1 Reis 3
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.
Solomọn arịọ maka amamihe
1Solomọn na Fero eze Ijipt jikọtara onwe ha nʼotu, ọ lụrụ nwa nwanyị Fero. Ọ kpọbatara ya nʼobodo Devid ruo mgbe o wusiri ụlọeze ya na ụlọnsọ Onyenwe anyị, na mgbidi gbara Jerusalem gburugburu. 2Nʼoge ahụ, ndị Izrel ka na-achụ aja ha nʼebe dị elu niile, nʼihi na ewubeghị ụlọnsọ ukwu nye aha Onyenwe anyị. 3Ma Solomọn gosiri ịhụnanya nʼebe Onyenwe anyị nọ, site na ịgbaso ntụziaka niile nke Devid nna ya nyere ya, ọ bụ naanị na ọ chụrụ ọtụtụ aja dị iche iche, na ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼebe dị elu dị iche iche.
4Eze gara Gibiọn nʼihi ịchụ aja, nʼihi na ebe ahụ bụ ebe kachasị mkpa, dị elu. Solomọn chụrụ otu puku aja nsure ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja ahụ. 5Na Gibiọn, Onyenwe anyị mere ka Solomọn hụ ya anya na nrọ nke abalị, Chineke sịrị ya, “Rịọọ ihe ọbụla ị chọrọ ka m nye gị.”
6Solomọn zara sị, “I gosila ohu gị bụ nna m Devid obi ebere dị ukwuu, nʼihi na ọ bụ onye kwesiri ntụkwasị obi nye gị, onye ezi omume nakwa onye obi ya ziri ezi. Ị nọgidela na-egosi ya obi ebere dị ukwuu, nyekwa ya nwa nwoke ga-anọkwasị nʼocheeze ya nʼụbọchị taa.
7“Ugbu a, Onyenwe anyị bụ Chineke m, i meela ohu gị eze nʼọnọdụ nna m, bụ Devid. Ma abụ m naanị nwantakịrị na-amaghị otu esi apụ ma na-abatakwa. 8Ohu gị nọ nʼebe a, nʼetiti ndị gị ị họpụtara, ndị bara ụba nke ukwuu, ndị a na-adịghị agụta ọnụ nʼihi nʼọnụọgụgụ ha babigara ụba oke. 9Ya mere, nye ohu gị uche nghọta nke m ga-eji chịa ndị gị, na ịghọta ihe dị iche nʼetiti ezi ihe na ajọ ihe. Nʼihi na onye pụrụ ịchịkọta ndị gị a dị ukwuu?”
10Ọ masịrị Onyenwe anyị na Solomọn rịọrọ nke a. 11Ya mere, Chineke zara sị ya, “Nʼihi na ị rịọrọ amamihe na nghọta ị ga-eji chịa ndị m, ma ị rịọghị m ka m nye gị ndụ ogologo, maọbụ akụnụba, maọbụ ọnwụ nye ndị iro gị. 12Aga m eme dịka ihe ị rịọrọ si dị. Aga m enye gị obi maara ihe na uche ịghọta ihe ziri ezi, nke ga-abụ na ọ dịghị onye ọbụla dịka gị, ọ dịghịkwa onye ọbụla ga-adị ka gị. 13Ọzọkwa, aga m enyekwa gị ihe ndị ahụ ị na-arịọghị m, akụnụba, na nsọpụrụ, ka ọ ga-abụ nʼụbọchị niile nke ndụ gị, ị gaghị enwe onye ọbụla ga-adị ka gị nʼetiti ndị eze niile. 14Ọ bụrụkwa na i jee ije nʼụzọ m niile, debe iwu m, meekwa ihe m gwara gị, dịka nna gị Devid mere, aga m enye gị ogologo ndụ.” 15Mgbe ahụ, Solomọn si nʼụra teta, ghọtakwa na ọ bụ nrọ ka ọ na-arọ.
Ọ lọtara na Jerusalem bata guzo nʼihu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, chụọ aja nsure ọkụ na aja udo. Emesịa, o meere ndị na-ejere ya ozi oke oriri.
Ikpe ziri ezi Solomọn kpere
16Mgbe ihe ndị a gasịrị, ụmụ nwanyị akwụna abụọ bịakwutere eze, guzo nʼihu ya. 17Otu nʼime ha gwara ya sị, “Onyenwe m, mụ na nwanyị a bi nʼotu ụlọ. Anyị abụọ dịkwa ime. Ma eburu m ya ụzọ mụọ nwa nke m. 18Mgbe ụbọchị atọ gasịrị ka m mụsịrị nwa, ya onwe ya mụkwara nwa nke ya. Naanị anyị abụọ bi, o nweghị onye ọzọ binyere anyị.
19“Ma nʼotu abalị, nwa ya nwụrụ mgbe o dinakwasịrị ya nʼoge ọ na-arahụ ụra. 20Mgbe o biliri nʼetiti abalị, chọpụtara na nwa ya anwụọla, o kuuru ya nibe ya nʼakụkụ m, kurukwanụ nwa nke m dị ndụ nibe nʼakụkụ ya onwe ya. 21Nʼisi ụtụtụ, mgbe m tetara nʼụra chọọ inye nwa m ara, achọpụtara m na ọ nwụọla. Ma mgbe m leziri ya anya nke ọma ka chi bọrọ, ahụrụ m na nwa mụ na ya dina abụghị nwa nke m mụrụ.”
22Mgbe ahụ, nwanyị nke ọzọ kwuru sị, “Mba, nwantakịrị ahụ dị ndụ bụ nwa m, ma nke nwụrụ anwụ bụ nwa gị.” Nwanyị nke mbụ zara sị,
“Mba, ọ bụghị eziokwu; nwa nke nwụrụ anwụ bụ nke gị, ma nke dị ndụ bụ nke m.” Otu a ka ha si na-arụrịta ụka nʼihu eze.
23Eze kwuru sị, “Onye nke a na-asị, ‘Nwa m bụ nke dị ndụ, ma nke gị bụ nke nwụrụ anwụ,’ mgbe onye nke ọzọ na-asị, ‘Mba! Nwa gị bụ nke nwụrụ anwụ, ma nke m bụ nke dị ndụ.’ ”
24Mgbe ahụ, eze sịrị, “Wetara m mma agha.” Ya mere, ha wetaara eze mma agha. 25Eze nyere iwu sị, “Kpọwaa nwa ahụ dị ndụ ụzọ abụọ, were otu ọkara nye otu onye, werekwa nke ọzọ nye onye nke ọzọ.”
26Nwanyị ahụ nwa ya dị ndụ jupụtara nʼọmịiko nʼebe nwa ya nọ, ọ gwara eze sị, “Biko, onyenwe m, kunye ya nwantakịrị ahụ dị ndụ. Egbukwala ya.”
Ma onye nke ọzọ sịrị, “Kpọwaa ya abụọ. Nwa a agaghị abụ nke gị, ọ gaghị abụkwa nke m.”
27Mgbe ahụ, eze kpebiri ikpe sị, “Kuru nwantakịrị a dị ndụ kunye ya nwanyị ahụ chọrọ ka ọ dị ndụ. Egbula ya, nʼihi na nwanyị ahụ bụ nne ya.”
28Mgbe ndị Izrel niile nụrụ otu eze si kpebie ikpe a, ha sitere nʼịtụ egwu nye eze nsọpụrụ, nʼihi na ha hụrụ na o si nʼaka Chineke nweta amamihe ikpe ikpe ziri ezi.

Você sabia?
A Sabedoria e o Julgamento de Salomão
- Salomão formou uma aliança com o Egito ao se casar com a filha do faraó, marcando a primeira menção nas Escrituras de uma ligação entre Israel e o Egito desde o Êxodo. Ela residiu na Cidade de Davi enquanto o palácio real de Salomão, o templo e os muros ao redor de Jerusalém estavam sendo construídos.Fontes: Daughter of Pharaoh · o próprio texto bíblico
- Antes da construção do templo em Jerusalém, o povo e o rei Salomão ofereciam sacrifícios nos lugares altos locais. Gibeão era considerado o principal lugar alto porque o tabernáculo havia sido instalado ali após a destruição de Nobe, permanecendo no local até que Salomão concluísse o templo.Fontes: Gibeon · o próprio texto bíblico
- Tendo sucedido a Davi no trono em sua juventude, Salomão descreveu a si mesmo como uma criança pequena quando Deus lhe apareceu em sonho em Gibeão. Em vez de pedir riquezas, vida longa ou a derrota de seus inimigos, ele pediu um coração compreensivo para julgar o povo e discernir entre o bem e o mal.Fontes: Solomon · o próprio texto bíblico
Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.
Lugares deste capítulo
- City of David · 31.774, 35.236 · versículo 1
- Egypt · 30.129, 31.308 · versículo 1
- Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículos 1, 15
- Gibeon · Hoje: El Jib · 31.847, 35.183 · versículos 4, 5
Só aparecem lugares com identificação de alta confiança (90% ou mais segundo as fontes acadêmicas reunidas pelo OpenBible). Mapa da época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa atual: © colaboradores do OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org