1 Timóteo 4
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.
Ndụmọdụ e nyere Timoti
1Ma Mmụọ Nsọ agwagheela anyị ọnụ sị, na nʼoge ikpeazụ ụfọdụ mmadụ nʼime chọọchị ga-esite nʼokwukwe wezuga onwe ha, bụrụ ndị na-agbaso mmụọ nduhie nakwa ozizi ihe banyere mmụọ ọjọọ. 2Ozizi dị otu a na-esite nʼihu abụọ nke ndị ụgha, bụ ndị eji igwe ọkụ da nwụọ akọnuche ha. 3Ndị dị otu a na-egbochi ịlụ dị na nwunye na iri ihe oriri ụfọdụ. Ma ọ bụ Chineke kere ihe oriri ndị a ka ndị kwere ekwe, ndị maara eziokwu ahụ jiri ekpere na ekele nara ha. 4Ihe niile Chineke kere dị mma, ọ dịkwaghị ihe ọbụla a ga-ajụ ma ọ bụrụ na e jiri ekele nara ya, 5nʼihi na-esitere nʼokwu Chineke na ekpere doo ya nsọ.
6Ọ bụrụ na ị mee ka ụmụnna mara ihe ndị a, ị ga-abụ ezi onyeozi Kraịst Jisọs, onye a zụlitere nke ọma site nʼeziokwu nke okwukwe, na ezi ozizi nke ị gbasoro. 7Atụfula oge gị nʼịrụ ụka rụrụ arụ banyere akụkọ ifo nzuzu, na akụkọ na-abaghị uru nke ndị agadi nwanyị na-akọ. Kama zụọ onwe gị ka ị bụrụ onye nke na-asọpụrụ Chineke. 8Igwuri egwu nke anụ ahụ dị mma kama ịbụ onye nke Chineke bara uru karịa nʼụzọ ọbụla, nʼihi na nkwa dị nʼime ya bụ banyere ndụ dị ugbu a na ndụ dị nʼihu. 9Okwu a kwesiri ntụkwasị obi, kwesikwa ka a nara ya nke ọma. 10Anyị na-adọgbu onwe anyị nʼọrụ na-ahụjukwa anya maka na anyị tụkwasịrị olileanya anyị na Chineke dị ndụ, onye bụ Onye nzọpụta mmadụ niile, karịchasịa, nke ndị niile kwere ekwe.
Ndụmọdụ
11Ndị a bụ ihe ndị ị ga-akụzi, kwudosie ike na-akụzi ha. 12Ekwela ka onye ọbụla lelịa gị anya nʼihi na ịbụ okorobịa. Kama mee ka ị bụrụ ihe ịmaatụ na ihe ilere anya ọma nye ndị kwere ekwe, nʼokwu, nʼibi obi, nʼịhụnanya, nʼokwukwe nakwa nʼịdị ọcha nʼuche. 13Tutu ruo mgbe m ga-abịa nʼebe ahụ, na-agụpụta ma na-akọwakwara ndị chọọchị ihe e dere nʼime akwụkwọ nsọ. Na-ekwusakwa okwu Chineke. 14Elelịla onyinye ime mmụọ nke i nwere anya, bụ nke e nyere gị site nʼibu amụma pụtara ihe mgbe ndị okenye bikwasịrị gị aka nʼisi.
15Jiri onyinye ndị a niile rụọ ọrụ, nọgidesie ike nʼọrụ gị, ka onye ọbụla mata, hụkwa na ị na-eme nke ọma. 16Na-elezi anya na ndụ gị, na ozizi gị. Nọgidesie ike nʼihe ndị a nʼihi na site na ha, ị ga-azọpụta onwe gị, zọpụtakwa ndị na-ege gị ntị.

Você sabia?
Falso ensino e treino na piedade
- O capítulo diz que o Espírito declara expressamente que, em tempos posteriores, alguns abandonarão a fé para seguir espíritos enganadores e doutrinas de demônios. Serão influenciados pela hipocrisia de mentirosos, cuja consciência foi cauterizada com ferro quente, e proibirão o casamento e exigirão abstinência de certos alimentos.Fontes: o próprio texto bíblico
- A carta responde a essas exigências dizendo que Deus criou esses alimentos para serem recebidos com ação de graças por quem crê e conhece a verdade. Toda criação de Deus é boa, e nada do que é recebido com ação de graças deve ser rejeitado, porque é santificado pela palavra de Deus e pela oração.Fontes: o próprio texto bíblico
- O autor exorta o jovem a quem se dirige a não deixar que ninguém despreze a sua juventude, mas a ser exemplo no falar, na conduta, no amor, na fé e na pureza. Até que o autor chegue, ele deve dedicar-se à leitura pública das Escrituras, à exortação e ao ensino, e não negligenciar o dom que lhe foi dado por meio de profecia, quando os presbíteros lhe impuseram as mãos. O exercício físico, acrescenta a carta, tem valor limitado, enquanto a piedade é valiosa em tudo e encerra promessa para a vida presente e para a futura, uma palavra que a carta chama fiel e digna de plena aceitação.Fontes: o próprio texto bíblico
Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.
Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org