Nations Bible

1 Samuel 10

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.

1Mgbe ahụ, Samuel weere karama mmanụ wụkwasị ya nʼisi, sutukwa ya ọnụ nʼagba sị ya, “Ọ bụ na Onyenwe anyị etebeghị gị mmanụ ime gị onyendu ihe nketa ya? 2Mgbe ị ga-ahapụ m nʼebe a, ị ga-ahụ ndị ikom abụọ nʼakụkụ ili Rechel na Zelza, nʼala Benjamin, ha ga-agwa gị, ‘A chọtala ịnyịnya ibu ndị ahụ furu efu, ugbu a, nna gị akwụsịla iche ihe gbasara ịnyịnya ibu ya, ma ọ nọkwa na-echegbu onwe ya nʼihi gị, ọ na-ajụ, “Olee ihe m ga-eme banyere ọkpara m?” ’

3“Mgbe i ruru nʼosisi ukwu Taboa, ị ga-ezute ndị ikom atọ ndị na-aga ife Chineke ofufe na Betel. Otu nʼime ha ga-ebu ụmụ ewu atọ, nke ọzọ ga-eji ogbe achịcha atọ, ma nke atọ ga-eji otu karama mmanya. 4Ha ga-ajụ gị banyere ọdịmma gị, nyekwa gị ogbe achịcha abụọ, nke ị ga-anara site nʼaka ha.

5“Emesịa, ị ga-aga Gibea nke Chineke, ebe ndị agha ndị Filistia mara ụlọ ikwu nche. Mgbe ị na-abata obodo ahụ, ị ga-ezute ndị amụma, ndị si nʼebe dị elu ahụ na-arịdata. Ha ga na-akpọ une, na egwu otiti, na ọja, na ụbọ akwara. Ha ga na-ebukwa amụma. 6Nʼoge ahụ, mmụọ Onyenwe anyị ga-abịakwasị gị, ị ga-esorokwa ha buo amụma. Ị ga-abụkwa onye a gbanwere, onye dị iche. 7Mgbe ihe ịrịbama ndị a mezuru ị ga na-eme ihe ọbụla i chepụtara nʼobi gị, nʼihi na Chineke nọnyeere gị.

8“Ị ga-aga Gilgal chere m nʼebe ahụ abalị asaa, nʼihi na ana m abịa ịchụ aja nsure ọkụ na aja udo. Aga m agwa gị ihe ị ga-eme mgbe m bịara.”

Sọl ebuo amụma

9Mgbe ọ na-atụgharị ka ọ si ebe Samuel nọ pụọ, Chineke gbanwere ya, nye ya obi ọhụrụ, ihe ịrịbama ndị ahụ mezukwara nʼụbọchị ahụ. 10Mgbe ya na onye na-ejere ya ozi rutere Gibea, ndị amụma nọ nʼahịrị zutere ha. Mmụọ nke Chineke bịakwasịrị ya nʼebe ọ dị ukwu, o sooro ha malite ibu amụma. 11Mgbe ndị niile maara Sọl hụrụ ya ka o so ndị a na-ebu amụma, ha jụrụ onwe ha ajụjụ sị, “Gịnị mere nwa Kish? Sọl, ọ ghọọla otu nʼime ndị amụma?”

12Otu nʼime ndị bi nʼebe ahụ jụrụ sị, “Onye ka nna ha bụ?” Nke a bụ mmalite okwu ahụ a na-ekwu sị, “Sọl ọ ghọọla otu nʼime ndị amụma?” 13Mgbe Sọl buchara amụma, ọ rigooro gaa nʼebe ịchụ aja ahụ dị nʼelu ugwu.

14Mgbe nwanne nna ya hụrụ Sọl, ọ jụrụ ya ajụjụ sị, “Olee ebe ị gara?”

Sọl zara ya sị, “Anyị gara ịchọ ịnyịnya ibu ndị ahụ furu efu, ma anyị achọtaghị ha, nʼihi ya anyị gara nʼebe onye amụma a na-akpọ Samuel ịjụta ase ebe ha nọ.”

15Ma nwanne nna Sọl sịrị, “Gwa m ihe Samuel gwara gị.”

16Sọl zara ya sị, “Ọ gwara anyị na a chọtala ịnyịnya ibu ndị ahụ.” Ma okwu gbasara alaeze, dịka Samuel siri kwuo ya, ọ gwaghị ya ihe ọbụla.

17Emesịa, Samuel kpọrọ nzukọ ndị Izrel niile na Mizpa, ka ha bịa zute Onyenwe anyị. 18Ọ gwara ha sị, “Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwuru, ‘Mụ onwe m si nʼala Ijipt kpọpụta Izrel ma napụtakwa unu site nʼaka ike ndị Ijipt, na site nʼaka alaeze niile bụ ndị kpagburu unu.’ 19Ma ugbu a, unu ajụla Chineke unu onye na-azọpụta unu site nʼihe ndakwasị na nhụju anya unu niile. Unu kwukwara sị, ‘Mba, nye anyị eze ga-achị anyị.’ Ugbu a, doonụ onwe unu nʼusoro nʼihu Onyenwe anyị dịka ebo unu na ikwu unu niile si dị.”

20Samuel mere ka ebo Izrel niile bịaruo nso nʼebo nʼebo, nza mara ebo Benjamin. 21O mere ka ebo Benjamin bịaruo nso nʼagbụrụ nʼagbụrụ, nza mara agbụrụ Matri. Nʼikpeazụ nza ahụ mara Sọl, nwa Kish. Ha chọgharịrị ya ma ha ahụghị ya. 22Ha jụrụ Onyenwe anyị ase ọzọ, “Nwoke ahụ ọ bịala nʼebe a?”

Onyenwe anyị sịrị, “E, Lee, o zoro onwe ya nʼetiti akpa ndị ahụ.”

23Ha gbaara gaa nʼebe ahụ kpọpụta ya. Mgbe ọ pụtara guzoro nʼetiti ha, ha hụrụ na o toro ogologo karịa onye ọbụla site nʼubu ruo nʼisi. 24Samuel gwara ndị ahụ niile okwu sị, “Onye a bụ nwoke ahụ Onyenwe anyị họpụtara ka ọ bụrụ eze unu. Ọ dịghị onye ọzọ dịka ya nʼIzrel!”

Mgbe ahụ, mmadụ niile tiri mkpu sị, “Ka eze dị ogologo ndụ gaa nʼihu!”

25Ọzọkwa, Samuel gwara ndị Izrel ihe bụ ọrụ eze, na ihe ruuru ya. O dekwara ihe ndị a nʼakwụkwọ, debe akwụkwọ ahụ nʼihu Onyenwe anyị. Emesịa, Samuel mechiri nzukọ ahụ. Onye ọbụla laghachikwara nʼụlọ ya.

26Mgbe Sọl laghachiri nʼobodo ya, bụ Gibea, ndị ikom ndị Chineke metụrụ aka nʼobi sooro ya. 27Ma ụfọdụ ndị efulefu jọgburu onwe ha kwuru sị, “Olee otu nwoke a ga-esi zọpụta anyị?” Ha lelịrị ya anya, jụkwa iwetara ya onyinye ịnata ihuọma. Ma Sọl gbachitere ha nkịtị.

Ilustração artística — interpretação, não registro histórico.

Você sabia?

A Unção e a Proclamação de Saul

  • Para confirmar a unção secreta de Saul, Samuel predisse três encontros específicos: dois homens junto ao túmulo de Raquel em Zelza, três homens no carvalho de Tabor e um grupo de profetas tocando instrumentos em Gibeá de Deus.Fontes: o próprio texto bíblico · Tabor (Plain) · Zelzah
  • Samuel convocou as tribos em Mispá, uma colina alta no território de Benjamim tradicionalmente usada para grandes assembleias nacionais, onde a tribo de Benjamim e o clã de Matri foram selecionados por sorteio.Fontes: o próprio texto bíblico · Mizpah · Matri
  • Embora Saul fosse uma cabeça mais alto do que todo o povo, ele se escondeu entre a bagagem até que uma consulta ao Senhor revelou sua localização à multidão.Fontes: o próprio texto bíblico · Saul

Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.

Lugares deste capítulo

  • Egypt · 30.129, 31.308 · versículo 18
  • Jordan · Hoje: Jordan River · 31.761, 35.558 · versículo 27

Só aparecem lugares com identificação de alta confiança (90% ou mais segundo as fontes acadêmicas reunidas pelo OpenBible). Mapa da época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa atual: © colaboradores do OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Fale com a gente

Conte de onde você lê, como a Bíblia tem te ajudado ou o que podemos melhorar. Lemos todas as mensagens.