Apocalipsis 12
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toca un versículo para ver sus referencias cruzadas.
Nwanyị na agwọ ochie ahụ
1Oke ihe ịrịbama pụtara ihe nʼeluigwe, otu nwanyị e yikwasịrị anyanwụ dịka uwe. Ọnwa dịkwa nʼokpuru ụkwụ ya abụọ. Okpueze nwee kpakpando iri na abụọ dịkwa ya nʼisi. 2Ọ dị ime, na-etikwa mkpu nʼihi ahụhụ na ihe ụfụ nke ọmụmụ nwa. 3Mgbe ahụ, ihe ama ọzọ pụtara ihe nʼeluigwe, agwọ ochie nke dị ukwuu na-acha uhie uhie a na-akpọ dragọn, nke nwere isi asaa na mpi iri. O kpukwasịkwara okpueze asaa nʼisi ya. 4O nwere ọdụdụ nke o ji dọkpụrụ otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nke kpakpando niile dị nʼeluigwe, tụda ha nʼala. Ọ bịara guzo nʼihu nwanyị ahụ na-achọ ịmụpụta nwa ahụ ọ dị ime ya, nọọ na njikere iri nwantakịrị ahụ ma a mụpụta ya. 5Ọ mụpụtara nwantakịrị nwoke, “onye ga-ejikwa mkpara ọchịchị chịa mba niile ọchịchị.” Nʼotu oge ahụ kwa, e si nʼebe ahụ wepụ nwata ahụ were ya gaa nʼebe Chineke nọ nʼeluigwe nʼocheeze ya. 6Ma nwanyị ahụ si nʼebe ahụ gbapụ gbalaa nʼọzara ebe Chineke kwadebere na ọ ga-anọ. Ebe ahụ ka a ga-elekọta ya anya nke ọma otu puku ụbọchị na narị ụbọchị abụọ na iri ụbọchị isii (1,260).
Agha a lụrụ nʼeluigwe
7Mgbe ahụ, agha dapụtara nʼeluigwe. Maikel na ndị mmụọ ozi ya buru agha megide agwọ ochie ahụ (a na-akpọ dragọn). Dragọn ahụ na ndị mmụọ ozi ya bukwara agha nke ha, 8ma e meriri ha, ha enwekwaghị ọnọdụ ọbụla nʼeluigwe. 9Dragọn ukwu ahụ, bụ agwọ ochie ahụ a na-akpọ ekwensu maọbụ Setan, nke na-eduhie ndị niile bi nʼụwa. A tụdara ya nʼụwa, ya na ndị mmụọ ozi ya niile.
10Mgbe ahụ, anụrụ m oke olu si nʼeluigwe na-ada sị,
“O mezuola nʼikpeazụ, bụ nzọpụta Chineke na ike
na alaeze Chineke anyị, na ikike ịchị isi Kraịst ya,
ha abụrụla ihe dị ire.
Nʼihi na e sitela nʼeluigwe chụtuo
onye ahụ na-ebo ụmụnna anyị ebubo.
Ọ na-ebo ha ebubo ehihie na abalị nʼihu Chineke.
11Ha lụgburu ya nʼagha
site nʼọbara Nwa atụrụ ahụ
na site nʼama nke okwu ọnụ ha,
nʼihi na ha ahụghị ndụ ha nʼanya karịa,
kama ha jikere inye ndụ ha ọbụladị ruo nʼọnwụ.
12Ya mere, ṅụrịanụ ọṅụ eluigwe
ma unu ndị niile bi nʼime ya.
Ma ahụhụ dịrị unu ndị bi nʼụwa na osimiri
nʼihi na ekwensu abịakwutela unu.
O jirila oke ọnụma bịakwute unu.
Ọ makwaara na oge a o nwere ehighị nne.”
13Mgbe agwọ ochie ahụ chọpụtara na a chụdala ya nʼụwa, ọ chụsoro nwanyị ahụ mụrụ nwa nwoke ahụ ọsọ. 14Ma e nyere nwanyị ahụ nku abụọ, nke dịka nku oke ugo, ka o jiri gbanarị agwọ ochie ahụ feba nʼime ọzara, ebe a kwadooro ya, na ebe a ga-anọ lezie ya anya afọ atọ na ọnwa isii. 15Ma agwọ ahụ meghere ọnụ ya mee ka mmiri si nʼọnụ ya sọpụta dịka iyi nke ga-ebufu nwanyị ahụ. 16Ma ala nyeere nwanyị ahụ aka. O meghere ọnụ ya loda idee mmiri a nke si nʼọnụ agwọ ahụ sọpụta. 17Mgbe ahụ, agwọ ochie ahụ wesara nwanyị ahụ iwe, pụọ ịga buo agha megide ụmụ ya bụ ndị niile fọdụrụ, bụ ndị niile na-edebe iwu Chineke na ndị na-ekwupụta na ha bụ ndị ama nke Jisọs.
¿Sabías que…?
La mujer, el dragón y la guerra en el cielo
- En este capítulo, el enorme dragón rojo es nombrado de forma explícita como la serpiente antigua, llamada diablo y Satanás, el engañador del mundo entero. El Diccionario Bíblico de Easton (1897) explica que Satanás significa adversario o acusador, y que en el Nuevo Testamento el nombre se emplea como equivalente de diablo. Una voz en el cielo lo llama entonces el acusador de los hermanos, el que los acusa día y noche delante de Dios.Fuentes: el propio texto bíblico · Satan
- Miguel y sus ángeles luchan contra el dragón en este capítulo. El Diccionario Bíblico de Easton (1897) llama a Miguel uno de los principales ángeles y afirma que tenía un encargo especial sobre Israel como nación. La misma entrada lo relaciona con la serpiente antigua, llamada diablo y Satanás, que engaña al mundo entero, al citar Apocalipsis 12:7-9.Fuentes: el propio texto bíblico · Michael
- El Diccionario Bíblico de Easton (1897) incluye al dragón y a la serpiente antigua entre los títulos de Satanás, y cita Apocalipsis 12:9. El propio capítulo alterna esas imágenes: después de que el dragón es derribado, a la mujer se le dan dos alas de una gran águila para huir de la serpiente, y de la boca de la serpiente sale agua como un río para arrastrarla.Fuentes: Satan · el propio texto bíblico
Notas escritas con ayuda de IA a partir de fuentes abiertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, dominio público) y revisadas antes de publicarse.
Créditos y licencia de esta traducción
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fuente: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org