Nations Bible

Números 8

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toca un versículo para ver sus referencias cruzadas.

Ịdọba oriọna

1Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, 2“Gwa Erọn okwu sị ya, ‘Mgbe ọbụla ị mụnyere oriọna asaa nke iheọkụ, ị ga-edozi ha ka ìhè ha na-enwupụta naanị nʼihu iheọkụ ahụ.’ ”

3Erọn mere otu a. O doziri oriọna ndị ahụ ka ha chee ihu nʼihe ịdọba oriọna, dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu. 4Otu a ka esi mee ihe ịdọba oriọna ahụ. Ọ bụ naanị ọlaedo ka e ji kpụọ iheọkụ ahụ, site nʼụkwụ ya ruo nʼokooko niile e ji chọọ ya mma. A kpụrụ iheọkụ ahụ nʼusoro dịka oyiyi Onyenwe anyị gosiri Mosis si dị.

Ido ndị Livayị nsọ

5Mgbe ahụ Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, 6“Ugbu a, site nʼetiti ụmụ Izrel, kpọpụta ụmụ Livayị, doo ha iche, mee ha ka ha dịrị ọcha. 7Ime ka ha dị ọcha, lee ihe ị ga-eme. Fesa ha mmiri na-asachapụ mmehie. Hụkwa na ha kpụchapụrụ ajị niile dị ha nʼahụ, ma sachaa uwe ha. Si otu a mee ka ha bụrụ ndị dị ọcha. 8Gwa ha ka ha weta nwa oke ehi na onyinye mkpụrụ ọka, bụ ụtụ ọka a gwara mmanụ. Ha ga-ewetakwa nwa oke ehi ọzọ; ka ọ bụrụ ihe ha ji achụ aja mmehie. 9Emesịa, kpọbata ụmụ Livayị nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ. Meekwa ka ọgbakọ ndị Izrel niile zukọọ nʼebe ahụ. 10Kpọpụta ndị Livayị nʼihu Onyenwe anyị, ma mee ka ndị Izrel niile bikwasị ha aka ha. 11Mgbe ahụ, Erọn ga-ewere ndị Livayị chee Onyenwe anyị nʼihu dịka onyinye mfufe ndị Izrel niile na-enye ya. Nʼụzọ dị otu a, ụmụ Livayị niile ga-abụ ndị jikere ijere Onyenwe anyị ozi.

12“Emesịa, ndị Livayị ga-abịa bikwasị aka ha nʼisi oke ehi abụọ ndị ahụ jiri otu nʼime oke ehi abụọ ndị ahụ chụọ aja mmehie nye Onyenwe anyị, jiri nke ọzọ chụọ aja nsure ọkụ, maka ikpuchi mmehie ndị Livayị. 13Mgbe ahụ, mee ka ndị Livayị guzo nʼihu Erọn na ụmụ ndị ikom, werekwa ha nyefee Onyenwe anyị nʼaka dịka a ga-asị na ha bụ onyinye mfufe a na-enye Onyenwe anyị. 14Otu a ka ị ga-esi doo ndị Livayị nsọ ime ka ha dịrị iche site nʼigwe ụmụ Izrel ndị ọzọ. Ọ bụ m nwe ndị Livayị.

15“Mgbe i dosiri ndị Livayị nsọ, cheekwa ha nʼihu Onyenwe anyị dịka aja mfufe, ha ga-abịa nʼime ụlọ nzute ahụ ije ozi dịrị ha. 16Ha bụ nke m site nʼetiti ụmụ Izrel niile. Anarala m ha ka ha bụrụ nke m nʼọnọdụ ụmụ niile e bụ ụzọ mụọ, nwa nwoke nke nwanyị ọbụla nʼIzrel. 17Nʼihi na nwa nwoke mbụ ọbụla a mụrụ nʼetiti ndị Izrel bụ nke m, ma mmadụ ma anụmanụ niile. Edoro m ha nsọ nye onwe m, site nʼabalị ụbọchị ahụ m tigbusiri ụmụ niile e bụ ụzọ mụọ nʼIjipt. 18Ewerela m ndị Livayị nʼọnọdụ ụmụ nwoke mbụ niile a mụrụ nʼIzrel. 19Site nʼetiti ndị Izrel niile, ewerela m ndị Livayị nye Erọn na ụmụ ya ndị ikom dịka onyinye, ka ha rụọ ọrụ niile dị nʼime ụlọ nzute ahụ nʼọnọdụ ụmụ Izrel. Ka ha kpuchiere ha mmehie ha niile ka ihe otiti nke nrịa nrịa ghara ịbịakwasị ụmụ Izrel, mgbe ọbụla ha bịara nso ebe nsọ ahụ.”

20Ya mere, Mosis na Erọn na nzukọ niile nke ụmụ Izrel chere ụmụ Livayị nʼihu Onyenwe anyị, nʼusoro dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu. 21Ndị Livayị niile doro onwe ha ọcha, sachakwaa uwe ha niile. Erọn chere ha nʼihu Onyenwe anyị dịka onyinye aja mfufe, chụọrọ ha aja ikpuchi mmehie, ime ka ha dị ọcha. 22Nʼikpeazụ, ndị Livayị bịara ije ozi ha nʼụlọ nzute nʼokpuru Erọn na ụmụ ya ndị ikom. Ha nyekwara ndị Livayị ọrụ dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.

23Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, 24“Iwu m ndị a metụtara ndị Livayị niile. Nwoke onye Livayị ọbụla ga-ebido ịrụ ọrụ nʼụlọ nzute m mgbe ọ gbara iri afọ abụọ na ise. 25Ọ ga-akwụsịkwa ịrụ ọrụ nʼime ya mgbe ọ gbara iri afọ ise, mgbe oge ezumike ọrụ ya ga-amalite. 26Ha nwere ike inyere ụmụnne ha aka nʼịrụ ọrụ ha nʼime ụlọ nzute, ma ha onwe ha agaghị arụ ọrụ ahụ. Otu a ka ị ga-esi dozie ọrụ ije ozi nke ndị Livayị.”

¿Sabías que…?

El Candelabro de Oro y la Dedicación de los Levitas

  • El candelabro del santuario fue elaborado de oro labrado a martillo desde su base hasta sus flores, siguiendo el diseño revelado a Moisés. Se ordenó a Aarón que orientara las siete lámparas para que alumbraran hacia la parte delantera del candelabro.Fuentes: el propio texto bíblico
  • Los levitas fueron apartados para servir en la Tienda de Reunión en lugar de todos los primogénitos israelitas, consagrados desde que Dios hirió a los primogénitos en Egipto. Su dedicación requería purificación con agua, afeitarse todo el cuerpo, lavar sus ropas y ser presentados como ofrenda mecidade ante el Señor.Fuentes: el propio texto bíblico · Egypt
  • El servicio de los levitas tenía un rango de edad establecido: ingresaban a realizar las labores a los veinticinco años y se retiraban del trabajo regular a los cincuenta. Pasada esa edad, únicamente podían asistir a sus hermanos en responsabilidades menores dentro de la Tienda de Reunión.Fuentes: el propio texto bíblico

Notas escritas con ayuda de IA a partir de fuentes abiertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, dominio público) y revisadas antes de publicarse.

Lugares de este capítulo

  • Egypt · 30.129, 31.308 · versículo 17

Solo aparecen lugares identificados con alta confianza (90 % o más según las fuentes académicas reunidas por OpenBible). Mapa de la época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa actual: © colaboradores de OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Créditos y licencia de esta traducción
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Fuente: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Habla con nosotros

Cuéntanos desde dónde lees, cómo te ha ayudado la Biblia o qué podemos mejorar. Leemos todos los mensajes.