis de Judá e restaurou o altar do SENHOR diante do pórtico do templo.Fontes: o próprio texto bíblico · Azariah · Asa
  • A renovação espiritual em Judá atraiu pessoas de tribos do norte, como Efraim, Manassés e Simeão, que se estabeleceram em Jerusalém ao verem que o SENHOR estava com Asa.Fontes: o próprio texto bíblico · Ephraim · Manasseh (son of Joseph)
  • Asa também destituiu sua avó Maaca da posição real por ela ter feito um poste idólatra de Aserá, o qual o rei despedaçou e queimou no vale do Cedrom, no lado leste de Jerusalém.Fontes: o próprio texto bíblico · Maachah · Kidron

Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.

Lugares deste capítulo

  • Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículo 10
  • Kidron · Hoje: Kidron River · 31.780, 35.240 · versículo 16

Só aparecem lugares com identificação de alta confiança (90% ou mais segundo as fontes acadêmicas reunidas pelo OpenBible). Mapa da época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa atual: © colaboradores do OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Fale com a gente

Conte de onde você lê, como a Bíblia tem te ajudado ou o que podemos melhorar. Lemos todas as mensagens.