Hechos 11
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toca un versículo para ver sus referencias cruzadas.
Pita akọwaa ọrụ ya nʼihu ndị okenye
1Ndị ozi na ụmụnna ndị bi na Judịa niile nụrụ na ndị mba ọzọ anabatala okwu Chineke. 2Mgbe Pita ruru Jerusalem, ndị kwere ekwe e biri ugwu tara ya ụta, 3na-asị, “Gịnị mere ị ji gakwuru ndị a na-ebighị ugwu soro ha rie ihe?”
4Pita kọwaara ha ihe niile mere na otu o si mee, na-asị. 5“Otu ụbọchị, mgbe m nọ nʼobodo Jopa, ahụrụ m ọhụ nʼoge m na-ekpe ekpere. Nʼime ọhụ a, ahụrụ m ihe yiri akwa ọcha dị obosara nke e sitere nʼakụkụ anọ ya na-ewedata site nʼeluigwe. E budatara ya nʼihu m. 6Nʼime ya, ahụrụ m anụmanụ ndị nwere ụkwụ anọ, na anụ ọhịa, na anụ ndị na-akpụ akpụ nʼala na ụmụ nnụnụ nke eluigwe. 7Mgbe ahụ, anụrụ m olu gwara m sị, ‘Pita, bilie, gbuo ma riekwa.’
8“Ma asịrị m, ‘Mba, Onyenwe m, ọ dịbeghị mgbe ihe na-adịghị ọcha maọbụ ihe rụrụ arụ bara m nʼọnụ.’
9“Olu ahụ siri nʼeluigwe zaghachi nke ugboro abụọ, ‘Akpọla ihe ọbụla ihe rụrụ arụ bụ nke Chineke mere ka ọ dị ọcha.’ 10Nke a mere ugboro atọ, ma emesịa dọlie ha niile laa nʼeluigwe.
11“Nʼotu oge ahụ, ndị ikom atọ ndị e zipụrụ site Sizaria ịkpọ m bịarutere kwụsị nʼọnụ ụzọ nʼụlọ ebe m nọ. 12Mmụọ Nsọ gwara m ka m ghara inwe obi abụọ isoro ha na-akpaghị oke ọbụla. Mmadụ isii ndị a nʼetiti ụmụnna anyị sokwa m, bịarute nʼụlọ nwoke ahụ. 13Ọ gwara anyị otu o si hụ mmụọ ozi nʼụlọ ya, onye sịrị, ‘Ziga ndị ozi jee Jopa ka ha kpọta Saimọn onye a na-akpọ Pita. 14Ọ ga-ewetara gị ozi nke a ga-esite na ya zọpụta gị nʼezinaụlọ gị niile.’
15“Mgbe m ka kpụ okwu ahụ nʼọnụ, Mmụọ Nsọ bịakwasịrị ha dịka o siri bịakwasị anyị na mbụ. 16Mgbe ahụ, echetara m okwu ahụ Onyenwe anyị kwuru sị, ‘Jọn ji mmiri mee unu baptizim, ma a ga-eji Mmụọ Nsọ mee unu baptizim.’ 17Ya mere, ọ bụrụ na Chineke nyere ha otu onyinye ahụ o nyere anyị mgbe anyị kweere nʼOnyenwe anyị Jisọs Kraịst, onye ka m bụ iguzogide Chineke?”
18Mgbe ha nụrụ nke a, ha agaghị nʼihu nʼịrụ ụka kama ha toro Chineke, na-asị, “Nʼezie, Chineke enyela ohere ka ọ bụladị ndị mba ọzọ chegharịa baa na ndụ.”
Ụlọ nzukọ dị na Antiọk
19Ugbu a, ndị ahụ niile gbasasịrị nʼihi mkpagbu ahụ bidoro mgbe a tụgburu Stivin na nkume, jeruru akụkụ Fonisia na Saiprọs na Antiọk na-ekwusa oziọma ahụ naanị nʼetiti ndị Juu. 20Ma otu ọ dị, ụfọdụ nʼime ndị ikom ndị ahụ sitere nʼakụkụ Saiprọs na Sirini gara Antiọk, malite ikwusara ndị Griik oziọma banyere Onyenwe anyị Jisọs. 21Onyenwe anyị gọziri mgbalị ha niile. Nʼihi na ọtụtụ mmadụ chegharịrị kwere nʼOnyenwe anyị.
22Mgbe nzukọ dị na Jerusalem nụrụ ihe ndị a, ha zipụrụ Banabas ka ọ gaa Antiọk. 23Mgbe o rutere, hụ ihe amara Chineke rụrụ nʼetiti ha. Ọ ṅụrịrị ọṅụ, mgbakwaa ha niile ume, gwa ha ka ha were obi ha niile nọgide nʼime Onyenwe anyị. 24Ọ bụ ezigbo mmadụ, onye jupụtara na Mmụọ Nsọ na okwukwe. O nwekwara okwukwe dị ebube, nʼihi ya ọtụtụ mmadụ chegharịkwara bịakwute Onyenwe anyị.
25Emesịa, ọ gara Antiọk obodo Tasọs ịchọ Sọl. 26Mgbe ọ chọpụtara ya, o duuru ya bịa nʼAntiọk. Ihe ha ka otu afọ, ka ha na-ezukọ nʼụlọ chọọchị na-akụziri ọtụtụ igwe mmadụ ihe. Ọ bụ nʼime Antiọk ka e buru ụzọ kpọọ ndị na-eso ụzọ ya ndị Kraịst.
27Nʼoge ahụ, ndị amụma sitere na Jerusalem bịaruru Antiọk. 28Otu onye nʼime ha a na-akpọ Agabọs biliri ọtọ buo amụma site nʼike Mmụọ Nsọ banyere oke ụnwụ ga-abịakwasị ụwa niile. Amụma a mezukwara nʼoge Klọdiọs na-achị. 29Ndị na-eso ụzọ ya kwekọrịtara ịtụkọta na iziga onyinye dị iche iche nye ndị kwere ekwe nọ na Judịa. Onye ọbụla nyekwara ihe dịka o nwere ike. 30Ha mere nke a, ha zigara ndị okenye ihe ha tụkọtara, site nʼaka Banabas na Sọl.

¿Sabías que…?
Gentiles acogidos y el nombre cristiano
- Cuando Pedro subió a Jerusalén, los creyentes circuncidados lo reprocharon por haber visitado a hombres incircuncisos y haber comido con ellos. Contó que, mientras oraba en Jope, el principal puerto de Judea, a treinta millas al noroeste de Jerusalén, tuvo una visión, y que el Espíritu Santo cayó después sobre una familia en Cesarea, capital romana de Judea y su gran ciudad gentil. Una cronología de estos hechos sitúa esa defensa en el año 38 d.C.Fuentes: el propio texto bíblico · Joppa · Caesarea · Peter defends Gentile salvation
- Los dispersados por la persecución que comenzó con Esteban, el primer mártir cristiano, llegaron hasta Fenicia, Chipre y Antioquía, y al principio hablaban solo a los judíos. Antioquía, a orillas del Orontes, a unas dieciséis millas del Mediterráneo y unas trescientas millas al norte de Jerusalén, era la metrópoli de Siria y ocupaba el tercer lugar en importancia entre las ciudades del imperio romano, después de Roma y Alejandría; se la llamaba la primera ciudad de Oriente. Allí los discípulos fueron llamados cristianos por primera vez, lo que una cronología sitúa en el año 40 d.C.Fuentes: el propio texto bíblico · Stephen · Antioch (Syria) · Disciples first called Christians
- La iglesia de Jerusalén envió a Bernabé, un levita de Chipre a quien el relato llama hombre bueno, lleno del Espíritu Santo y de fe; encontró a Saulo en Tarso y lo llevó a Antioquía, donde enseñaron a la iglesia durante un año entero. El profeta Agabo predijo entonces por el Espíritu que una gran hambre se extendería por todo el mundo, lo cual, según la narración, ocurrió bajo Claudio. El Easton's Bible Dictionary (1897) identifica a Claudio como el cuarto emperador romano, que sucedió a Calígula en el año 41 d.C. y murió en el 54 d.C., y los discípulos enviaron socorro a los hermanos de Judea por medio de Bernabé y Saulo.Fuentes: el propio texto bíblico · Barnabas · Agabus · Claudius (4th Roman Emperor)
Notas escritas con ayuda de IA a partir de fuentes abiertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, dominio público) y revisadas antes de publicarse.
Lugares de este capítulo
- Judea · Hoy: Judea 1 · 31.777, 35.234 · versículos 1, 29
- Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículos 2, 22, 27, 30
- Joppa · Hoy: Jaffa · 32.054, 34.753 · versículos 5, 13
- Caesarea · Hoy: Caesarea Maritima · 32.500, 34.892 · versículo 11
- Antioch · Hoy: Antioch on the Orontes · 36.227, 36.172 · versículos 19, 20, 22, 26, 27, 29
- Cyprus · 35.000, 33.000 · versículos 19, 20
- Phoenicia · 33.271, 35.196 · versículo 19
- Cyrene · 32.821, 21.851 · versículo 20
- Tarsus · 36.913, 34.892 · versículo 25
Solo aparecen lugares identificados con alta confianza (90 % o más según las fuentes académicas reunidas por OpenBible). Mapa de la época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa actual: © colaboradores de OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Créditos y licencia de esta traducción
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fuente: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org