1 Samuel 3
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.
Onyenwe anyị akpọọ Samuel
1Nwata ahụ bụ Samuel nọkwa na-ejere Onyenwe anyị ozi nʼihu Elayị. Nʼụbọchị ndị ahụ okwu Onyenwe anyị dị ụkọ, adịghịkwa ahụ ọtụtụ ọhụ.
2O ruru nʼotu abalị, ka Elayị dinara ala nʼọnọdụ ya ịrahụ ụra, ebe ọ bụ na anya ya akala nka nke bụ na ọ dịghị ahụzikwa ụzọ nke ọma. 3Mgbe ahụ, oriọna Chineke anyụbeghị, Samuel dinara nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, nʼebe ahụkwa ka igbe ọgbụgba ndụ Chineke dị. 4Onyenwe anyị kpọrọ Samuel oku,
Samuel zara sị, “Lee m nʼebe a.” 5O biliri jekwuru Elayị, sị ya, “Lee m abịala m.”
Ma Elayị sịrị ya, “Mba, akpọghị m gị, laghachi gaa dinaa ala.” Samuel gara dina ala.
6Ọzọkwa, Onyenwe anyị kpọrọ ya sị, “Samuel!” Samuel gbaara ọsọ jekwuru Elayị sị ya, “Lee m, gịnị ka m ga-eme?”
Ma Elayị zara sị ya. “Mba akpọghị m gị oku, nwa m. Laghachi gaa dinaa ala.”
7Ma Samuel amatabeghị onye Onyenwe anyị bụ, ekpughebeghị okwu Onyenwe anyị nye ya.
8Onyenwe anyị kpọrọ ya oku nke ugbo atọ; ọzọkwa Samuel biliri jekwuru Elayị sị ya, “Lee m, gịnị ka ị chọrọ ka m mee?”
Mgbe ahụ, Elayị ghọtara na ọ bụ Onyenwe anyị na-akpọ nwantakịrị ahụ, 9nʼihi ya ọ gwara Samuel okwu sị, “Laghachi, dinaa ala. Ọ bụrụ na ọ kpọọ gị ọzọ, sị ya, ‘Lee m, kwuo, Onyenwe anyị, nʼihi na ohu gị na-ege ntị.’ ” Ya mere Samuel laghachiri gaa dinaa ala.
10Onyenwe anyị bịara guzo onwe ya nʼebe ahụ, kpọọ ya ọzọ dịka o si kpọọ ya na mbụ sị, “Samuel! Samuel!”
Samuel zara sị, “Lee m, kwuo, nʼihi na ohu gị na-anụ.”
11Onyenwe anyị gwara Samuel sị, “Lee, ana m aga ime ihe nʼIzrel nke ga-eme ka ntị nụrụ ya zụọ wuruwuru. 12Nʼoge ahụ aga m emezu ihe niile m kwuru megide Elayị na ezinaụlọ ya, site na mmalite ruo ọgwụgwụ. 13Nʼihi na agwara m ya na m ga-ekpe ezinaụlọ ya ikpe, ruo mgbe ebighị ebi, nʼihi mmehie ahụ ọ maara ihe banyere ya. Nʼihi na ụmụ ya mere onwe ha ndị a na-elelị anya, ma o meghị ihe ọbụla ịkwụsị ha. 14Ya mere, aṅụọla m iyi nye ụlọ Elayị sị, ‘Ikpe ọmụma dịkwasịrị ụlọ Elayị bụ nke a na-agaghị eji onyinye maọbụ ịchụ aja kpuchie.’ ”
15Samuel dinara ala tutu ruo ụtụtụ. Mgbe chi bọrọ, o meghere ọnụ ụzọ ụlọ nzute Onyenwe anyị dịka ọ na-eme. Ma egwu tụrụ ya ịgwa Elayị ọhụ ahụ. 16Ma Elayị kpọrọ ya sị, “Samuel, nwa m.”
Samuel zara sị, “Lee m nʼebe a.”
17Elayị jụrụ ya sị, “Gịnị ka ọ gwara gị? Ezola ihe ọbụla nʼebe m nọ. Ka Chineke mesoo gị mmeso, otu ọbụla mmeso ahụ si dị njọ, ma ọ bụrụ na i zoo ihe ọbụla ọ gwara gị nʼebe m nọ.” 18Ya mere, Samuel gwara ya ihe niile, o zokwaghị ihe ọbụla. Mgbe ahụ Elayị kwuru okwu sị, “Ya onwe ya bụ Onyenwe anyị, ya meekwa dịka o si dị ya mma nʼanya.”
19Onyenwe anyị nọnyeere Samuel mgbe ọ na-eto, meekwa ka amụma niile Samuel buru mezuo. 20Ndị Izrel niile, site na Dan ruo Bịasheba, matara na Samuel bụ onye amụma Onyenwe anyị kwesiri ntụkwasị obi. 21Onyenwe anyị gakwara nʼihu na-egosi onwe ya na Shaịlo. Nʼebe ahụ o gosiri onwe ya nye Samuel site nʼokwu ya.

Você sabia?
O Chamado de Samuel
- O santuário que abrigava a arca de Deus ficava em Siló, onde o jovem Samuel servia sob os cuidados do sumo sacerdote Eli. O texto relata que revelações divinas e visões eram raras naquela época, antes de o Senhor voltar a Se manifestar a Samuel em Siló.Fontes: o próprio texto bíblico · Shiloh · Eli
- Eli exerceu o sumo sacerdócio e julgou Israel por quarenta anos, mas sua falha em repreender com firmeza seus filhos corruptos, Hofni e Fineias, trouxe uma sentença divina contra sua linhagem. O ofício sacerdotal permaneceu em sua família até que o rei Salomão depôs Abiatar e nomeou Zadoque.Fontes: Eli · o próprio texto bíblico
- A expressão de Dã a Berseba designa toda a extensão territorial da Terra Prometida, desde seu limite ao norte em Dã até a fronteira sul em Berseba, uma distância de cerca de 144 milhas. Seu uso enfatiza que a nação inteira reconheceu Samuel como um profeta confirmado.Fontes: Beersheba · o próprio texto bíblico
Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.
Lugares deste capítulo
- Dan · Hoje: Tel Dan · 33.249, 35.652 · versículo 20
- Shiloh · Hoje: Khirbet Seilun · 32.056, 35.290 · versículo 21
Só aparecem lugares com identificação de alta confiança (90% ou mais segundo as fontes acadêmicas reunidas pelo OpenBible). Mapa da época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa atual: © colaboradores do OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org