Hechos 10
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toca un versículo para ver sus referencias cruzadas.
Kọnelịọs ezie Pita ozi
1Nʼoge ahụ, o nwere otu nwoke bi na Sizaria, aha ya bụ Kọnelịọs. O bụ ọchịagha na-elekọta narị ndị agha si na mpaghara Itali. 2Nwoke a na ezinaụlọ ya bụ ndị na-asọpụrụ ma na-atụkwa egwu Chineke. Ọ na-enyere ndị ogbenye aka na-ekpekwara Chineke mgbe niile. 3Otu ụbọchị, nʼihe dịka elekere atọ nke ehihie, ọ hụrụ ọhụ ebe otu mmụọ ozi nke Chineke bịakwutere ya sị ya, “Kọnelịọs!”
4Kọnelịọs lekwasịrị ya anya nʼegwu jụọ ya sị, “Onyenwe m, ọ bụ gịnị?”
Ọ sịrị ya, “Ekpere gị na onyinye gị nye ndị ogbenye e rutela dịka ihe ncheta nʼihu Chineke. 5Ugbu a, zie ndị ikom ka ha gaa nʼobodo Jopa kpọta otu onye aha ya bụ Saimọn, onye a na-akpọkwa Pita. 6Ọ bụ ọbịa nʼụlọ otu nwoke a na-akpọ Saimọn, onye na-edozi akpụkpọ anụ. Onye ụlọ ya dị nʼakụkụ osimiri.”
7Mgbe mmụọ ozi ahụ gwara ya okwu pụrụ, ọ kpọrọ ndị ohu ya abụọ na otu nʼime ndị agha na-eche ya nche nke na-atụkwa egwu Chineke. 8Mgbe ọ kọchara ha ihe niile, o zigara ha Jopa.
Ọhụ Pita hụrụ
9Nʼechi ya, mgbe ha nọ nso nʼebe ahụ, nʼihe dịka elekere iri na abụọ nke ehihie, Pita rigooro nʼelu ụlọ ahụ ikpe ekpere. 10Agụụ bidoro ịgụ ya, ọ chọọ ihe ọ ga-eri. Ma mgbe a na-akwado nri, ọ hụrụ ọhụ. 11Ọ hụrụ ka eluigwe meghere, hụkwa ihe dịka akwa ọcha dị obosara nke e sitere nʼakụkụ anọ ya na-ewedata nʼala. 12Ihe dị nʼime ya: bụ ụmụ anụmanụ dị iche iche, ndị nwere ụkwụ anọ, ma anụ ndị na-akpụ akpụ nʼala na ụmụ nnụnụ nke igwe. 13Mgbe ahụ, ọ nụrụ olu na-asị, “Pita bilie, gbuo ma riekwa.”
14Ma Pita sịrị, “Mba, Onyenwe m. Ọ dịbeghị mgbe m riri ihe ọbụla rụrụ arụ maọbụ nke na-adịghị ọcha.”
15Olu ahụ gwara ya nke ugboro abụọ, “Akpọla ihe ọbụla ihe rụrụ arụ bụ nke Chineke mere ka ọ dị ọcha.”
16Ihe a mere ugboro atọ, ngwangwa, e weghachikwara ya nʼeluigwe.
17Mgbe Pita nọ na-atule ihe ọhụ ahụ pụtara bụ nke gbakwara ya gharịị, lee, ndị ikom ahụ Kọnelịọs zipụrụ abịarutela kwụsị nʼọnụ ụzọ, na-ajụ ebe ụlọ Saimọn dị. 18Ha kpọrọ oku ịjụ ma Saimọn onye a na-akpọ Pita ọ nọ nʼụlọ ahụ.
19Ka Pita nọrịị na-atụgharị uche nʼihe ọhụ ahụ pụtara, Mmụọ Nsọ gwara ya, “Lee, mmadụ atọ guzo nʼọnụ ụzọ ugbu a. Ha chọkwara ịhụ gị. 20Bilie, rịda jekwuru ha ngwangwa, enwela obi abụọ ị soro ha gawa, nʼihi na ọ bụ m zitere ha.”
21Pita jekwuru ndị ikom ahụ, sị, “Ọ bụ m bụ onye unu na-achọ, gịnị ka unu na-achọrọ m?”
22Ha sịrị, “Ọ bụ Kọnelịọs onyeisi agha na-elekọta narị ndị agha zitere anyị. Ọ bụ onye ezi omume nke na-atụ egwu Chineke, bụrụkwa onye ndị Juu niile na-asọpụrụ. Mmụọ ozi dị nsọ gwara ya ka ọ kpọta gị nʼụlọ ya, ịnụ ihe i nwere ikwu.” 23Ya mere, ọ kpọbatara ha nʼụlọ dịka ndị ọbịa.
Pita agaa nʼụlọ Kọnelịọs
Echi ya, o biliri soro ha gawa, ụfọdụ ndị kwere ekwe na Jopa sokwara ya gaa. 24Nʼụbọchị na-esota ya, ha bịaruru Sizaria. Kọnelịọs nọrịị na-eche ha, ya na ndị ezinaụlọ ya, na ndị ikwu na ibe ya, na ndị enyi ya ọ kpọrọ. 25Mgbe Pita batara, Kọnelịọs zutere ya, daa nʼala nʼụkwụ ya, kpọọrọ ya isi nʼala. 26Ma Pita selitara ya elu sị, “Bilie ọtọ, mụ onwe m bụkwa mmadụ.”
27Mgbe ha na-ekwurịta okwu, ọ banyere nʼime ụlọ ma hụ igwe mmadụ ka ha zukọtara. 28Ọ sịrị ha, “Unu maara nke ọma na ọ bụ ihe megidere iwu na onye Juu na onye mba ọzọ ga-enwe mmekọrịta maọbụ gaa leta onye mba ọzọ. Ma Chineke ezila m na m ekwesighị ịkpọ mmadụ ọbụla onye rụrụ arụ maọbụ onye na-adịghị ọcha. 29Nʼihi nke a, ọ bụ ya mere m jiri bịa mgbe akpọrọ m na-ajụghị ajụjụ. Ma ka m jụọ ugbu a ihe mere unu ji kpọọ m?”
30Kọnelịọs sịrị, “Nʼụbọchị anọ gara aga, mgbe m nọ na-ekpe ekpere nʼoge ehihie nʼụlọ m, nʼihe dịka elekere atọ, na mberede, ahụrụ m nwoke yi uwe na-enwu ọcha ka o guzoro nʼihu m. 31Ọ sịrị, Kọnelịọs, ‘Chineke anụla ekpere gị ma chetakwa onyinye ị na-enye ndị ogbenye. 32Ziga nʼobodo Jopa nʼụlọ otu nwoke a na-akpọ Saimọn, onye na-edozi akpụkpọ anụ. O bi nʼakụkụ osimiri.’ Nʼebe ahụ ha ga-ahụkwa otu onye ọbịa aha ya bụ Saimọn a na-akpọ Pita. 33Ọ bụ nʼihi nke a ka m ji mee ngwangwa zie ka a kpọọ gị. Ọ dị mma na ị bịara. Ugbu a, anyị niile ezukọtala nʼebe a nʼihu Chineke ịnụrụ ihe niile Onyenwe anyị chọrọ ka ị gwa anyị.”
Okwu Pita kwuru
34Mgbe ahụ Pita meghere ọnụ ya sị, “Ugbu a, aghọtala m nʼezie na Chineke abụghị onye na-ele mmadụ anya nʼihu. 35Kama nʼime mba ọbụla, onye ọbụla na-atụ egwu ya na onye na-arụ ọrụ ezi omume ka ọ na-anabata. 36Unu maara ihe banyere oziọma ahụ o zigaara ndị Izrel niile, nke na-akọ akụkọ oziọma nke udo site na Jisọs Kraịst onye bụ Onyenwe anyị nʼihe niile. 37Okwu ahụ gbasara nʼala Judịa niile, malite na Galili mgbe Jọn kwusachara baptizim nke ya. 38Otu Chineke si were Mmụọ Nsọ na ike wụkwasị Jisọs onye Nazaret dịka mmanụ, na otu o si jegharịa na-eme mma na-agwọkwa ndị niile ekwensu na-emekpa ahụ, nʼihi na Chineke nọnyeere ya.
39“Anyị bụ ndị akaebe ihe niile o mere nʼala ndị Juu na nʼime Jerusalem. Ha gburu ya site nʼịkpọgide ya nʼelu obe. 40Ma Chineke mere ka o si nʼọnwụ bilite mgbe ụbọchị atọ gasịrị. E mekwara ka ndị mmadụ hụ ya anya. 41Ọ bụghị mmadụ niile kama ọ bụ naanị anyị ndị Chineke họpụtara, dịka ndị akaebe, ndị soro ya rie ma ṅụọkwa mgbe o si nʼọnwụ bilie. 42O nyere anyị iwu ka anyị gaa zisaa oziọma nʼebe niile, ịkọwa na ọ bụ ya ka Chineke họpụtara ịbụ onye ikpe nke ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ. 43Ndị amụma niile gbara ama ihe banyere ya na onye ọbụla nke kweere na ya ga-enweta mgbaghara mmehie site nʼaha ya.”
Ndị mba ọzọ anata Mmụọ Nsọ
44Mgbe Pita nọ na-ekwu okwu, Mmụọ Nsọ bịakwasịrị ndị niile nụrụ okwu a. 45Nke a juru ndị e biri ugwu nʼetiti ndị kwere ekwe soro Pita bịa anya otu e siri mee ka ndị mba ọzọ nata onyinye Mmụọ Nsọ ahụ. 46Nʼihi na ha nụrụ ka ha na-ekwu okwu nʼasụsụ dị iche iche na-etokwa Chineke.
Mgbe ahụ Pita jụrụ, 47“Ọ dị onye pụrụ igbochi anyị ime ndị a baptizim. Ndị natara Mmụọ Nsọ dị ka anyị onwe anyị?” 48Nʼihi nke a, o nyere iwu ka e mee ha baptizim nʼaha Jisọs Kraịst. Ha rịọrọ ya ka ọ nọnyere ha ụbọchị ole na ole.

¿Sabías que…?
Pedro y los gentiles en Cesarea
- Cesarea, donde vivía Cornelio, estaba en la costa del Mediterráneo, en el camino de Tiro a Egipto, a unas setenta millas al noroeste de Jerusalén. El Easton's Bible Dictionary (1897) dice que Herodes el Grande la construyó en el 10 a. C., en el sitio de la Torre de Estratón, y le puso el nombre de César Augusto. La misma obra la llama capital de la provincia romana de Judea, sede de los gobernadores y la gran ciudad gentil de Palestina.Fuentes: Caesarea · el propio texto bíblico
- Cornelio era centurión de lo que se llamaba el Regimiento Italiano. Él y toda su casa eran devotos y temerosos de Dios; daba con generosidad al pueblo y oraba a Dios con regularidad. El Easton's Bible Dictionary (1897) dice que vivir en Cesarea probablemente lo puso en contacto con judíos y con sus expectativas acerca del Mesías, y que él y su familia fueron bautizados.Fuentes: Cornelius · el propio texto bíblico
- Pedro se hospedaba en Jope con Simón el curtidor, un cristiano cuya casa estaba junto al mar. Jope, el principal puerto de Judea, se hallaba en un promontorio arenoso entre Cesarea y Gaza, a unas treinta millas al noroeste de Jerusalén. Una cronología de estos acontecimientos fecha el encuentro de Pedro con Cornelio en el año 38 d. C.Fuentes: Simon the Tanner · Joppa · el propio texto bíblico · Peter meets Cornelius
Notas escritas con ayuda de IA a partir de fuentes abiertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, dominio público) y revisadas antes de publicarse.
Lugares de este capítulo
- Caesarea · Hoy: Caesarea Maritima · 32.500, 34.892 · versículos 1, 24
- Joppa · Hoy: Jaffa · 32.054, 34.753 · versículos 5, 8, 23, 32
- Galilee · 32.760, 35.527 · versículo 37
- Judea · Hoy: Judea 1 · 31.777, 35.234 · versículos 37, 39
- Nazareth · 32.702, 35.298 · versículo 38
- Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículo 39
Solo aparecen lugares identificados con alta confianza (90 % o más según las fuentes académicas reunidas por OpenBible). Mapa de la época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa actual: © colaboradores de OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Créditos y licencia de esta traducción
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fuente: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org