Nations Bible

Juan 12

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toca un versículo para ver sus referencias cruzadas.

Meri etee Jisọs Mmanụ

1Ụbọchị isii tupu e mee Mmemme Ngabiga, Jisọs gara Betani bụ obodo Lazarọs, onye ahụ ọ mere ka o site nʼọnwụ bilie. 2Nʼebe ahụ, ha siiri Jisọs nri, ọ bụkwa Mata na-eje ozi isi nri ahụ, Lazarọs bụ otu onye nʼime ndị sooro ya nọdụ na nri ahụ. 3Mgbe ahụ, Meri weere mmanụ otite dị ọkara lita nke ezigbo naad, mmanụ isi ụtọ dị oke ọnụahịa, ọ wụkwasara ya Jisọs nʼụkwụ, jirikwa agịrị isi ya hichaa ụkwụ ya. Nke a mere ka ụlọ ahụ jupụta nʼisi ụtọ nke mmanụ otite ahụ.

4Ma Judas Iskarịọt, otu nʼime ndị na-eso ụzọ ya, onye ahụ ga-arara ya nye, kwuru, 5“Gịnị mere na-ereghị mmanụ otite a narị denarị atọ, were ego ya nye ndị ogbenye?” 6O kwughị nke a nʼihi na ihe banyere ndị ogbenye na-emetụ ya nʼobi kama nʼihi na ọ bụ onye ohi; dị ka onye na-ejide akpa ego ha, mgbe ụfọdụ, ọ na-amanye aka nʼego ahụ zubiri ego.

7Jisọs sịrị, “Hapụ ya aka, ọ zụtara ya ka ọ na-akwado maka ụbọchị olili m. 8Unu nwere ndị ogbenye nʼetiti unu mgbe niile, ma mụ na unu agaghị anọ mgbe niile.”

9Ma mgbe igwe ndị Juu nụrụ na ọ nọ nʼebe ahụ, ha bịara, ọ bụghị naanị ka ha hụ ya, kama ka ha hụkwa Lazarọs onye o mere ka o si na ndị nwuru anwụ bilie. 10Ya mere, ndịisi nchụaja gbakwara izu igbukwa Lazarọs. 11Nʼihi na ọ bụ nʼihi ya ka ọtụtụ ndị Juu ji na-ahapụ ha ma na-ekwerekwa na Jisọs.

Jisọs abịa na Jerusalem dị ka Eze

12Nʼechi ya oke igwe mmadụ ahụ ndị bịara mmemme nụrụ na Jisọs na-abịa Jerusalem. 13Ha weere igu nkwụ pụọ izute ya na-eti mkpu,

“Hozanna!”

“Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ nke na-abịa nʼaha Onyenwe anyị!”

“Ngọzị dịrị eze Izrel!”

14Jisọs hụrụ nwa ịnyịnya ibu, nọkwasị nʼelu ya, dị ka e dere ya,

15“Atụla egwu, gị ada Zayọn!

Lee, eze gị ka ọ na-abịa.

Ọ nọkwasịrị nʼelu nwa ịnyịnya ibu.”

16Na mbụ ndị na-eso ụzọ ya aghọtaghị ihe ndị a niile. Ma mgbe e nyesịrị Jisọs otuto, ka ha chetara na-edererị ihe ndị a banyere ya, na e mekwara ya rịị ihe ndị a.

17Igwe mmadụ ahụ bụ ndị ya na ha nọ mgbe o si nʼili kpọpụta Lazarọs, mee ka o sị nʼọnwụ bilie, gara nʼihu na-agba ama ya. 18Ọtụtụ mmadụ pụrụ izute ya nʼihi na ha nụrụ akụkọ ọrụ ihe ịrịbama niile ọ rụrụ. 19Ya mere, ndị Farisii sịrịtara onwe ha, “Unu ahụla na o nweghị ihe unu pụrụ ime, leenụ ka ụwa niile na-eso ya.”

Jisọs gbara ama ọnwụ ya

20Ma ụfọdụ ndị Griik so nʼime ndị ahụ bịara ife ofufe nʼoge mmemme ahụ. 21Ha bịakwutere Filip onye si Betsaida dị na Galili, gwa ya sị, “Nna anyị ukwu, anyị chọrọ ịhụ Jisọs.” 22Filip pụrụ gaa gwa Andru, ya na Andru sooro gaa gwa Jisọs.

23Jisọs zara sị, “Oge awa ahụ eruola mgbe a ga-enye Nwa nke Mmadụ otuto. 24Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, ọ bụrụ na mkpụrụ ọka wiiti adaghị nʼala nwụọ, ọ ga-anọ naanị ya. Ma ọ bụrụ na ọ nwụọ, ọ ga-amị ọtụtụ mkpụrụ. 25Ndị ọbụla hụrụ ndụ ha nʼanya ga-atụfu ya, ebe ndị ọbụla kpọrọ ndụ ha asị nʼụwa a, ga-edebe ya ruo mgbe ebighị ebi. 26Onye ọbụla na-ejere m ozi aghaghị iso m; ebe m nọ ka onye na-ejere m ozi ga-anọkwa. Onye ọbụla na-ejere m ozi ka Nna m ga-asọpụrụ.

27“Ugbu a, mkpụrụobi m jupụtara nʼihe mgbu. Gịnịkwa ka m ga-ekwu, Nna, zọpụta m nʼawa nke a? Mba! Ọ bụ nʼihi nke a ka m ji bịa nʼoge awa a. 28Nna, nye aha gị otuto.”

Mgbe ahụ, otu olu siri nʼeluigwe bịa, “Enyela m ya otuto, m ga-enyekwa ya otuto ọzọ.” 29Igwe ndị mmadụ guzo nʼebe ahụ, ndị nụrụ ya na-ekwu, “Ọ bụ egbe eluigwe gbara.” Ndị ọzọ na-asị, “Ọ bụ mmụọ ozi na-agwa ya okwu.”

30Jisọs zara ma sị, “Olu a abịaghị nʼihi m kama ọ bịara nʼihi unu. 31Ugbu a bụ oge a ga-ekpe ụwa a ikpe. Ugbu a ka a ga-achụpụ onye ahụ na-achị ụwa a. 32Ma mụ onwe m, mgbe e si nʼụwa welie m elu, aga m adọta mmadụ niile nye onwe m.” 33O kwuru nke a iji gosi ụdị ọnwụ nke ọ gaje ịnwụ.

34Igwe mmadụ ahụ zara ya, “Anyị anụla site nʼakwụkwọ iwu na Kraịst ahụ ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Ma gịnị mere i ji asị na, ‘A ghaghị iweli Nwa nke Mmadụ elu’? Onye bụ ‘Nwa nke mmadụ a’?”

35Jisọs sịrị ha, “Ìhè ga-enwuru unu naanị nwa oge nta. Jegharịanụ nʼìhè a, ugbu a unu nwere ya, tupu ọchịchịrị abịakwasị unu. Onye na-ejegharị nʼọchịchịrị amaghị ebe ọ na-aga. 36Kwerenụ nʼìhè ahụ ugbu a unu nwere ya ka unu ghọọ ụmụ nke ìhè.” Mgbe Jisọs kwusiri nke a ọ hapụrụ ha pụọ ga zoo onwe ya.

Ndị Juu gara nʼihu na-ekweghị ekwe ha

37Nʼagbanyeghị ọrụ ịrịbama niile ọ rụrụ nʼetiti ha, ha ekwereghị na ya. 38Nke a bụ imezu ihe Aịzaya onye amụma kwuru,

“Onyenwe anyị, onye kweere ozi anyị

ọ bụkwa nʼahụ onye ka e kpugheere ogwe aka Onyenwe anyị?”

39Ma ha enweghị ike kwere, nʼihi na Aịzaya kwukwara nʼebe ọzọ, sị,

40“O meela ka ha kpuo ìsì,

mekwa ka obi ha kpọchie

Ka ha ghara iji anya ha hụ ụzọ

maọbụ jiri obi ha ghọta ihe ọbụla

Ka ha gharakwa ichigharị, ka m gwọọ ha.”

41Aịzaya kwuru ihe ndị a nʼihi na ọ hụrụ ebube ya, ma kwuo banyere ya.

42Otu ọ dị, ọtụtụ nʼime ndịisi kweere na ya, ma ha ekwupụtaghị nke a. Nʼihi na ha tụrụ egwu na ndị Farisii ga-achụpụ ha site nʼụlọ ekpere. 43Nʼihi na ha hụrụ otuto mmadụ nʼanya karịa otuto Chineke.

44Jisọs tiri mkpu sị, “Onye ọbụla kwere na m, ọ bụghị na m ka o kwere, kama ọ bụ na onye nke zitere m. 45Nʼihi na onye ọbụla hụrụ m ahụla onye nke zitere m. 46Abịara m nʼime ụwa dị ka ìhè ka onye ọbụla nke kwere na m ghara ịnọ nʼọchịchịrị.

47“Ma ọ bụrụ na onye ọbụla anụ okwu m ma ju ime ya, ọ bụghị m na-ekpe ya ikpe. Nʼihi na abịara m ịzọpụta ụwa, ọ bụghị ikpe ụwa ikpe. 48Onye ọbụla jụrụ m ma jụkwa okwu m, nwere onye ga-ekpe ya ikpe. Okwu niile m kwuru ga-ama ya ikpe nʼụbọchị ikpeazụ. 49Okwu ndị a esiteghị nʼaka m. Ha sitere nʼaka Nna ahụ onye zitere m ma nyekwa m iwu ihe m ga-ekwu na otu m ga esi kwuo ya. 50Ama m na iwu ya bụ ndụ ebighị ebi, nʼihi ya, ihe ọbụla Nna gwara m ka m na-ekwu.”

Ilustración artística: una interpretación, no un registro histórico.

¿Sabías que…?

La unción en Betania y la entrada en Jerusalén

  • Betania, adonde Jesús llegó seis días antes de la Pascua, estaba a unas dos millas al este de Jerusalén, en la ladera sureste del monte de los Olivos, junto al camino a Jericó, y tomó su nombre de las palmeras que crecían allí. Era el hogar de Lázaro, a quien Jesús había resucitado de entre los muertos después de cuatro días en el sepulcro, y de sus hermanas Marta y María; los principales sacerdotes planearon matar también a Lázaro, porque por causa de él mucha gente estaba creyendo en Jesús.Fuentes: el propio texto bíblico · Bethany · Lazarus
  • En una cena en la que Marta servía y Lázaro estaba reclinado a la mesa, María ungió los pies de Jesús con alrededor de una pinta de perfume costoso hecho de nardo puro y los secó con sus cabellos, de modo que la casa se llenó de la fragancia. Judas Iscariote, hijo de Simón, cuyo sobrenombre significa un hombre de Kerioth, preguntó por qué el perfume no se vendió por trescientos denarios para los pobres; era un ladrón que, como encargado de la bolsa, solía sacar de lo que se ponía en ella, y iba a traicionar a Jesús.Fuentes: el propio texto bíblico · Judas Iscariot · Simon
  • Al día siguiente, la gran multitud que había venido para la fiesta tomó ramas de palma y salió al encuentro de Jesús, que venía a Jerusalén sentado en un burrito, gritando alabanza al Rey de Israel, como está escrito acerca de la Hija de Sion. Sion era la colina sureste de Jerusalén, donde David construyó una ciudadela y un palacio después de tomarla, de modo que llegó a ser la ciudad de David. Al principio sus discípulos no entendieron estas cosas, pero después de que Jesús fue glorificado recordaron que también habían sido escritas acerca de él.Fuentes: el propio texto bíblico · Zion

Notas escritas con ayuda de IA a partir de fuentes abiertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, dominio público) y revisadas antes de publicarse.

Lugares de este capítulo

  • Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículos 11, 12, 20
  • Zion · Hoy: Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículo 15
  • Galilee · 32.760, 35.527 · versículo 21

Solo aparecen lugares identificados con alta confianza (90 % o más según las fuentes académicas reunidas por OpenBible). Mapa de la época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa actual: © colaboradores de OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Créditos y licencia de esta traducción
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Fuente: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Habla con nosotros

Cuéntanos desde dónde lees, cómo te ha ayudado la Biblia o qué podemos mejorar. Leemos todos los mensajes.