1 Coríntios 8
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.
Anụ e ji chụọrọ arụsị aja
1Ugbu a, nʼokwu banyere nri a chụrụ nʼaja nye arụsị, anyị ma na onye ọbụla nwere amamihe. Amamihe na-afụli mmadụ elu mee ka ọ nyaa isi. Ma ịhụnanya na-ewuli elu. 2Ọ bụrụ na ọ dị onye sị na ya maara ihe niile, onye ahụ amatabeghị ihe o kwesiri ịmata. 3Ma onye ahụ hụrụ Chineke nʼanya bụ onye ọ maara.
4Ya mere, ihe banyere nri a chụrụ nʼaja nye arụsị, anyị maara na “Arụsị abụghị ihe ọbụla nʼụwa”, matakwa na “Chi ọzọ adịghị ma ọ bụghị otu Chineke.” 5A sịkwa na arụsị a na-akpọ chi dị, ma ha nọ nʼeluigwe maọbụ nʼụwa (nʼezie ọtụtụ “chi” na “ndị nwe mmadụ” dị otu a dị). 6Ma nʼebe anyị nọ, anyị maara na ọ bụ naanị otu Chineke dị, onye bụ Nna, onye kere ihe niile, na onye anyị na-adị ndụ nʼihi ya. Ọ bụkwa naanị otu Onyenwe anyị ka anyị nwere, onye bụ Jisọs Kraịst, onye e sitere nʼaka ya kee ihe niile, onye na-enyekwa anyị ndụ.
7Ma otu ọ dị, ọ bụghị onye ọbụla nwere ihe ọmụma a. Ụfọdụ nʼime ndụ ha niile, ha na-ele arụsị anya dịka chi dị ndụ. Ha na-echekwa na ihe ọbụla e ji chụọrọ arụsị aja, na ọ bụ chi dị ndụ ka e ji ya chụọrọ aja. Nʼihi nke a, mgbe ọbụla ha riri ihe e ji chụọ aja nye arụsị, ọ na-ewute mmụọ ha nke ukwuu nʼihi na akọnuche ha esighị ike, ọ na-emerụkwa ya. 8Ma ọ bụghị nri ga-eme ka anyị na Chineke dị na mma. Ma anyị riri ma anyị erighị, ọ dịghị ihe ọhụrụ anyị ga-enweta. Ọ dịkwaghị ihe na-efunarị anyị.
9Ma lezienụ anya, otu o si dị, ka ike unu nwere ime ihe ọbụla dị unu mma, ghara ịghọ ihe ịsọ ngọngọ dịrị ndị na-adịghị ike nʼokwukwe ha. 10Nʼihi na ọ bụrụ na ndị ọzọ ahụ gị, gị onye nwere akọnuche, ka ị nọ, na-eri nri nʼụlọ arụsị, ọ bụ na ha agaghị eche na ha bụ ndị okwukwe ha na-esighị ike, ga-enwe obi ike soro gị rie nri a gọrọ arụsị? 11Nʼụzọ dị otu a, ndị kwere ekwe na-adịghị ike, ndị Kraịst nwụrụ nʼihi ha, na-esite nʼihe mmụta gị laa nʼiyi. 12Cheta na ọ bụ mmehie i mere megide Kraịst, mgbe unu na-emegide mmụọ nwanne gị nʼime Kraịst, nʼihi nʼakọnuche ha esighị ike. 13Nʼihi nke a, ọ bụrụ na ihe oriri ga-eme ka nwanna m mee mmehie, agaghị m eri anụ ọzọ, ka m ghara ime ka nwanna m maa nʼọnya.
Você sabia?
Comida sacrificada aos ídolos
- O capítulo começa pondo o conhecimento ao lado do amor: o conhecimento incha, mas o amor edifica. Diz que quem pensa que sabe alguma coisa ainda não conhece como convém conhecer, enquanto quem ama a Deus é conhecido por Deus.Fontes: o próprio texto bíblico
- Sobre comer comida sacrificada aos ídolos, o capítulo diz que um ídolo não é nada no mundo e que não há outro Deus senão um, embora se fale de muitos chamados deuses e senhores. Nem todos têm esse conhecimento: alguns ainda estão tão acostumados aos ídolos que comem esse alimento como se fosse sacrificado a um ídolo, e a consciência fraca deles fica contaminada.Fontes: o próprio texto bíblico
- O capítulo adverte que a liberdade pode se tornar um tropeço para os fracos. Se alguém de consciência fraca vir uma pessoa bem informada comendo no templo de um ídolo, essa pessoa pode ser encorajada a comer comida sacrificada aos ídolos. Quem escreve diz que, se o que ele come fizer seu irmão tropeçar, nunca mais comerá carne.Fontes: o próprio texto bíblico
Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.
Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org