2 Crônicas 14
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.
1Abija sooro nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼobodo Devid. Asa, nwa ya nwoke ghọrọ eze nʼọnọdụ ya. Udo dịkwa afọ iri nʼụbọchị ịbụ eze ya.
Asa eze Juda
2Asa mere ihe dị mma na nke ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị bụ Chineke ya. 3Ọ wezugakwara ebe ịchụ aja nke chi ọzọ niile dị nʼugwu, tipịa ogidi nsọ niile, gbujasịakwa ogidi Ashera. 4O nyere Juda iwu ka ha chọọ Onyenwe anyị Chineke nke nna ha, ka ha debekwa iwu ya na ụkpụrụ ya niile. 5O wezugakwara ebe niile a na-efe arụsị nʼelu ugwu, bibiekwa ebe niile a na-esure ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼobodo Juda. Alaeze ahụ nwekwara udo nʼokpuru ọchịchị ya. 6O wuru ọtụtụ obodo e ji mgbidi gbaa gburugburu nʼala Juda niile. O nweghị onye busoro ya agha, nʼihi na Onyenwe anyị nyere ya udo.
7Nʼihi nke a, ọ gwara ndị Juda sị ha, “Ugbu a ka anyị kwesiri iwu obodo ndị a. Ka anyị wuokwa mgbidi gburugburu ha, wuokwa ụlọ elu nche, tinyesịa ha niile ibo ọnụ ụzọ ama, na mkpọrọ e ji akpọchi ya, ala a bụ nke anyị, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke onye anyị ji obi anyị chọsie ike enyela anyị udo.” Ya mere, ha wuru ihe ndị a niile nwekwa ọganihu.
8Ọnụọgụgụ ndị agha Asa ndị si Juda nʼoge ahụ bụ narị puku atọ. Ngwa agha ha ji bụ ọta ukwu na ùbe. Ndị agha ya ọzọ si Benjamin dị narị puku abụọ na iri puku mmadụ asatọ. Ndị a jikwa ọta na ụta. Ndị agha ndị a niile bụ ndị a zụziri azụzi, bụrụkwa ndị dị ike.
9Zera, bụ onye Kush duru puku kwụrụ puku, na narị ụgbọ agha atọ, bịaruo Maresha ibuso Juda agha. 10Asa pụrụ izute ya. Ha doro onwe ha nʼusoro ibu agha na Ndagwurugwu Zefata nke dị Maresha nso.
11Mgbe ahụ, Asa kpọkuru Onyenwe anyị Chineke ya, si, “ Onyenwe anyị ọ dịghị onye dịka gị nʼinyere onye na-adịghị ike aka nʼihu onye dị ike nke ukwuu. Nyere anyị aka, O Onyenwe anyị Chineke anyị, nʼihi na anyị dabere na gị. Ọ bụkwa nʼaha gị ka anyị na-apụ ibuso igwe a agha. O Onyenwe anyị i bụ Chineke anyị. Ekwela ka ọ bụrụ na mmadụ efu meriri gị.”
12Onyenwe anyị tigbukwara ndị Kush niile ahụ nʼihu Asa na Juda. Ndị Kush gbakwara ọsọ. 13Asa na ndị agha ya chụrụ ha ọsọ chụruo ha obodo Gera ebe ọtụtụ ndị Kush dara, ruo na o nwekwaghị onye fọdụrụ ndụ nʼime ha. E tigburu ha nʼihu Onyenwe anyị na ndị agha ya. Ndị Juda bukọọrọ ọtụtụ ihe nkwata nʼagha dị iche iche. 14Ha bibiri obodo niile gbara Gera gburugburu, nʼihi na egwu Onyenwe anyị dakwasịrị obodo ndị ahụ niile. Ndị Juda bukọọrọ ọtụtụ ihe nkwata nʼihi na ọtụtụ ihe dị nʼobodo ndị ahụ. 15Ha busokwara ebe obibi ndị na-azụ anụ ụlọ agha, chikọrọ igwe atụrụ na ewu na ịnyịnya kamel. Emesịa ha laghachiri Jerusalem.

Você sabia?
As reformas e a vitória de Asa
- Ao suceder seu pai Abias, o rei Asa iniciou amplas reformas religiosas em Judá, removendo altares estrangeiros, altares de incenso, lugares altos, colunas sagradas e postes de Aserá para restabelecer o culto a Deus.Fontes: Asa · o próprio texto bíblico
- O exército de Judá contava com divisões tribais distintas: 300.000 guerreiros de Judá equipados com grandes escudos e lanças, além de 280.000 guerreiros de Benjamim armados com escudos menores e arcos.Fontes: o próprio texto bíblico
- Quando Zerá, o cuxita, invadiu com uma imensa força de um milhão de homens e trezentos carros de guerra, Asa o enfrentou no vale de Zefatá, perto de Maressa, derrotando completamente os invasores e perseguindo-os até Gerar.Fontes: Zerah · Mareshah · Gerar · o próprio texto bíblico
Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.
Lugares deste capítulo
- City of David · 31.774, 35.236 · versículo 1
- Mareshah · Hoje: Tel Maresha · 31.593, 34.898 · versículos 9, 10
- Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículo 15
Só aparecem lugares com identificação de alta confiança (90% ou mais segundo as fontes acadêmicas reunidas pelo OpenBible). Mapa da época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa atual: © colaboradores do OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org