1 Timóteo 3
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.
Ndị ndu chọọchị
1Nke a bụ okwu kwesiri ntụkwasị obi ma bụrụkwa eziokwu, bụ nke na-asị, ọ bụrụ na onye ọbụla na-achọ ọnọdụ ịbụ ụkọchukwu, ọ na-achọ ezi ọrụ kacha mma. 2Ya mere onye ụkọchukwu kwesiri ịbụ onye a na-adịghị ata ụta, onye lụrụ otu nwunye, onye obi umeala, onye na-achịkọta onwe ya nke ọma, onye nwere nsọpụrụ, onye na-anabata ndị ọbịa nʼụlọ ya, nakwa onye nwere ike ikuzi ihe. 3Ọ gaghị abụ onye na-aṅụbiga mmanya oke, ọ gaghị abụ onye na-alụkarị ọgụ, kama ọ ga-abụ onye dị nwayọọ, onye na-ahụghị okwu na ụka nʼanya, na onye na-adịghị ahụ ego nʼanya. 4Ọ ga-abụ onye na-achịzi ezinaụlọ ya nke ọma, bụrụkwa onye na-achịkwa ụmụ ya inwe nsọpụrụ nʼụzọ ọbụla. 5(Nʼihi na ọ bụrụ na mmadụ enweghị ike chịkọtazie ezinaụlọ ya, ọ ga-esi aṅaa chịzie chọọchị Chineke?) 6Ọ gaghị abụ onye chegharịrị ọhụrụ, ma ọ bụghị ya, ọ ga-afụlị onwe ya elu nʼịnya isi, ma si otu a daba nʼọmụma ikpe dị ka ekwensu. 7Ọ ga-abụkwa onye nwere ezi ama nʼebe ndị nọ nʼezi nọ, ka ọ ghara ịdaba nʼọnọdụ ihere nakwa nʼọnya ekwensu.
Ndị na-eje ozi
8Otu ahụ kwa, ndị a họpụtara ijere chọọchị ozi aghaghị ịbụ ndị kwesiri nsọpụrụ, ndị na-enweghị ire abụọ, ndị kwesiri ntụkwasị obi. Ha agaghị abụ ndị na-aṅụbiga mmanya oke na ndị akpịrị ego na-agbaso uru nʼezighị ezi. 9Ha ga-abụ ndị ji akọnuche dị ọcha na-ejidesi eziokwu nke okwukwe anyị ike. 10Tupu a họpụta ha ịrụ ọrụ a, a ga-ebu ụzọ nwalee ha. Ọ bụrụ na ha enweghị ebubo ọbụla megide ha, mgbe ahụ, a ga-eme ha ndị na-eje ozi na chọọchị.
11Otu aka ahụ kwa, ndị nwanyị kwesikwara ịbụ ndị nwere nsọpụrụ nʼụzọ ọbụla, ndị na-adịghị ebu iro nʼobi, ndị na-adịghị agba asịrị, kama ndị nwere obi umeala, na ndị kwesiri ntụkwasị obi nʼihe niile.
12Ndị niile a ga-ahọpụta ije ozi na chọọchị aghaghị ịbụ ndị nwere naanị otu nwunye, ndị na-achịzi ụmụ ha na ezinaụlọ nke aka ha nke ọma. 13Nʼihi na ndị ahụ rụrụ ọrụ ije ozi ha nke ọma nwere ụgwọ ọrụ. Ụgwọ ọrụ ha bụkwa nsọpụrụ ahụ ndị ọzọ ga-asọpụrụ ha, na nkwuwa okwu ha nwere banyere okwukwe a nʼime Kraịst Jisọs.
Ihe omimi
14Enwere m olileanya na m ga-abịa ileta gị na mgbe na-adịghị anya, ma ana m edere gị ihe ndị a. 15Asị na m enweghị ike bịa ọsịịsọ, ị ga-amata otu ndị mmadụ kwesiri isi bie obi nʼezinaụlọ Chineke, nke bụ nzukọ nke Chineke dị ndụ, ogidi na ntọala nke eziokwu ahụ. 16Karịchasịa nke a, ọ bụ ihe omimi dị ukwuu, bụ ntọala ebe ezi ịdị nsọ si walite:
Ọ pụtara ihe nʼụdịdị mmadụ,
Mmụọ Nsọ gosiri na ọ bụ onye ezi omume,
ndị mmụọ ozi hụrụ ya,
e kwusara ihe banyere ya nye mba niile,
ụwa niile kwenyeere na ya,
a nabatakwara ya nʼebube nke eluigwe.

Você sabia?
Supervisores, diáconos e a casa de Deus
- O capítulo diz que quem aspira a ser supervisor deseja uma tarefa nobre, mas deve ser irrepreensível: marido de uma só mulher, moderado, hospitaleiro, apto para ensinar, amável e livre do amor ao dinheiro, entre outras qualidades. Deve governar a própria casa e manter os filhos sob controle com toda a dignidade, pois o autor pergunta como pode cuidar da igreja de Deus quem não sabe fazer isso. Não deve ser recém-convertido, ou poderá ficar presunçoso e cair na mesma condenação do diabo, e precisa ter boa reputação entre os de fora.Fontes: o próprio texto bíblico
- Os diáconos devem ser dignos, não de fala dupla, não dados a muito vinho e não gananciosos por dinheiro, e devem guardar o mistério da fé com a consciência limpa. Devem ser provados primeiro e só podem servir se forem irrepreensíveis; como o supervisor, o diácono deve ser marido de uma só mulher e governar bem os filhos e a própria casa. O capítulo também diz que as mulheres devem ser dignas, não caluniadoras, mas moderadas e fiéis em tudo, e que os que servem bem como diáconos alcançam uma posição elevada e grande confiança na fé que há em Cristo Jesus.Fontes: o próprio texto bíblico
- O autor espera chegar em breve, mas escreve caso se atrase, para que o destinatário saiba como cada um deve se portar na casa de Deus, a igreja do Deus vivo, coluna e fundamento da verdade. O capítulo termina com uma confissão comum de que o mistério da piedade é grande: ele apareceu em carne, foi vindicado pelo Espírito, foi visto pelos anjos, foi proclamado entre as nações, foi crido em todo o mundo e foi elevado em glória.Fontes: o próprio texto bíblico
Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.
Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org