Nations Bible

1 Reis 4

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.

Ndịisi ozi Solomọn

1Ya mere Solomọn ghọrọ eze ndị Izrel niile.

2Ndị a bụ aha ndịisi ọchịchị obodo eze Solomọn họpụtara inyere ya aka.

Azaraya, nwa Zadọk bụ onye nchụaja.

3Elihoref na Ahija, ụmụ ndị ikom Shisha, bụ ndị ode akwụkwọ.

Jehoshafat, nwa Ahilud bụ onye na-edekọ akụkọ.

4Benaya, nwa Jehoiada bụ onyeisi agha ndị Izrel.

Zadọk na Abịata, bụ ndị nchụaja.

5Azaraya nwa Netan bụ onyeisi na-elekọta ndị na-ejere eze ozi.

Zabud nwa Netan bụ onye nchụaja na onye ndụmọdụ nye eze.

6Ahisha, bụ onyeisi na-elekọta nʼụlọeze.

Adoniram nwa Abda bụ onyeisi na-elekọta ndị ọrụ mmanye.

7Eze Solomọn họpụtara ndị ikom iri na abụọ ndị o mere ndịisi ga-elekọta akụkụ iri na abụọ nke o mere ka Izrel dịrị. Mmadụ iri na abụọ ndị a nwekwa ọrụ iwetara eze ihe oriri. Nwoke ọbụla nʼime ha nwe iwetara eze na ezinaụlọ ya ihe oriri otu ọnwa nʼafọ.

8Nke a bụ aha ndị ikom iri na abụọ ahụ.

Ben-Hua, onye na-achị ala ugwu ugwu Ifrem.

9Ben-Deka, onye na-achị Makaz, na Shaalbim na Bet-Shemesh, na Elọn Bethanan.

10Ben-Hesed, onye na-achị Arubot, na Soko, na Ala Hefa niile.

11Ben-Abinadab, onye na-achị ala elu elu Doa. Nwoke a lụrụ Tafat, nwa nwanyị Solomọn.

12Baana, nwa Ahilud, onye na-achị Teanak, na Megido nʼakụkụ Bet-Shan niile, nke dị nʼakụkụ Zaretan na ndịda Jezril, sitekwa na Bet-Shan ruo Ebel-Mehola gafee ma ruokwa Jokmeam.

13Ben-Geba, onye na-achị Ramọt Gilead, na obodo niile nke ikwu Jaịa, nwa Manase nwere nʼime Gilead, na akụkụ Agob niile nke dị na Bashan, na iri obodo ukwu isii e ji mgbidi gbaa gburugburu, nke nwekwara mkpọrọ bronz e ji kpụọ ụzọ ya.

14Ahinadab nwa Ido, onye na-achị Mahanaim.

15Ahimaaz, onye na-achị Naftalị (ọ lụkwara nwa nwanyị Solomọn a na-akpọ Basemat).

16Baana nwa Hushaị, onye na-achị Asha na Alot.

17Jehoshafat nwa Parua onye na-achị Isaka.

18Shimei nwa Ela onye na-achị Benjamin.

19Gebea nwa Uri, onye na-achị Gilead (ala Saịhọn eze ndị Amọrait, na nke Ọg eze Bashan). Naanị ya ka e doro dịka gọvanọ ala ahụ.

Ihe a na-ebubatara Solomọn kwa ụbọchị

20Nʼoge a, ndị Juda na Izrel bara ụba nʼọnụọgụgụ dịka aja dị nʼakụkụ osimiri. Ha dịkwa ukwuu nʼọnụọgụgụ. Ha na-eri na-aṅụ, na-emekwa onwe ha obi ụtọ. 21Ala niile Solomọn na-achị sitere nʼoke osimiri Yufretis ruo ala ndị Filistia, rukwaa nʼoke ala ndị Ijipt. Ndị niile a lụgburu nʼagha nʼobodo ndị a na-atụta ụtụ ha na-enye Solomọn. Ha nọgidekwara nʼokpuru Solomọn ụbọchị niile nke ndụ ya.

22Ihe oriri a na-ewebata nʼụlọ Solomọn ụbọchị niile bụ otu narị bushel ụtụ ọka na iri bushel asatọ, na iri akpa ọka a kwọrọ akwọ isii, 23na ehi iri mara abụba, na iri ehi abụọ a zụrụ nʼebe a na-azụ anụ, na narị atụrụ na ewu. A gụnyeghị anụ ele na mgbada na oke ele na ọkụkọ ọma a na-ewebata. 24Nʼihi na ọ chịrị alaeze niile a ruo nʼakụkụ ọdịda anyanwụ nke osimiri Yufretis, site na Tifsa ruo na Gaza. O nwekwara udo nʼakụkụ niile. 25Nʼoge ndụ Solomọn niile, Juda na Izrel site na Dan ruo Bịasheba bi nʼudo. Nwoke ọbụla nọ nʼokpuru osisi vaịnị na nʼokpuru osisi fiig nke ya.

26Ọnụọgụgụ ụlọ a na-etinye ụgbọ agha ịnyịnya na-adọkpụ nke Solomọn nwere dị puku anọ. Ọnụọgụgụ ịnyịnya a na-agba agba o nwere dị puku iri na abụọ.

27Nʼọnwa ọbụla, ndị ahụ a họpụtara ịchị Izrel na-ewetara eze Solomọn na ndị ụlọ ya ihe oriri. Ha adịghị ekwekwa ka otu ihe kọọ nʼụlọ ya. 28Ha na-ewetakwa ọka balị na ahịhịa ọka nʼebe o kwesiri, maka ịnyịnya na-adọkpụ ụgbọ agha na ịnyịnya ụkwụ ọsọ ndị ọzọ dịka ihe ha ketara nʼụtụ si dị.

Amamihe Solomọn

29Chineke nyere Solomọn amamihe, na uche nghọta, na mmụọ ịmụta ọtụtụ ihe nke bara ụba dịka aja dị nʼakụkụ osimiri. 30Amamihe Solomọn dị ukwuu karịa amamihe ndị si ọwụwa anyanwụ. Nʼezie, ọ dị ukwuu karịakwa amamihe ndị maara ihe nʼIjipt. 31Ọ maara ihe karịa onye ọbụla, karịa Etan onye Ezra, na Heman, na Kalkol, na Dada, ụmụ ndị ikom Mahol. Ihe banyere ịdị ukwuu ya gbasara na mba niile gbara ha gburugburu. 32Ọ tụrụ puku ilu atọ, deekwa abụ ọnụọgụgụ ha dị otu puku na ise. 33O kwuru okwu banyere osisi, site na osisi sida nke Lebanọn ruo nʼahịhịa hisọp nke na-eto na mgbidi aja, na ihe banyere ụmụ anụmanụ na anụ ufe, na anụ na-akpụgharị nʼala nakwa azụ. 34Ndị eze niile dị nʼụwa bụ ndị bịara ịnụrụ banyere amamihe ya zitere ndị si na mba niile dị iche iche ịnụrụ okwu amamihe Solomọn.

Ilustração artística — interpretação, não registro histórico.

Você sabia?

A corte e a administração de Salomão

  • Salomão organizou seu reino sob oficiais principais e doze governadores regionais, cada um responsável por fornecer mantimentos para a corte real durante um mês do ano. Essa rede sustentava a casa de Salomão com grandes suprimentos diários de farinha, gado e caça, além de fornecer forragem para milhares de cavalos em um domínio que se estendia até o rio Eufrates.Fontes: o próprio texto bíblico · Euphrates
  • A administração de Salomão manteve continuidade com a corte de Davi, preservando o sumo sacerdote Zadoque, o comandante do exército Benaia, filho de Joiada, e o cronista real Jeosafá, filho de Ailude. Seus secretários, Eliorefe e Aías, eram filhos de Sisa (também registrado como Savsa), que havia servido anteriormente como escrivão de Davi.Fontes: o próprio texto bíblico · Zadok · Benaiah · Jehoshaphat
  • O relato bíblico celebra a vasta sabedoria de Salomão, observando que ele compôs três mil provérbios e mais de mil cânticos. Seu conhecimento registrado abrangia a história natural, desde os imponentes cedros do Líbano até o pequeno hissopo que brota nos muros, além de animais, aves, répteis e peixes.Fontes: o próprio texto bíblico

Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.

Lugares deste capítulo

  • Megiddo · Hoje: Tel Megiddo · 32.585, 35.184 · versículo 12
  • Taanach · Hoje: Tell Ta’anakh · 32.522, 35.219 · versículo 12
  • Argob · 32.969, 36.455 · versículo 13
  • Bashan · 32.781, 35.935 · versículos 13, 19
  • Gilead · Hoje: Gilead 1 · 32.187, 35.692 · versículos 13, 19
  • Havvoth-jair · 32.588, 35.726 · versículo 13
  • Egypt · 30.129, 31.308 · versículos 21, 30
  • Euphrates · Hoje: Euphrates River · 31.004, 47.442 · versículos 21, 24
  • Gaza · Hoje: Tell Harube · 31.504, 34.464 · versículo 24
  • Dan · Hoje: Tel Dan · 33.249, 35.652 · versículo 25
  • East · Hoje: region around Amman · 31.955, 35.934 · versículo 30
  • Lebanon · 33.540, 35.584 · versículo 33

Só aparecem lugares com identificação de alta confiança (90% ou mais segundo as fontes acadêmicas reunidas pelo OpenBible). Mapa da época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa atual: © colaboradores do OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Fale com a gente

Conte de onde você lê, como a Bíblia tem te ajudado ou o que podemos melhorar. Lemos todas as mensagens.