Nations Bible

Números 9

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toca un versículo para ver sus referencias cruzadas.

Mmemme Ngabiga

1Onyenwe anyị gwara Mosis okwu ndị a nʼọzara Saịnaị nʼọnwa mbụ nʼafọ nke abụọ site nʼoge ha hapụrụ ala Ijipt. Ọ sịrị ya, 2“Gwa ụmụ Izrel ka ha mee Mmemme Ngabiga nʼoge a kara aka. 3Ha mee ya nʼoge a kara aka, malite nʼuhuruchi abalị iri na anọ nke ọnwa a. Ha ga-eme ya nʼusoro dịka iwu na ụkpụrụ e ji eme ya si dị.”

4Ya mere, Mosis gwara ndị Izrel sị ha mee Mmemme Ngabiga. 5Ha mekwara ya nʼọzara Saịnaị malite nʼuhuruchi abalị iri na anọ nke ọnwa mbụ. Ndị Izrel mere ihe niile nʼusoro dịka iwu Onyenwe anyị nyere Mosis si dị.

6Ma ụfọdụ nʼime ụmụ Izrel esoghị mee Mmemme Ngabiga ahụ nʼihi na ha rụrụ arụ site nʼịnọ ozu nso. Nʼihi ya, ha bịakwutere Mosis na Erọn nʼụbọchị ahụ, 7sị Mosis, “Anyị ghọrọ ndị rụrụ arụ nʼihi ịnọ ozu mmadụ nso. Gịnị ga-egbochi anyị iso ndị Izrel ndị ọzọ iwetara Onyenwe anyị onyinye nʼoge a kara aka?”

8Mosis zara sị ha, “Cherenụ ka m ga jụta Onyenwe anyị ihe bụ uche ya banyere mkpa unu.”

9Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, 10“Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Ọ bụrụ na e nwee onye Izrel ọbụla nke merụrụ onwe ya nʼoge Mmemme Ngabiga site nʼịnọ ozu mmadụ nso, maọbụ site nʼịnọ nʼije, ha nwekwara ike iso mee Mmemme Ngabiga Onyenwe anyị. 11Kama ha ga-eme ya nʼuhuruchi abalị iri na anọ nke ọnwa abụọ. Ha ga-eri nwa atụrụ ha, achịcha na-ekoghị eko, na ahịhịa ilu. 12Ha agaghị erifọ ihe ọbụla nʼime ya ruo chi ọbụbọ ụbọchị so ya. Ha agaghị agbaji ọkpụkpụ ọbụla nke nwa atụrụ ahụ. Mgbe ha mere Mmemme Ngabiga, ha ga-esorokwa ụzọ niile e si eme mmemme ahụ mee nke ha. 13Ma ọbụla nọ nʼọnọdụ ịdị ọcha, onye nke na-anọghị nʼije nʼoge Mmemme Ngabiga ma kpachapụrụ anya hapụ isoro ndị ọzọ nʼoge mmemme a, a ga-ewezuga ya site nʼetiti ụmụ Izrel niile, nʼihi na ọ jụrụ iwetara Onyenwe anyị onyinye nʼoge a kara aka. Onye dị otu a ga-ebu ahụhụ mmehie ya nʼisi ya.

14“ ‘Onye ọbịa bi nʼetiti unu chọrọ iso na Mmemme Ngabiga Onyenwe anyị, ọ ga-eme ya nʼusoro dịka iwu na ụkpụrụ e nyere si dị. Unu ga-enwe otu iwu ahụ nye onye amụrụ nʼala na mbịarambịa.’ ”

Igwe ojii kpuchiri ụlọ nzute

15Nʼụbọchị ahụ e guzobere ụlọ nzute ahụ bụ ụlọ ikwu nke igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ, igwe ojii kpuchiri ya. Site nʼuhuruchi ruo nʼụtụtụ igwe ojii ahụ dị nʼelu ụlọ nzute ahụ dịka ọkụ nʼile anya. 16Otu a ka ọ dịgidere mgbe niile. Igwe ojii kpuchigidere ya, ma nʼabalị ọ na-acha dị ka ọkụ. 17Mgbe ọ bụla igwe ojii ahụ si nʼelu ụlọ nzute ahụ bilie, ụmụ Izrel na-ebuli njem, ma mgbe ọbụla igwe ojii ahụ na-anọgide, ha na-anọgidekwa. 18Mgbe Onyenwe anyị nyekwara iwu, ha na-akwụsị, maa ụlọ ikwu ha. Oge niile igwe ojii nọgidere nʼelu ụlọ nzute ahụ ka ụmụ Izrel na-anọgidekwa nʼụlọ ikwu ha. 19Ọ bụrụ na igwe ojii ahụ anọọtee anya, ụmụ Izrel nʼonwe ha na-erube isi nʼiwu Onyenwe anyị hapụ ịga nʼihu nʼije ha. 20Oge ụfọdụ, igwe ojii ahụ na-anọgide naanị abalị ole na ole. Dịka iwu Onyenwe anyị si dị, ha na-ama ụlọ ikwu ha, maọbụ bulie njem ha. 21Oge ụfọdụ, igwe ojii ahụ na-anọgide naanị site nʼuhuruchi ruo nʼụtụtụ. Mgbe o si nʼelu ụlọ nzute ahụ bilie nʼụtụtụ, ụmụ Izrel na-ebuli njem ha. Ọ bụrụ nʼehihie, maọbụ nʼabalị, mgbe ọbụla igwe ojii ahụ biliri, ụmụ Izrel na-ebuli njem ha. 22Ọ bụrụ na igwe ojii ahụ anọdụ nʼelu ụlọ nzute ahụ abalị abụọ, maọbụ otu ọnwa, maọbụ otu afọ, ụmụ Izrel na-anọgide nʼụlọ ikwu ha. Ma ngwangwa igwe ojii ahụ biliri, ha onwe ha na-ebulikwa njem ha. 23Site nʼiwu Onyenwe anyị na-enye, ha na-ama ụlọ ikwu ha, sitekwa nʼiwu Onyenwe anyị nyere ha, ha na-ebili njem. Ha mere ihe niile Onyenwe anyị kwuru nʼusoro dịka iwu o nyere ha site nʼọnụ Mosis si dị.

Ilustración artística: una interpretación, no un registro histórico.

¿Sabías que…?

La segunda Pascua y la nube guía

  • Números 9 registra la celebración de la Pascua en el desierto de Sinaí en el primer mes del segundo año tras la salida de Egipto. Según la tradición, los israelitas permanecieron acampados en la región de Sinaí durante cerca de un año mientras recibían las leyes y levantaban el Tabernáculo.Fuentes: el propio texto bíblico · Sinai
  • Se estableció una disposición especial para quienes no pudieran celebrar la Pascua en la fecha establecida debido a impureza ceremonial por contacto con un cadáver o por encontrarse de viaje. Estas personas tenían permitido celebrar una Pascua complementaria exactamente un mes después, el día catorce del segundo mes.Fuentes: el propio texto bíblico
  • El avance y el descanso de todo el campamento estaban dirigidos por la nube que cubría el Tabernáculo de día y tomaba aspecto de fuego de noche. Ya fuera que la nube permaneciera sobre la Tienda una sola noche, unos pocos días o muchos meses, los israelitas solo se ponían en marcha cuando esta se alzaba.Fuentes: el propio texto bíblico

Notas escritas con ayuda de IA a partir de fuentes abiertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, dominio público) y revisadas antes de publicarse.

Lugares de este capítulo

  • Egypt · 30.129, 31.308 · versículo 1
  • Wilderness of Sinai · Hoy: about 50 km around Jebel Musa · 28.540, 33.973 · versículos 1, 5

Solo aparecen lugares identificados con alta confianza (90 % o más según las fuentes académicas reunidas por OpenBible). Mapa de la época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa actual: © colaboradores de OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Créditos y licencia de esta traducción
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Fuente: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Habla con nosotros

Cuéntanos desde dónde lees, cómo te ha ayudado la Biblia o qué podemos mejorar. Leemos todos los mensajes.