Nations Bible

1 Samuel 4

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.

1Okwu Samuel rutere ndị Izrel niile ntị.

Ndị Filistia adọta igbe ọgbụgba ndụ nʼagha

Mgbe Izrel pụrụ izute ndị Filistia nʼagha, ha mara ụlọ ikwu ha na Ebeneza, ma ndị Filistia mara nke ha nʼAfek. 2Nʼagha a lụrụ nʼụbọchị ahụ, ndị Filistia doro onwe ha nʼusoro izute ndị Izrel, dịka agha na-agbasa, ndị Filistia lụgburu ụmụ Izrel, gbukwaa puku mmadụ anọ nʼime ha. 3Mgbe ndị agha Izrel fọdụrụ laghachiri nʼụlọ ikwu ha, ndị okenye Izrel jụrịtara onwe ha sị, “Gịnị mere Onyenwe anyị ji kwe ka ndị Filistia merie anyị taa. Ka anyị gaa Shaịlo buputa igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, ka o soro anyị jee agha, ka ọ napụta anyị site nʼaka ndị iro anyị.”

4Ya mere, ha zigara ndị mmadụ ka ha gaa Shaịlo. Ha sitere nʼebe ahụ bute igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, onye ahụ na-anọkwasị nʼoche ebere nʼetiti cherubim. Ụmụ ndị ikom Elayị abụọ, bụ Hofni na Finehaz, nọnyeere igbe ọgbụgba ndụ Chineke ahụ.

5Mgbe e bubatara igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ nʼebe ndị agha Izrel mara ụlọ ikwu ha, ndị Izrel tiri mkpu mere ka ala maa jijiji. 6Mgbe ndị Filistia nụrụ ụda mkpu a, ha jụrụ sị, “Gịnị na-eme? Ọ bụ gịnị kpatara oke iti mkpu a nʼụlọ ikwu ndị Hibru?”

Mgbe a gwara ha na ọ bụ nʼihi na igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị erutela, 7ụjọ tụrụ ndị Filistia. Ha sịrị, “Chi abatala nʼọmụma ụlọ ikwu ahụ. Ahụhụ dịrị anyị nʼihi na ihe dị otu a emetụbeghị nʼoge gara aga. 8Ahụhụ dịrị anyị! Onye ga-anapụta anyị site nʼaka chi ndị a dị ike? Nʼihi na ọ bụ chi ndị a ji ihe otiti dị iche iche tie ndị Ijipt mgbe ụmụ Izrel nọ nʼọzara. 9Unu dị ike, unu ndị Filistia, bụrụkwanụ ndị ikom, ma ọ bụghị otu a, unu ga-aghọ ohu ndị Hibru dịka ha bụụrụ unu ndị ohu. Bụrụnụ ndị ikom, lụọ agha!”

10Ndị Filistia lụrụ ọgụ dịka dike, lụgbuo ndị Izrel. Ndị agha ji ụkwụ eje ọgụ ọnụọgụgụ ha dị iri puku atọ nwụrụ nʼotu ụbọchị ahụ. Ma ndị fọdụrụ gbalara nʼụlọ ikwu ha. 11Ndị Filistia dọtara igbe ọgbụgba ndụ Chineke nʼagha, ma gbukwaa Hofni na Finehaz ụmụ Elayị.

Ọnwụ Elayị

12Ma otu nwoke onye Benjamin gbapụrụ ọsọ site nʼọgbọ agha ahụ, gbara ruo Shaịlo nʼotu ụbọchị ahụ, o yi uwe dọwara adọwa, aja dịkwa ya nʼisi. 13Mgbe o rutere, Elayị nọ nʼoche ya nʼakụkụ ụzọ, na-eche, nʼihi na obi ya na-ama jijiji, nʼihi igbe ọgbụgba ndụ Chineke. Mgbe nwoke ahụ batara nʼime obodo, kọọ ihe mere, mkpu akwa dara nʼobodo ahụ niile.

14Elayị nụrụ iti mkpu ahụ jụọ sị, “Gịnị bụ isi ụzụ a?”

Onyeozi ahụ mere ngwangwa bata gwa Elayị okwu. 15Elayị agbaala iri afọ itoolu na afọ asatọ nʼoge a, nke mere na ọ naghị ahụkwa ụzọ. 16Nwoke ahụ gwara Elayị sị, “Esi m nʼihu agha gbalata. Anọ m nʼebe ahụ taa hụ ka agha si gaa.”

Elayị jụrụ sị, “Nwa m, ọ bụ gịnị mere?”

17Onyeozi ahụ zara sị, “Izrel sitere nʼihu ndị Filistia gbaa ọsọ. E tigbukwara ọtụtụ nʼime ndị agha ha. Ọzọ, ụmụ gị abụọ, Hofni na Finehaz nwụrụ. E burukwara igbe ọgbụgba ndụ Chineke.”

18Mgbe onyeozi ahụ kwutere maka igbe ọgbụgba ndụ Chineke. Elayị sitere nʼoche ya dalaa azụ nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama, dajie olu ya, nwụọ! Nʼihi na o meela nnọọ agadi. Ọ bụkwa onye buru ibu. Ya onwe ya kpekwara ụmụ Izrel ikpe iri afọ anọ.

19Nwunye nwa ya, bụ nwunye Finehaz, dị ime, nọọkwa nso oge ịmụ nwa ya. Mgbe ọ nụrụ maka obubu e buuru igbe ọgbụgba ndụ Chineke, nụkwa maka ọnwụ nna di ya na di ya, ọ mụpụtara nwa ya nʼike. Ma ọ nwụrụ nʼihi ihe mgbu nke afọ ime. 20Ma mgbe ọ na-anwụ, ndị inyom na-eji ya ime, sịrị ya, “Atụla egwu, adala mba, ị mụọla nwa nwoke.” Ma ọ zaghị ha ihe ọbụla. Ọ ṅakwaghị ha ntị.

21Ọ gụrụ nwantakịrị aha, kpọọ ya Ịkabọdụ, kwuo sị, “Ebube esitela nʼIzrel pụọ,” nʼihi obubu e buuru igbe ọgbụgba ndụ Chineke, na nʼihi ọnwụ nna di ya na di ya. 22O kwuru sị, “Ebube esitela nʼIzrel pụọ, nʼihi na e buuru igbe Chineke.”

Ilustração artística — interpretação, não registro histórico.

Você sabia?

A Arca capturada e a queda da casa de Eli

  • O nome do local Ebenézer, que significa pedra de ajuda, aparece aqui por antecipação. Samuel ergueu e nomeou a pedra memorial apenas anos mais tarde, após uma vitória posterior sobre os filisteus.Fontes: Ebenezer · o próprio texto bíblico
  • Os filisteus ficaram aterrorizados quando a Arca chegou ao acampamento hebreu, demonstrando que o conhecimento sobre as pragas enviadas contra o Egito havia se espalhado entre os povos vizinhos no antigo Oriente Próximo.Fontes: o próprio texto bíblico
  • Eli julgou Israel durante quarenta anos antes de morrer com o pescoço quebrado ao saber da captura da Arca e da morte de seus filhos Hofni e Fineias na batalha.Fontes: Eli · Hophni · Phinehas · o próprio texto bíblico

Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.

Lugares deste capítulo

  • Aphek · Hoje: Tell Ras el Ain · 32.105, 34.930 · versículo 1
  • Shiloh · Hoje: Khirbet Seilun · 32.056, 35.290 · versículos 3, 4, 12, 13

Só aparecem lugares com identificação de alta confiança (90% ou mais segundo as fontes acadêmicas reunidas pelo OpenBible). Mapa da época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa atual: © colaboradores do OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Fale com a gente

Conte de onde você lê, como a Bíblia tem te ajudado ou o que podemos melhorar. Lemos todas as mensagens.