Apocalipsis 11
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toca un versículo para ver sus referencias cruzadas.
Ndị ama abụọ
1Enyere m ihe ọtụtụ osisi achara e ji atụ ihe. Agwara m sị m, “Gaa tụọ ụlọnsọ ukwu Chineke, ma tụọkwa ebe ịchụ aja dị nʼụlọnsọ ahụ, gụọ ọnụọgụgụ ndị niile na-akpọ isiala nʼebe ahụ. 2Ma atụkwala ogige nke dị na mpụta ụlọnsọ ahụ, nʼihi na ewerela ya nye ndị mba ọzọ. Ha ga-azọtọkwa obodo nsọ ahụ ụkwụ iri ọnwa anọ na abụọ. 3Aga m enye mmadụ abụọ ndị ga-agbara m ama ike ka ha buo amụma otu puku ụbọchị na narị ụbọchị abụọ na iri ụbọchị isii (1,260), ha ga-eyi akwa mkpe.” 4Ndị a bụ osisi oliv abụọ ahụ na ihe ịdọba oriọna abụọ ahụ, ndị na-eguzo nʼihu Onye nwe ụwa. 5Ọ bụrụ na onye ọbụla achọọ imerụ ha ahụ, ọkụ ga-esi ha nʼọnụ pụta rechapụ ndị iro ha. Ọ bụrụ na onye ọbụla achọọ imerụ ha ahụ, a ga-egbu ya nʼụzọ dị otu a. 6A ga-enyekwa ha ike imechi eluigwe ime ka mmiri ozuzo ọbụla ghara izo nʼụwa nʼime afọ atọ na ọkara ahụ ha ga-ebu amụma ha. A ga-enyekwa ha ike ime ka osimiri na mmiri nta niile ghọọ ọbara. Ha ga-enwekwa ike ime ka ụdị ọrịa dị iche iche bịakwasị ụwa niile nʼoge ọbụla ha chepụtara nʼobi ha.
7Mgbe ha gbazuru ama ha, anụ ọhịa ahụ, nke na-esite nʼime olulu Abis ahụ ga-ebuso ha agha merie ha, gbukwaa ha. 8Mgbe ha nwụchara, ozu ha ga-atọgbọrọ nʼokporoụzọ nke obodo ukwu ahụ nke a na-akpọ na mmụọ Sọdọm na Ijipt, ebe a kpọgburu Onyenwe ha nʼobe. 9A gaghị ekwenyekwa ka onye ọbụla lie ozu ha. Ma ndị niile dị iche iche nʼụwa, nʼebo niile, na asụsụ niile, na mba niile ga-agba ozu ha gburugburu ụbọchị atọ na ọkara nʼebe a tọgbọrọ ha na-ele ha anya. 10Ndị niile bi nʼụwa ga-aṅụrị ọṅụ, nyerịta ibe ha onyinye dị iche iche, kpọọ oriri dị iche iche iji ṅụrịa ọṅụ nʼihi ogbugbu e gburu ndị amụma abụọ ahụ, ndị wetaara ha oke nhụju anya.
11Ma mgbe ụbọchị atọ na ọkara gafesịrị, Chineke ga-eme ka Mmụọ ya na-enye ndụ banyekwa nʼime ha, ha bilitere ọtọ, oke egwu jidere ndị niile hụrụ ha. 12Ha nụrụ oke olu si nʼeluigwe daa na-asị, “rigotanụ nʼelu.” Ha siri nʼigwe ojii, rigoro nʼeluigwe ebe ndị iro ha ga-anọ na-ele ha anya.
13Ma nʼotu oge ahụ, nʼotu awa ahụ, ala ọma jijiji dịkarịsịrị oke egwu mara nke mere ka otu akụkụ nʼime akụkụ iri nke obodo ahụ niile daa. Ndị nwụrụ nʼoge ala ọma jijiji a dịkwa puku mmadụ asaa. Ma ndị niile fọdụrụ sitere nʼoke egwu nye Chineke nke eluigwe otuto.
14Ugbu a ahụhụ nke abụọ ahụ agafeela. Ma mgbe na-adịghị anya, ahụhụ nke atọ na-abịa.
Opi nke asaa
15Ka mmụọ ozi nke asaa fụrụ opi ike ya, oke olu dị iche iche dara ike ike nʼeluigwe, na-asị,
“Alaeze niile nke ụwa
abụrụla alaeze Onyenwe anyị, na nke Kraịst ya.
Ya onwe ya ga-achịkwa ruo mgbe niile ebighị ebi.”
16Mgbe ahụ, iri ndị okenye abụọ na anọ ahụ nọ nʼocheeze ndị ahụ dị nʼihu ocheeze Chineke dara nʼala kpọọ isiala nye Chineke, 17na-asị,
“Anyị na-enye gị otuto, gị Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile.
Onye na-adị, na onye dịkwaarị,
nʼihi na i werela oke ike gị niile nʼaka gị
malitekwa ịchị ọchịchị.
18Mba niile were oke iwe megide gị,
ma ugbu a bụ oge gị iweso ha iwe dị ọkụ.
Ugbu a bụ oge ikpe ndị nwụrụ anwụ ikpe
na ịkwụghachi ndị ohu gị bụ ndị amụma ụgwọ ọrụ ha,
na ndị nsọ na ndị gị niile, bụ ndị na-atụ egwu aha gị,
bụ ndị dị nta na ndị dị ukwuu.
Oge eruokwala mgbe ịla nʼiyi ndị na-emebi ụwa ga-adị.”
19Mgbe ahụ kwa, e meghere ụlọnsọ Chineke nke dị nʼeluigwe. A hụkwara igbe ọgbụgba ndụ nʼime ya. Nʼotu oge ahụ kwa, egbe eluigwe malitere ịgba, amụma gbukwara. Oke ifufe bidokwara ife. Oke ala ọma jijiji na akụmmiri igwe mere mkpọtụ nke ukwuu.

¿Sabías que…?
Los dos testigos y la gran ciudad
- Apocalipsis 11 dice que los cuerpos de los dos testigos yacerán en la calle de la gran ciudad, llamada en sentido figurado Sodoma y Egipto, donde también fue crucificado su Señor. Una entrada de diccionario explica Sodoma como ardiente, o la amurallada, una ciudad destruida por fuego del cielo a causa de la maldad de sus habitantes, una destrucción que las Escrituras recuerdan con frecuencia. Egipto, la tierra del Nilo y de las pirámides, se describe igualmente como un lugar de gran importancia en las Escrituras.Fuentes: el propio texto bíblico
- A los dos testigos se les da poder para profetizar durante mil doscientos sesenta días, vestidos de cilicio. Son los dos olivos y los dos candeleros que están delante del Señor de la tierra, y tienen poder para cerrar el cielo de modo que no llueva, para convertir las aguas en sangre y para herir la tierra con toda clase de plagas.Fuentes: el propio texto bíblico
- Cuando los dos testigos terminan su testimonio, la bestia que sube del Abismo los vence y los mata. Durante tres días y medio, pueblos, tribus, lenguas y naciones ven sus cuerpos y no permiten que sean puestos en un sepulcro, mientras los habitantes de la tierra se burlan de ellos, celebran y se envían regalos, porque los dos profetas los habían atormentado. Después de eso, el aliento de vida que viene de Dios entra en ellos; se ponen de pie y suben al cielo en una nube, mientras sus enemigos los observan.Fuentes: el propio texto bíblico
Notas escritas con ayuda de IA a partir de fuentes abiertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, dominio público) y revisadas antes de publicarse.
Lugares de este capítulo
Solo aparecen lugares identificados con alta confianza (90 % o más según las fuentes académicas reunidas por OpenBible). Mapa de la época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa actual: © colaboradores de OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Créditos y licencia de esta traducción
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fuente: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org